Humphrey Nwosu: Agaghị m abịanwu emume ncheta Juun 12

Ebe foto si, AFP
Humphrey Nwosu bụ onye haziri ntuliaka afọ 1993 nke họpụtara MKO Abiola dịka onyeisiala, kwuru na ọ gaghị azanwu oku gọọmentị kpọrọ ya maka ikwanyere Abiola na ndị ọzọ ugwu.
Nwosu kelere gọọmentị maka nkwanye ugwu a, ma kwuo na ya agaghị abịanwu emume nke e hibere maka ya taa, maka na ọ nọ na mba ofesi.
Gọọmenti kpọrọ Nwosu na ndị ọzọ hụrụ maka ntuliaka ahụ oku maka emume ịkwanyere MKO Abiola, Babagana Kingibe na Gani Fawehinmi ugwu taa.
Nwosu kwara arịrị na ọ gaghị azanwu oku ahụ maka na ọ nọghị na Naịjirịa ugbu a.
Ọ gara n'ihu kele gọọmentị maka ime ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya.
Nke a dị n'akụkwọ ozi o degara onyeisi ụlọọrụ gọọmenti etiti bụ Boss Mustapha ụnyaahụ.
"N'ezie a maara m na emume ụbọchị taa ga-eweta ohere maka nghazigharị obodo n'ụzọ dị mma."
"Mana site n'ihe ndapụta karịrị ike m, agaghị m anọ n'emume nke taa, maka na-anọ m na mba ofesi" Nwosu kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










