Muhammadu Buhari in Lagos: "Biafra nwereike ịbụ ntụpọ na Naịjirịa taa mana echi ọ ga-eso n'otu mbaụwa" - Nnamdi Kanu

Muhammadu Buhari na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, NGRPresidency/Getty

Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) assala Onyeisiala Buhari n'okwu ọ gwara ha.

Nnamdi Kanu gwara Buhari sị na ọ bụ eziokwu na Biafra nwereike ịbụ ntụpọ na Naịjirịa taa mana echi ọ ga-eso n'ime otu mbaụwa.

O kwuru nke a site n'ozi o wepụtara nke ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful tinyere aka na ya.

Cheta na Buhari mgbe ọ na-aza ajụjụ n'Arise TV n'ụbọchị Wenezde sị na Ipob dịka ntụpọ n'etiti okirikiri na ọ ga-eji ndịagha na ndị uweojii chụọ ha ọsọ.

Ohaneze asaala Buhari: Họrọ nke ị chọrọ n'etiti mkparịtaụka maọbụ ibuso Igbo agha

George Obiozor,Buhari

Ebe foto si, George Obiozor,Buhari

Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na ọ dị Onyesisiala Muhammadu Buhari n'aka ịhọrọ n'etiti mkparịtaụka maọbụ ịdọnye Naijiria n'agha iji napụta Naijiria nsogbu ndị oji egbe eme mpụ, ntọ, ndị ọchịehi, enweghị ọrụ na ndakọ akụnaụba.

Okwu a na-eso ihe Buhari kwuru mgbe ọ na-aza ajụjụ n'Arise TV n'ụbọchị Wenezde ebe ọ sị na ya ga-eji ndị agha na ndị uweojii chụọ ndị Ipob na-eti mkpu nwereonwe ọsọ.

Buhari gwara ha chetakwa na ndị Igbo nọ na mpaghara dị iche iche na Naijiria na-azụ ahịa, na-erụ ụlọ.

Mana otu Ohaneze n'ozi ha wepụtara ụbọchị Tuzde iji saa buhari nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ Alex Ogbonna ya binyere aka, ha kwuru na ha kwenyere na mkpu nwereonwe ndị ntorobia na-eti bụ maka mmegbu.

Aha onyonyo, George Obiozor: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị

Ha kwuru na ha adọọla onyeisiala Buhari aka na ntị maka etu o siri na-emenyere naanị ndị Fulani, ma gbakụta ndị agbụrụ ndị ọzọ azụ ọ kachasị dịka o siri metụta ọkwa ndị isi ngalaba ndị ọrụ nchekwa ala Naijiria.

"Onyeisiala Buhari nwere ohere ịhọrọ mkaprịtaụka n'otu aka na agha ya na ndị Igbo n'aka nke ọzọ."

"Na agbanyeghị mkpachapụ ndị Igbo, anyị dị nkwadobe maka iji usoro ịkpa ụka na udo nweta naijria ahazigharịrị ahazị na mpaghara na mpaghara, nke onye ọbụla na-enweta oke ruru onye na-enweghị mmegbu ọbụla."

Anyị ga-eji ndị agha na ndị uweojii chụọ ndị otu Ipob ọsọ - Buhari

Muhammadu

Ebe foto si, Bashir Ahmed

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ya ga-eji aka ike so otu ndị na-eti mkpu maka nnwereonwe Biafrra bụ Ipob na'ịchafụ..

Buhari kwuru nke a doge ya na ndị ụlọ ntaakụkọ Arise TV enwere mkparịtaụka ụbọchị Tọzde ebe ha jụrụ ya ajụju maka ihe ndị gbasara Naijirịa.

Ọ bụ na ya bụ mkparịtaụka ka Buhari kwuru na ihe kacha ewute ya bụ na Ọdịda Anyanwụ Ugwu Awụsa ebe ụmụnne omenala jịkọrọ na-egburita onwe ha.

Lee ihe asatọ gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:

Muhammadu Buhari kwuru sị, "Enyela m ndị agha na ndị uweojii ikike, n'ime izuụka ole na ole na-abịa ka ha were ike na ntachi obi gosi ndị a ihe ọkụ ji ntị oke eme".

O kwuru nke a dịka o gosipụtara iwe ya maka mwakpo na ọgbaghara na-arị ibe ya elu na mpahara Ugwu Naijirịa.

Buharị kwuru na ịchụpụ ndị mmadụ n'ọrụ ubi ha, na agụụ ka adị n'obodo ma sịkwa na mgbe agụụ dị n'obodo na gọọmentị ga-anọ na nsogbu.

O kwuru sị, "Gọọmentị achọghị nsogbu ọzọ, anyị adọọla ha aka na ntị. Ị ga-ahụta ihe dị iche n'ime izuụka ole na-abịa."

Ebubo na Muhammadu Buhari na-ele anya n'agbụrụ ahọpụta ndị ọrụ dịka onyeisi ndị agha:

Ọ zara ha sị, "Ọ bụ onye tozuru etozu ka a na-enye ọrụ onyeisi, ọ bụghị na mmadụ gbakọtara n'ọrụ mere a ga-eji eme ya onyeisi.

Buhari kwuru sị, "Ị ma ebe onyeisi ndị agha Naijirịa na-arubu ọrụ na mbụ?

Ọ bụghị onye ọbụla ka ị ga-ahọrọ, ị ga-achọ onye ndị agha ma nke ọma, onye ya na ha sorola taa ahụhụ dịka ndị agha".

Okwu IPOB

Ndị ntorobia na-eti mkpu ka e nye ha Biafra

Ebe foto si, Getty Images

N'okwu ndị na-achọ Biafra, o kwuru sị, "anyị ga-akpaso ha agwa n'ụzọ ha ga-ahọta, enyela m ndị agha na ndị uweojii ikike ha ha chụwa ha niile".

Maka mwakpo n'ọdịda anyanwụ Ugwu Naijirịa

Maka nke a, ọ zara sị," Anyị agbanweela ndị isi nchekwa, anyị na ndị ọhụrụ a enweela nzụkọ maka ọnọdụ nchekwa".

O kwuru na gọọmentị akwụsịla ịgwuputa akụ ọnatarachi na Zamfara steeti ma sị na ha mere nke a n'agbanyeghị na gọvanọ steeti ahụ abụghị onye pati ha.

O kwukwara na ha na-ememila ọtụtụ ndị omekome na-enye nosgbu na mpaghara ahụ kama ndị anaghị ekwu ka ndị ha chọrọ ịkpọbata n'otu ha hapụ ịgba ọsọ.

Maka okwu ndị uweojii steeti

Onyeisiala kwuru sị na o dighi mma ka oge obula a na-ekpesara ochichi etịtị ihe nille, na ọ ka mma ka ndị gọvanọ, ndị isi ozo na-eso ha nakwa ndị uweojii nọ ha nso choputa etu kacha mma ha ga-ejị chekwaa ma hụ na udo dị na mba ha.

Maka nsogbu chịgharị ehi

onye ọchịehị na ehi ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye ọchịehị na ehi ya.

O kwuru sị na a ga-eweghachịta akwụkwọ gọọmentị nke 'First Republic' ebe a hoputara maka izu atụrụ n'ala Naijiria dika etu o dibu na mbu.

Buharị kwuru sị, "anyị were atụmatụ dị n'akwụkwọ a, nsogbu agaghị adị n'etiti ndị ọchi ehi na ndị ọrụ ugbo".

Ọ kwukwara na ihe so ebute ọgbaghara bụ ndị sitere mba ozo na-achiri atụrụ na ehi ha bata n'obodo Naijiria, ma sị na ezigbo ndị Fulani Naijirịa anaghị ebu egbe na ọ bụ ndị nke si mba Mauritania na ndị ọzọ na-ebu egbe agagharị.

Onyeisiala Buharị kwuru nke a maka ebubo ọ sịri na gọvanọ Benue steeti na-ebo ya na ọ naghị ata ndị Fulani na-awakpo ndị mmadụ ahụhụ.

Maka mmachi Twitter

Ọba ozi twitter

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala ekweghi ekwu okwu ọbụla maka nkagbu mmachi Twitter, o kwuru na o gaghi etinye onu n'okwu a maọli.

Maka ịrụ okporoụzọ nakwa okporo ụgbọlogo gawa mba Nijee

O kwuru na ndị mba Nijee bụ ndị agbataobi kacha dị Naijiria nso, "na mmekọrịta anyi na ha kwesiri ịdị ka nke nwanna na nwanne."

Na ewepu etu mmekọrịta Naịjiria na mba Nijee sịrị di, na ndị ọmekọme 'Boko Haram' gaara iji anyi mme ihe egwuruegwu.

"Odimma Nijee bukwa odimma anyi, o buru na be ha meepee be anyi emepee."

Kedụ ihe ọ chọrọ ka e jiri na-echeta ya ma ọ chịchaa?

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari banyere ọchịchị dịka onyeisiala nkịtị kemgbe afọ 2015

O kwuru na ọ ka nwere aturu na ehi n'obodo ya ma sị na ọ ga-alaghachi be ya zụwakwa atụrụ na ehi ya.

Ọ kọwara na tupu oge ahu eruo na ọ ga-agba mbọ hu na udo na oganihu laghachitere n'obodo Naijiria.

Buhari siri na ọ bụ naani echiche ọma ka ọ na-echere Naijirịa.

Na nchịkọta, o kwuru ka ndị Naijirịa lee anya etu ọnọdụ nchekwa na achụmnta ego dị na Naijirịa tupu ọ bata na etu ọ dị ụgbua.

O kwuru sị, "Ka ndị Naijirịa were eziokwu tulee ọchịchị ya".