Nigeria Democracy Day: Ihe Onyeisiala Muhammadu Buhari siri gọọmentị ga-eme ndị na-awakpo ụlọ ndị uweojii n'ọwụwa anyanwụ

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Screengrab/NTA

Onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buharị na ụlọọrụ NTA nwere mkparịta ụka n'ụbọchị Frịde.

Ọ rụtụ aka maka ọtụtụ ihe na-echere gọọmentị Naijirịa aka mgba.

Lee ka ya bụ mkparịta ụka siri gaa.

Kedụ maka okwu ị kwuru na ị ga-asụrụ ndị omekome asụsu ha ga-aghọta?

Buhari zara sị, " Kedụ etu ị ga-esi gaa ụlọọrụ ndị uweojii, gbuo ndị uweojii, gbaa ya ọkụ ma zuru etgbe ha, Kedụ ihe ndị ahụ bu n'obi?"

Ọ gara n'ihu sị, " Enweghi etu gọọmentị ga-esi gbachị nkịtị."

Mgbe ajụrụ ya na ọ ga-eji ọkụ menyụọ ọkụ, ọ zara sị, "Eee, anyị ga-eme karịa nke ahụ, anyị ga-ejide ha, kpee ha ikpe, gbaa ha n'anwụ ma tụọ ha nga ka ndị mmadụ mara na onye kpara agwa ọjụọ ka erite ụgwọ ọrụ ya".

Aha onyonyo, Eeee awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo anyị ma gbuo inspector Peter - Onye Obodo Ojoto

O kwuru maka Endsars were sị dịka gọvanọ mbu Legọs steeti zụtara ụgbọala ga-enyere ndi Legọs aka kama oge Endsars ndị mmadụ gbara ya ọkụ.

O kwuru sị, " mgbe Gọvanọ na-achị Legos steeti biara gosi m ụgbọala ndị a agbara ọkụ, a gwaram ya ka ndị Legọs were ụkwụ ha na-aga n'ihi na gọọmentị enweghị ego ha ji azụta ụgbọala narị abụọ ọzọ".

Ụfọdụ na-ekwu na ị naghị agwa ndị omekome a na-akpọ Bandit na ndị ntọ nọ na mpaghara ugwu na bekee ụdịri okwu a?

Aha onyonyo, Twitter Ban: Twitter bụ ngwa ọrụ Ipob ji agbasakarị ozi ha - Lai Mohammed

Buhari zara sị, "Ọ bụghị eziokwu, gaa jụọ gọvanọ Sokoto, Zamfara na Kastina etu ndị nchekwa sị anyụ ndị omekome a ịkpakụ, kama Naijirịa buru ibu ma nwee ọtụtụ ọhịa".

Maka ọnọdụ akụnụba

A chọrọ ka ndị Naijirịa cheta etu ihe di tupu ọ abata na etu ihe di ugbu a.

Tupu anyị abata, Naijirịa na-emepụta mmanụ agbidi nde abụọ na otu ụma kama ndị omekome bidoro ịwakpo igwe mmanụ agbidi nke mere ka mmanụ agbidi Naijirịa na-emepụta gbadaa ruo nani iko barrel puku narị ise.

Tupu anyị abata mmanụ agbidi bụ otu narị dola ka a na-ere ya kama ọmechakwara gbadaa.

Ka ndị Naijirịa tule ihe ndị a.

O kwuru sị, " Ekwenyere m na gọọmentị a na-eme nke ọma na-agbanyeghị".

Kedụ ihe na-echere gị aka mgba maka nchekwa mpaghara ọwụwa anyanwụ ugwu?

Onyeisiala Naijirịa kwuru na gọọmentị na-agbalị.

Ọ kọwara na gọọmenti na-azụta ngwa ọgụ kama ọtụtụ oge, ọ na-ewe ogologo oge tupu o rute Naijirịa.

Buharị kwuru sị," ọ bụghị nanị ịzụta ụgbọelu agha, na ụgbọala agha, ị ga-azụta spee pats ya, guziere ya ndị ga-eji ya lụo ọgụ tupu ịzịpu ha ịlu ọgụ. Jụọ ndị agha ịma etu ihe dị na 2015 na etu ihe dị ugba maka ngwa agha na ọzụzụ?".