Onnoghen: Ngalaba UN akatọọla ọrụ a chụrụ ya n'ike

Walter Onnoghen

Ebe foto si, @Crevo360_Ng

Nkọwa foto, Justice Walter Onnoghen
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọgbakọ mba ụwa niile nke akpọrọ UN akatọọla ọrụ akwụsiri ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Walter Onnoghen n'ike.

UN kwụsịke na-ekwu na ọchụchụ ya dara iwu metụtara nchekwa oke ruru mmadụ.

Ebe onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na o mere ihe o mere site n'iwu otu ụlọikpe na-ahụ maka omume kwụọtọ nyere, UN na-ekwu na ụlọikpe anọ ka nke ahụ enyela iwu ka a tụgharịa ikpe ịchụ

Onnoghen.

Ndị ndọrọndọrọ na Naịjirịa katọkwara nke a maka na n'uche ha, ọ bụ okwu ndọrọndọrọ butere ọchụchụ Onnoghen.

Cheta na mba Amerịka, mba Briten nakwa ọgbakọ mba EU tinyere ọnụ n'okwu a mgbe a chụrụ Onnoghen n'ọrụ.

Ihe i kwesịrị ịma maka Taiwo Ogunjobi lara mmụọ

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

  • A mụrụ ya na Ọgọst 17, 1953
  • Ọ gbara afọ 65
  • Ọ gbaara otu egwu bọọlụ Shooting Stars nakwa nke Naijiria bọọlụ
  • Ọ bụụrụ nnukwu odeakwụkwọ otu nhazi egwuregwu Naijiria a kpọrọ, Nigeria Football Association
  • Tupuu ọnwụ ya, ọ bụụrụ onyeisi nhazi egwuregwu bọọlụ nke steeti Osun.
  • Ọ nwụrụ dịka ọ rịachara obere ọrịa.

Na ndọrọndọrọ

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-akọwa na ọgbagahara dara n'ọgbọ ebe onyeisiala Muhammadu Buhari na-eme achụmnta vootu ya n'Ogun steeti taa.

Nsogbu bidoro oge ndị nọ ebe ahụ malitere kwawa Adams Oshiomhole emo ma na-ama ya iche mgbe Oshiomhole kpọrọ aha onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha pati ha.

Na mba ofesi,

Ụlọikpe mba Ijipt

Ebe foto si, Getty Images

Na mba Ofesi otu ụlọikpe na mba Ijipt amaala ndị uweojii atọ ikpe maka etu ha si jiri mmegbu gbuo otu nwoke e chere na ọ dara iwu.

Ụlọikpe ahụ kwuru na ha ga-aga ụlọmkpọrọ afọ atọ.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị