Life Expectancy: Gịnị mere ọtụtụ ndị Naịjirịa ji anwụ ọnwụ erughi eru?

Ndị Naịjirịa

N'akwụkwọ ọnụ ọgụgụ mmadụ nke afọ 2019, nke United Nation wepụtara kwuru na obibi ndụ ndị Naịjirịa ugbua akpọrọ Life Expectancy na bekee nọ zi na afọ iri ise na ise.

Naịjirịa bụ ndị atọ kachasị ala n'ụwa, nke mere ha ji kara naanị mba Sierra Leone, Chad na Central African Republic.

Ajụjụ a bụrụ "Gịnị mere ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị ebi ogologo ndụ dịka o kwesiri?"

Mana onye dọkịnta na ngalaba ahụike na ebe obibi aha ya bụ U. David Udo-Umo kọwara BBC Igbo ụfọdụ ihe mere ndị Naịjirịa ji anwụ ọnwụ n'erughi eru.

O kwuru na ihe na akpata ọnwụ erughi eru na Naịjirịa bụ ụdị ndụ ndị mmadụ na-ebi, nke gụnyere:

Dr. David Udo-Umo

Ebe foto si, Dr. David Udo-Umo

Oke nchegbu na ndọga

Dọkịnta David Udo-Umo kwuru na nchegbu na ndọga na-arị ibe ya elu na Naịjirịa ugbua nke si n'akụkụ ọrụ, ezinaụlọ, enweghi ego ga-ezuru mmadụ igbo mkpa dịrị ya.

O kwuru na nchegbu na ndọga ndị a nwereike ibute ọbara mgbali elu bụ nke nwereike ibute ọnwụ erughi eru.

Udịrị nri ndịmmadụ na-eri

Nri ụtọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nrị ọnụụtọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-erizi ugbua karịsịa ụmụnwaanyị

Dọkịnta David gara n'ihu kọwaa na ụfọdụ nrị ndị mmadụ na-eri so na ihe na-ebute ọnwụ erughi eru na Najirịa.

O kwuru na ụfọdụ nri ndị a gụnyere nnu na-esighi n'ọkụ, nri ndị eghere eghe nakwa ịṅụ oke mmanya na-aba n'anya na-ebute oke ọbara mgbali elu.

David kwuru na ndị mmadụ kwesiri ị na-eri ezigbo nri nwere akụrụngwa niile ahụ mmadụ chọrọ.

Enweghi nlekọta ahụike

Onye nọ n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Dọkịnta kwuru na ọtụtụ ndị Naịjrịa anaghị a ga ụlọọgwụ ime nyocha banyere ahụike ha dịka ọbara mgbalị, imeju ahụ, mmiri dị n'ahụ, akụrụ ahụ nakwa ihe ndị ọzọ.

O kwuru na ndị mmadụ kwesiri ị ma ọnụ ọgụgụ ahụike ha n'oge niile na nke nyere ha aka ị nọ n'ahụike mgbe ọbụla.

Enweghi ezigbo mgbatị ahụ na ezumike

Mgbatị ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Onye dọkịnta kwuru na ndị mmadụ anaghị ewepụta oge mee mgbatị ahụ bụ 'exercise' na bekee ma ọ bụ kwanụ zuo ezigbote ike.

Na nke a so na ihe mere ọtụtụ ndị mmadụ ji ada ma nwụọ n'ike n'oge ha erughi eru.

O kwuru na mmadụ ime mgbatị ahụ nakwa izuike etu onwereike ga-enyeaka kwalite ọnọdụ ahụike onye ahụ n'ụzọ pụrụiche.

Akara ntụ-ntụ

Kedụ ihe bụ ụzọ mgbapụta

  • N'iji betala oke ọnwụ na-erughi eru dị n'ala Naịjirịa ugbua dọkịnta U. David Udo-umo rụtụrụ aka n'ihe ndị dị iche iche.
  • O kwuru na gọọmentị kwesiri iwulite ọnọdụ obibi ndụ ndị mmadụ site n'iwepụta ọtụtụ ihe eji ebi ndụ dịka ọkụ latrik, mmiri na okporoụzọ.
  • David kwuru na ndị mmadụ kwesiri ị na-eri ezigbo nri nwere akụrụngwa niile ahụ mmadụ chọrọ.
  • Ọ gara n'ihu kwuo na ndị mmadụ kwesiri ị na-eme nyocha ahụike ha kwa mgbe.
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: