Humphrey Nwosu: Agaghị m abịanwu emume ncheta Juun 12

MKO Abiola

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, MKO Abiola meriri ntuliaka afọ 1993 mana gọọmentị ndị agha kagburu ya.

Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka afọ 1993 nke họpụtara MKO Abiola dịka onyeisiala, kwuru na ọ gaghị azanwu oku gọọmentị kpọrọ ya maka ikwanyere Abiola na ndị ọzọ ugwu.

Nwosu kelere gọọmentị maka nkwanye ugwu a, ma kwuo na ya agaghị abịanwu emume nke e hibere maka ya taa, maka na ọ nọ na mba ofesi.

Gọọmenti kpọrọ Nwosu na ndị ọzọ hụrụ maka ntuliaka ahụ oku maka emume ịkwanyere MKO Abiola, Babagana Kingibe na Gani Fawehinmi ugwu taa.

Nwosu kwara arịrị na ọ gaghị azanwu oku ahụ maka na ọ nọghị na Naịjirịa ugbu a.

Ọ gara n'ihu kele gọọmentị maka ime ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya.

Nke a dị n'akụkwọ ozi o degara onyeisi ụlọọrụ gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha ụnyaahụ.

"N'ezie a maara m na emume ụbọchị taa ga-eweta ohere maka nghazigharị obodo n'ụzọ dị mma."

"Mana site n'ihe ndapụta karịrị ike m, agaghị m anọ n'emume nke taa, maka na-anọ m na mba ofesi" Nwosu kwuru.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ