Fahim Saleh: Ihe ndị uweojii kwuru maka ọnwụ onye nwe Gokada

Ebe foto si, @Fahims/Instagram
Akụkọ na-ekwu na Fahim Saleh bụ onye malitere ụlọọrụ 'Gokada' bụ ọgbatumtum na-ebugharị ndị mmadụ na ngwa ahịa na Naịjirịa anwụọla.
Ozi a nke na-ewu ebe niile kọwara na ndị uweojii obodo New York chọpụtara ozu nwoke a mgbe nwanne ya nwaanyị chọrọ ya gawa n'ụlọ ya were hụ ozu ya.
A hụrụ ebe ebepụrụ ya isi na aka nakwa ụkwụ nakwa na mma latrịk eji bọkasịa ya ka dị na be ya ebe a chọtara ya.
Mana ndị uweojii NYPD gwara BBC n'ozi email na ha zara oku gbatagbata n'ehihie ụbọchị Tuzde ebe ha chọtara nwoke nwụrụ anwụ.
Lee ozi ndị Gokda dere n'akara Twitter maka ọnwụ Fahim Saleh:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ha kwukwara na ndị ọrụ ahụike bịara ebe ahụ ma kwuo na nwoke ahụ nwụrụ n'ezie.
"Onyeisi ọrụ ahụike na-enyocha ya ahụ ịchọopụta ihe gburu ya mana nyocha nke ndị uweojii na-aga ihu" ka ozi ahụ kwuru.
Ha akpọpụtabeghị aha onye ahụ nwụrụ anwụ ganye mgbe a ga-ezi ezinaụlọ ya ọfụma.
Ihe anyị ma maka Fahim Saleh

Ebe foto si, @Fahims/Instagram
Fahim Saleh bụ oji ego achụ ego nke bekee kpọrọ 'Venture Capitalist' gbapere Gokada na-ebu mmadụ na ngwa ọrụ na Naịjirịa nakwa Indoneshia.
Cheta na gọọmentị Legọs steeti machiri ụlọọrụ ya na nke ndị ọzọ n'ọnbwa Febụwarị n'afọ a. Lee ihe o kwuru mgbe nke ahụ mere:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
A mụrụ ya na mba Saudi Arabia mana ezinaụlọ ya mechara kwara gaa na mba Amerịka ebe ha ka bi rue ugbua.
Ọ gụrụ akwụkwọ na Bentley University dị na Massachussets na mba Amerịka.
O nwere ụmụ nwanne nwaanyị abụọ bụ Rif Saleh na Ruby Bashir.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post









