Amnesty International: Ndịagha, ndịọrụ mkpọrọ na-emetọ ụmụnwaanyị na ụmụaka n'ụlọmkpọrọ Naijiria

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka ikike dịrị onye na mba ụwa bụ Amnesty International etiela mkpụ maka mmetọ a na-emetọ ụmụaka na ụmụnwaanyị nọ n'ụlọmkpọrọ.
N'ozi ọhụrụ ha wepụtara ụbọchị Monde na websaitị ha, Amnesty na-agbado ụkwụ na nchọpụta ha mere na ụlọmkpọrọ dị na Maiduguri, isiobodo Borno steeti nke gosiri na a na-emetọọ ọtụtụ ụmụaka nakwa ụmụnwaanyị.
Ha boro ebubo na ndị ọrụ ụlọmkpọrọ nakwa ndị a tụnyere na mkpọrọ na-emetọ ụmụaka bụ ndị etinyekọtara ha na ndị okenye ọnụ.
Amnesty na-ekwu na ngụkọ ha nwetara sitere n'akwụkwọ si n'ụlọikpe na-egosi na opekata mpe ụmụaka dị 68 bụ ndị e jichiri n'ụlọmkpọrọ dị na Maiduguri n'ụzọ megidere iwu.
Amnesty na-ekwu na ụmụaka ndị a bụ ndị a akpochiburu na Giwa Barrack tupu a tụnye ha nụlọmkpoọro n'agbata afọ 2016 na 2017.
N'aka nke ọzọ, Amnesty International na-ebo ebubo na ndịagha Naijiria wakporo ụmụnwaanyị ndị a kpochiri na Giwa Barrack.

Ebe foto si, AFP
Ha kọwara na ụmụnwaanyị atọ a nwụchiburu n'ebe ahụ gbara ha ama ma rụọ ndịagha ụmụnwoke iri aka n'ebubo ahụ.
Ise n'ime ndị ụmụnwaanyị ahụ rụrụ aka n'ebubo bụ ndị na-arụ n'ụlọọgwụ dị na mkpọrọ ahụ dị na Giwa Barracks.
Onyeisi Amnesty International na Naijiria bụ Osai Ojigho kwuru na ebubo ọhụrụ ndị a bụ ihe na-emebu n'ụlọmkpọrọ Naijiria
Ojigho kpọrọ oku ka onyeisi Ala Muhammadu Buhari lebanye anya na nsogbu a.
"Gọọmenti Naijiria kwesịrị ịgba mbọ kpọpụta ụmụaka niile nọ na mkpọrọ na Maiduguri kpọga ha ebe e mebere maka ụmụaka ma tọhapụ ndị enweghị ihe doro anya ha mere."









