Mgbatị ahụ na-achụ ọrịa ọsọ ụkwụ eru ala
Ndị na-eme egwuregwu n'ọgbọ Okpara Square dị n'Enugwu akọwala etu mkpatị ahụ ji enyere ha aka n'ịgwọ ọrịa dị icheiche.
BBC Igbo mere njem ebe ahụ ị maara etu ihe ji aga ma gbaa ụfọdụ ha ajụjụ ọnụ.
Onye mgbasa ozi otu akpọrọ Coal City Fitness Exclusive bụ Nwamazi Obiora Okereke kwuru na ọ ruela ọtụtụ afọ ha maltere egwurewgu a ebe a.
Onye ọzọ bụ Lolo Kate Ezenagu kwuru na ọrịa ka zi nkụ ugbu a, na ọ bụ site na mgbatị ahụ a ka oji achụ ọrịa ndị a ọsọ.

