Ihe ndị uweojii kwuru maka onye otu ha egburu ma bepụ ya ihe o ji bụrụ nwoke

Ndị uweojii na-eche nche

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ egbuola otu onye uweojii n'Oguta, Imo Steeti, ma bepụ ya amụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme n'ezie.

Dịka onye obodo ebe ihe a mere si gwa BBC Igbo ya bụ ihe mere n'ụbọchị Tuzde, abalị atọ nke ọnwa Mee.

Aha onye uweojii ahụ bụ Ukam Efut bụ onye na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Agwa, n'okpuru ọchịchị Oguta.

Etu mwakpo a si mee

Oguta, Imo Steeti

Onye obodo ahụ na-achọghị ka anyị kpọpụta aha ya kwuru na ndị uweojii ahụ nọ ọrụ n'ebe a na-akpọ Okpo-efi 'junction' oge ndị ojiegbe ahụ wakporo ha.

"Ha dị ndị uwojii atọ nọ ọrụ ebe ahụ oge ya bụ ihe mere mana abụọ ndị ọsọ."

"Ndị ekperima ahụ gbagburu Ukam Efut, ma bepụ ya amụ ya."

Otu n'ime ndị isi obodo ahụ aha ya bụ Ekene Onyejiekwe kwuru na o so na ndị nyere aka buga ozu nwoke ahụ n'ụlọozu dị n'Owere.

Onyejiekwe kwuru na ọ bụ ndị mmadụ kpọrọ ya n'ekwentị ma kọọrọ ya ihe merenụ.

"Oge m bịaruru, onyeisi ndị uweojii gwara anyị ka anyị nye aka buga ozu ahụ n'ụlọ ozu."

"O ruchabeghị ọnwa abụọ e si Abia steeti zite onye uweojii a na mpaghara anyị a."

"Ọ bụ ya ji ọkwa 'administrative officer' ebe a; ọ fọdụụrụ ya afọ abụọ ka ọ laa ezumike nka n'ọrụ uweojii."

Onyejiekwe kwuru na ya bụ ihe bụ nnukwu ihe mwute nye ndị mpaghara ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru

Onye uweojii

Ebe foto si, Reuters

Michael Abattam, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti, kwuru na ya bụ mwakpo mere n'eziokwu.

Mana Abattam gwakwara BBC Igbo na ndị uweojii chọwara ndị mere mwakpo ahụ ma buso ha agha.

"Anyị gburu mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ mere ya bụ mwakpo a," Abattam kwuru.

Gbasara ndị a na-eche na ọ bụ ha mere mwakpo a, Abattam kwuru na ha ka na-eme nnyocha iji mata kpọmkwem.

Mwakpo ndị ọrụ nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ndị ojiegbe wakporo Agulu

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ebe ndị ojiegbe a na-agbaga n'ụgbọala ha tupu ha anyapụ

Ogbugbu ndị ọrụ nchekwa na-akwanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso, ọ kachasị n'Anambra na Imo steeti.

N'ụbọchị Satọde, abalị iri atọ nke ọnwa Eprel, ndị ojiegbe gburu ndị agha abụọ na-eme njem ịga agbamakwụkwọ ha.

N'otu ụbọchị ahụ, ndị ekperima wakporo obodo Agulu na Osumenyi dị n'Anambra steeti, o doghị anya mmadụ ole nwụrụ na mwakpo ahụ.

Ọzọkwa mere n'ụbọchị Mọnde, abalị abụọ nke ọnwa Mee, dịka ndị oji egbe gburu mmadụ anọ n'Ụkpọ na Ozubulu, n'Anambra Steeti.

Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-alụ ọgụ maka nnwereonwe Biafra, bụ 'Indigenous People of Biafra', na ndị otu nchekwa ha bụ 'Eastern Security Network', na-eme mwakpo niile ndị a.

Mana ndị IPOB na-agọ na ọ bụghị ha.

Cheta na onyeisi ndị IPOB bụ Mazi Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'Abuja, ebe gọọmentị etiti ji ya eji maka ebubo iyi ndụ egwu.

Ikpe ya ka na-aga n'ihu ugbua n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.