Bukola Saraki: Gọọmentị Kwara akụtuola ụlọ Saraki
PDP akatọọla Gọọmentị Kwara maka ikụtu ụlọ Saraki

Otu PDP akatọọla nkwatu gọọmentị Kwara steeti kwaturu ụlọ Sinetọ Bukola Sarakị, si na ọ bụ mkpagbu otu ndọrọndọrọchịchị ndị anọghị na gọomentị.
Gọọmentị Kwara Steeti kụturu ụlọ Saraki n'isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde, bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020.
N'ozi PDP wepụtara nke odeakwụkwọ mgbasa ozi ha bụ Kola Ologbodiyan binyere aka, pati ahụ kwuru na ọ bụ "akpọmasị nakwa enweghị obi ịnabata ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ" mere ọchịchị APC na steeti ahụ ji kpaa ụdịrị agwa ahụ.
Gọọmentị Kwara kụturu ụlọ Saraki

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nọ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ọ bụ n'elekere anọ nke ụtụtụ ka ụgbọala katapila gara pịatuo ụlọ ahụ.
Ọ bụ nna Bukola Saraki bụ Olusola Saraki nwe ụlọ ahụ wee nyefee ya nwa ya.

Ebe foto si, Twitter/RealAARahman
Mana gọvanọ Kwara Steeti bụ Abdulrahman Abdulrazaq, kwuru na gọọmentị ewegharala ala ahụ.
O kwuru na gọọmentị ga-arụ ụlọọrụ maka ndị ọrụ steeti n'ebe ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'aka nke ya, Saraki kwuru na ya bụ ihe bụ mmegbu nke gọọmentị na-emegbu ya na ezinaụlọ ya.
O kwuru na ya ga-aga ụlọikpe ịga gbaghaa ya bụ ihe.
Saraki mechara kelee ndị mmadụ gosiri ya nkwado dịka akụkọ ihe mere wusara ebe nile.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọdọụgbọelu Akanu Ibiam ga-emepe tupu a gbaa Ista - Gọọmentị Etiti

Ebe foto si, EnuguGovNewsUpdate/Facebook
Minista na-ahu maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwela nkwa ma kwubie na ọdọụgbọelu nke Akanu Ibiam dị na Enugwu steeti ga-ebido ọrụ tụpụ emee emume Ista nke afọ a.
Sirika kwuru nke a mgbe ọ gara ngagharị ile otu ọrụ si aga n'ọdọ ụgbọelu ahu ma kwuo na obi dị ya mma etu ọrụ si aga.

Ebe foto si, EnuguGovNewsUpdate/Facebook
Osote onyeisi Gọvanọ Enugwu steeti bụ Oriaku Cecelia Ezilo kọwara maka mkpa ọdọụgboelu a dịịrị ndị Igbo ma kwuo kwa na Gọomentị Enugwu Steeti dị Njikere ịhụ na-arụchara ya.
N'otu aka ahụ ka omeiwu Nnoli NNaji kwukwara na ụloọmeiwu emezuola ihe niile ha kwesiri ime iji hụ na ya arụchara ọrụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam.
Ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020 Ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020

Ebe foto si, Instagram/FDC
Onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnụba bụ Bismack Rewane agbaala ama n'ụkọ ego ga-adị n'afọ 2020.
Rewane, onye nwe ụlọọrụ 'Financial Derivatives' kwuru nke a n'ọgbakọ ụtụtụ nke Lagos Business School mere na nsonso a.
Ọ sịrị na ihe ga-akpata ụkọ ego bụ mbuli ego ụtụisi VAT site na pasent ise rue pasent asaa na ọkara, mbuli ego ọkụ latrik nakwa iweghachi 'toll gate'.
O kwuru na nzọpụkwụ ndị a ga-ebute oke ọnụahịa.
Mana Rewane gara n'ihu kwuo na ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ ga-eme ka ndị ọrụ kụrụtụ ume ndụ.
Ihe NBA gwara Buhari maka afọ ọhụrụ

Ebe foto si, Twitter/PaulUsoroSAN
Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naịjirịa bụ 'Nigeria Bar Association' adọọla aka na ntị ka ihe bere n'afọ 2019 ghara ibekwa na 2020.
N'ozi afọ ọhụrụ ya, onyeisi otu ahụ bụ Paul Usoro gwara gọọmentị ka ha sepụ aka n'inupu isi na iwu obodo nakwa mkpebi ụlọikpe bụ nke e ji mara ha n'afọ gara aga.
O kwuru sị: "N'afọ 2019, ndị ọchịchị leghara iwu Naịjirịa anya ugboro ugboro n'ihi nnupu isi na ọchịchị aka ike ha."
"Ọ bụ na 2019 ka e wepụrụ ọtụtụ ndị n'ọrụ na-esoghị ụzọ iwu kwuru."
"Onye nke mbụ bu Okaikpe Walter Onnoghen e wepụrụ na mbido afọ 2019. Onye nke abụọ bụ onyeisi ụlọọrụ 'Corporate Affairs Commission' bụ Azuka Azinge."
Usoro gbarụkwara ihu maka etu ndị uweojii nzuzo bụ DSS si wakpo ụlọikpe dị n'Abuja wee nwụchie Omoyele Sowore bụ ụlọikpe ahụ nyere iwu ka a tọhapụ ya.
O kwuru na mmechi na "anyị na-atụ anya na gọọmentị ga-aga n'ihu irube isi na mkpebi ụlọikpe niile dị na Naịjirịa."
Maka ndị Naịjirịa bi n'ofesi

Ebe foto si, Twitter/@nidcom_gov
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi mba ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa ekwuola na Ụlọomeiwu Naịjirịa kwesịrị ileba anya etu a ga-esi mee ka ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi na-esonye na ntuliaka.
Dabiri-Erewa kọwara na nke a bụ n'ihi na ndị bi mba ofesi na-enyere akụnụba Naịjirịa aka nke ukwu.
O kwuru na gọọmentị etiti ga-agba ịhụ na nke a mezuru.
Ọkụ na-agba n'Ọstrelịa

Ebe foto si, REUTERS
A dọọla ndị gara njem nlere anya na mpaghara ụfọdị na mba Ọstralịa ka ha kwara ngwongwo ha laa n'ihi ọkụ ọgbụgba na-agbasa n'ike n'ike.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na asatọ anwụọla na ya bụ ọkụ ọgbụgba ebe ihe karịrị otu puku ụlọ na narị abụọ alaala n'iyi.
Okụ a bidoro ịgba n'ọhịa dị icheiche kamgbe ọnwa Septemba afọ 2019.
Nke mere na Kenya na Sudan
Mmadụ iri atọ anwụola dịka ọgbaaghara dapụtara n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ n'obodo Dafur dị na mba Sudan .
Nke a na-eme dịka ndị Al shabbab gburu mmadụ atọ n'ime ụgbọala ha ji eme njem n'obodo Lamu nke dị na mba Kenya.
Arsenal emeriela Man Utd

Ebe foto si, Reuters
Ọbịbịa Mikel Arteta dịka onye nkuzi ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal amalitela ịmịta mkpụrụ.
Arsenal ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie Manchester United n'abalị Wenezde.
Nke a bụ mmeri mbụ Arteta na-enweta kamgbe ọ malitere ọrụ n'Arsenal.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









