Titilope Arotile: Lee ihe ndị ị maghị maka nwaanyị mbụ ọkwọ ụgbọelu agha a nwụrụ anwụ

Tolulope Arotile

Ebe foto si, Nigerian Air Force HQ Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nwaada Tolulope Arotile anwụọla dịka ọ merụru ahụ n'isi na mberede okporoụzọ n'ọgige ndị agha ụgboelu nke dị na Kaduna.

Onyeisi ndị agha elu bụ Sadique Abubakar kwuru na ọnwụ Arotile bụ 'ihe ukwu funarịrị ndị agha elu' dịka ọ na-akwanyere ya ugwu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

O kwukwara na ọ bụ onye nwere ugwu na uchu na amamihe nke ndị ibe ya na-eṅomi ebe ọbụla ha rụkọrọ ọrụ.

Arotile bụ nwaanyị mbụ na-anya ụgbo elu Helicopter eji alụ agha na Naijirịa kemgbe afọ iri ise na isii amalitere ndị aghaelu Naịjirịa.

Ọ bụ n'afọ 2017 ka anabatara ya dịka onyeagha ụgboelu na Naijirịa ebe ọ nọ alụso ndị omekome agha ugboro ole na ole na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Tolulope Arotile

Ebe foto si, Nigerian Air Force HQ

Lee ihe iri ndị ọzọ ịmaghị maka Tolulope Arotile

  • O toro na Kaduna ebe ọ malitere njem ọmụmụ ya isonye na ngalaba ndị aghaelu Naịjirịa
  • Ọ ka mechapụrụ ọzụzụ puruiche na Starlite International Training Academy dị na mba South Africa ebe ọ bụ ọkaibe
  • O si na mahadum ndị aghaelu Naijiria gụchaa ebe ọ pụtara dịka ọkaibe n'etiti ndị ya na ya gụkorọ n'afọ 2017
  • O turu ugo dịka nwaanyị mbụ na-akwọ ụgbọelu ndị aghaelu Naịjirịa n'ọnwa Seputemba nke 2017
  • NAF kwuru na nwada a nyere nnukwu aka na mbọ a na-agba ịhụ na e meminara ndị Bokoharam na ndị omekaome na mpaghara ugwu n'okpuru atụmaatụ a kpọrọ GAMA AIKI na Minna, Niger State.
  • Ọ nụghị di tupu ọnwụ ya n'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Julai
  • O nwụrụ ka ọ dị afọ iri abụọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ nwaagbọghọ a

Musa Muhammad bụ ọyị Tolulope kwuru na ọnwụ ya dị nwute makana o chere na o nwere ezigbo ọdịnihu na ngalaba aghaelu Naịjirịa.

O kwuru na ya na Arotile gụkọrọ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Kaduna, tupu ha gawazie ị gụ ihe ọzọ masiri ha na mahadum mana ha ka na-akparịta ụka ruo oge ọ nwụrụ.

Tolulope Arotile

Ebe foto si, Nigerian Air Force Twitter

N'okwu ya, "nkata ikpeazụ anyị kpara bụ mgbe m dere maka ọrịa covid na-akpa mkpa mkpa nke Arotile zaghachiri m ihe o chere maka ya."

Oyi ya ọzọ na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na Arotile ejighị chukwu egwu egwu ma bụrụ ọkaibe n'ihe niile o metụrụ aka.

O kwuru na ọ bụ onye ma Arotile ji ụgbọala ala azụ ka o kene ya mgbe ọ na-aga n'ụzọ dị n'ogige ndị aghaelu Naịjirịa, kwọpịara ya na-amaghị ama.

Ihe ndị nọ na soshal midia na-ekwu

@abrahamjimi1 kwara akwa arịrị maka etu Arotile si nwụọ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@massivemadam kwuru na ụmụ Naịjirịa agaghị echezọ nwada a echezọ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: