South East Security: Ihe ndị gọvanọ ala Igbo na ndị agha Naịjirịa bịara mee n'Enugwu bụ ite okwu ude' - CSO

Ken Nnamani

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo, ọkacha ndị otu kwụụru onwe ha Bekee kpọrọ Civil Society Organisation a tapịala isiokwu pụtara n'ọgbakọ ndị isi ọwụwa anyanwụ na ndị isi agha Naịjrịa nwere n'Enugwu ụnyaahụ bụ Sọnde.

Onyeisi ndị 'Human Right Volunteer Corpe' bụ Larry Oguego si na ya bụ ọgbakọ bụ "Ite okwu ude".

Oguego sị na ya bụ ọgbakọ dịka iyi ndị igbo egwu dịka gọomentị etiti dunyere ndị isi agha ha ka ha bịa kpaa udo n'ala Igbo.

Ọ sị "na-ejighị egbe na mma akpa udo. Ọ bụrụ na gọomentị chọrọ ịkpa udo n'ezie na ha kwesiri ịkpọ ndị mmadụ nkịtị ka ha kwuo uche ha gbasara ihe na-eme".

Ọ kpebiri na nke a ha mere abụghị ikpe udo kama ọ bụ ite ya bụ okwu ude.

Ọ kọwakwara na udi ndị agha so Gọvanọ Uzodimma bịa Enugwu dị ka ọ bụ agha ka ana akwado.

Oguego sị na "nke a gosiri na egwu dị n'obodo".

Goddy Uwazuruike, Laary Oguego na Ndị Gọvanọ

Ọ na-arịọ gọomentị etiti ka ha gbaa mbọ kpọọ ọgbakọ ndị ala Igbo ka ha tinye ọnụ n'okwu gbasara ha.

Ọ sị na nke a ha mere bụ nke ndị otu ha, gụnye na ihe ndị Igbo na-ekwu kemgbe ụwa bụ maka ndị uweojii nke steeti, akpọrọ 'state police', ọ bụghị maka ndị nche obodo.

Ọ sị na onye obula na-ekwu maka ndị ọchịchị obodo na-ekwu ihe ndị isi na gọọmentị etiti chọrọ ka ha kwuo.

Aha onyonyo, 'Ihe ndị gọvanọ ala Igbo na ndị agha Naịjirịa bịara mee n'Engwu bụ ite ude'

Nwafọ Igbo ọzọ bụ Goddy Uwazuruike na-ekwu na akụkọ nke ya na "obi adịghị m mma na ya bụ ọgbakọ ha mere".

N'onu ya, "Ihe na-ewuzị n'ala Igbo ugbua bụ ị na-aga n'ụzọ ejide gị tukpuo n'ụgbọala sị na ị bụ onye Ipob". Ihe ndị Igbo na-achọ bụ na ndị a bịara ịzọgbụ ndị mmadụ n'ukwu n'ala Igbo bịa lawa ozugbo ozugb".

Ihe Ken Nnamani sọ na ya bụ ọgbakọ zara

Onye si na ya bụ ọgbakọ bụ Ken Nnamani bụ onye bụbu Onyeisi ụlọ omeiwu Sinetị site n'afọ 2005 ruo afọ 2007 sị na ya bụ ọgbakọ bụ ka ebelata aka na otu esi egb mmadụ n'ala Igbo.

Nnamani sị na ọ ka mma ịkpupu ndị a na-enyo enyo ụlọikpe karịa igbu ha.

O kwukwara na-ekwesiri ijide ndị ọchịehi na-ebu egbe agagharị ma maa ha ikpe dịka iwu kwesiri.

BBC Jụrụ ya ka ọ bụ na Onyeisiala amaghị na a na-emegbu ndị Igbo dịka ha na-eti na mkpu kemgbe.

Aha onyonyo, 'Anyị na onyeisiala ga-enwe ọgbakọ ọzọ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Juunu' Ken Nnamani

Nnamani zara na ọ bụrụladị na onyeisiala amaghị ihe ndị a, na ha na ha nwere ọgbakọ ọzọ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Jụụn bụ be ha ga-anọ kọwatara ya ihe niile bụ iwe ndị Igbo.

Ọ sị, "na ya bụ ọgbakọ ka anyị ga-edepụtara ya ihe niile anyị kpọrọ mmegbu ndị Igbo na-eti mkpu ya ebe ọ ga-edo ya anya".

Ọ sị na ọbụghị eziokwu na ọ bụ naanị ndị agha si Abuja bịa ya bụ ọgbakọ na-ekwukwa na ndị nkịtị nọkwa na ya.

Ọ sị maka ọrụ nchekwa n'ala Igbo na ihe ga-enyeaka bụ ịgba ama sita naka ndị mmadụ na-ọbụghị ikpote ndị agha ka ga na-abịa eyi ndị mmadụ egwu.

O kwukwere na ya na onwe ya kwusiri ike na ndị uweojii nke steeti na ọ bụghị ndị nche obodo.

Gbasara ebubo na ana akpụrụ ụmụ ntorobia Igbo na-egbu, Nnamani sị na ya ga-enyi ya ọnụ na ya bụ ọgbakọ ha ga-agba n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Juuna.

Nnamani siri na ha kwuru na ọgbakọ a nke gara aga na "'restructuring' ụzọ aga esi mee ka nsogbu a dị na Naịjirịa belata". Ọ sị na o buru na ahazigharịa Naijiria na ọ ga-enyeaka ndị ọbụla ị na-agbara onwe ha mbọ".

Ọ ji ohere a rịọ ndị Igbo ka ha nwee ndidi ma kwere na otu Naịjirịa maka ọ ga-akara ndị Igbo mma, "maka na dị Igbo juru ebe niile na-agba mbọ".

Gọọmenti etiti na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ enwela ọgbakọ maka nsogbu ndị ọchị ehi, mmegbu...

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo

Ebe foto si, Amoke Louis

Ndị gọvanọ ọwụwaanyanwu Naịjirịa, ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo na gọọmenti etiti enwela nzụkọ n'Enugu maka etu a ga-esi gboo nsogbu ndị ọchị ehi nakwa mmegbu ndị Igbo.

Retired Maj. Gen. Bashir Magashi bụ mịnista na-ahụ maka nchekwa onye nọchitere anya gọọmenti etiti kwuru na ha anabatala mkpesa abụọ ndị a ma kwee nkwa na ha ga-elebaya ya anya.

Magashi nakwa ndị isi ọrụ nchekwa na Naịjirịa kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari dunyere ha ha bịa nwee mkparịtaụka maka nchekwa nakwa nsogbu ndị ọzọ na-echekasị ndị Igbo.

Gbasara nsogbu ọchị ehi: Gọọmenti etiti kwuru na ha ga-eelebaya anya ọsịsọ iji kwụsị nsogbu a na Naịjirịa niile site n'atụmatụ ga-adịrị ala Naịjirịa mma.

Gbasara mmegbu ndị Igbo: Magashi kwuru, "anyị kpara maka nsogbu mmegbu ndị Igbo, anyị anabatala ya, anyị na onyeisiala Naịjirịa ga-enwe mkparịtaụka iji hụ mkpesa ndị a, chịkọta ha ma lebaa ha anya n'otu n'otu."

O kwuru na gọọmenti etiti kwadoro nhibe ndị ọrụ nchekwa nke ime obodo ndị gọvanọ ọwụwaanyanwụ kpokobara.

Magashi kwuru na ya ndị otu ya ga-ezigara onyeisiala Buhari mkpesa niile ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo kpesara ha na nzụkọ ahụ.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo

Ebe foto si, Amoke Louis

O kwuru na ọ ga-ahụ na gọọmenti etiti na ndị isi ala Igbo tikọtara isi ọnụ ihu na udo na ọganihu na-achị n'ala Naịjirịa niile.

Gọvanọ Dave Umahi tiwara akụ oyibo Nsugbe n'ọgbakọ ahụ

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo

Ebe foto si, Amoke Louis

Onyeisi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ bụ gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti kwuru na nchịgharị ehi bụ atụmaatụ a machiri amachị n'ala Igbo.

O kwuru na ya ndị gọvanọ ibe ya ga-achịkọta nchekasị ndị a na-akpagbu ndị Igbo site n'aka ndị isi otu Ohaneze ndị Igbo ma wegara ya gọọmenti etiti.

O kwuru na ndị ọwụwaanyanwụ ga-akwadosi ike idi n'otu Naịjirịa ma na-ekwu na ya na ndị gọvanọ ibe ya akwadoghị ọchịchọ nwereonwe.

Umahi katọkwara etu ndị omekome si egbu ndị ọrụ nchekwa n'ala Igbo ma na-ekwusi ike na a ga-eji mkparịtaụka agwa ndị ntoroọbịa ha gbara tigbuo zogbuo ọsọ.

Umahi kwuru na ọ bụ nanị ngalaba Ebubeagu bụ ndị nchekwa ime obodo n'ala Igbo.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo

Ebe foto si, Amoke Louis

Ndị ọzọ biara nzụkọ a gụnyere ndị gọvanọ Abia na Imo steeti, Dr. Okezie Ikpeazu nakwa Senator Hope Uzodinma , Deputy gọvanọ Anambra State, Dr. Nkem Okeke, "Senate Minority Leader", Senator

Enyinnaya Abaribe, Minista nke stteeti na-ahụ maka ihe ngwupụta na Naịjirịa, Hon. Uchechukwu Ogah, Onyeisi Ohanaeze Ndigbo, Ọkammụta George Obiozor, aka chiburu sineti, Senetọ

Ken Nnamani, Sinetọ Ike Ekweramadu, "Deputy Minority Leader of the House of Representatives", Rt. Hon. Toby Okechukwu, Speaker of Enugu State House of Assembly, Rt. Hon. Edward Ubosi, Aka chiburu

old Enugu State, Dr. Okwesilieze Nwodo, Chief Emmanuel Iwuanyawu, Chief Nnia Nwodo, Chairman otu Christian Association of Nigeria (CAN), South East nakwa ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: