'Ọ nweghị ọgụ di n'etiti ndị uweojii na ndị agha' - Ebonyi

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Loveth Odah kwuru na ya bụ akụkọ na-efeharị na ndị uweojii na ndị agha lụrụ ọgụ n'Ebonyi steeti bụ asị ọcha.
Odah kọwara na ọ bụ otu nwoke na-anya "Keke" onye ndị uweojii nke okporo ụzọ nwụchịrị maka ịda iwu nke ọkụ na-aghazị njem okporoụzọ akpọrọ "Street Light" n'okwu bekee, nwere nghọtahie.
Ọ gara n'ihu kọwaa na ya bụ onye keke anwụchịrị gara kpọọ onye agha ọ ma.
Mgbe ndị agha a biara, ndị uweojii eburula keke ahụ gawa ụlọọrụ ha.
Nke a kpatara ndị agha ahụ na ndị uweojii nọ ọrụ malite ịba mba.
Odah kwuru sị "eziokwu bụ na ndị ọrụ nchekwa na-amakarị aka ọnye ka, mana ọ bụ nanị mba ka ndị nchekwa abụọ a bara".
Kama o kwukwara na otu onyeisi ndị uweojii kwusiri mgbe ọ na-agafe were hụ esemokwu a ma rituo, kpee udo.
Odah kọwara na ọ bụ ebe ihe a nọrọ mee ka ha nọkwa kpezie ya.
BBC Igbo kpọtụụrụ onye na-ekwuchitere ndị agha Naijirịa bụ Sagir Musa, kama ọzaghị ekwe ntị ya.









