US mid-terms: Ihe ise anyị mụtara na ntuliaka Amerịka

Aha onyonyo, Ntuliaka Amerịka

Mkpọtụ ntuliaka ndị mba Amerịka mere n'ụbọchị Nọvemba 6, 2018, ka na-ada jụụ maka ihe gbasara akụkọ ụlọomeiwu ha.

Nwaafọ Igbo bi Amerịka aha ya bụ Commander Ezu, ziteere BBC ihe onyonyo gosiri etu e si mee ya bụ ntuliaka n'ama ya.

Ihe nkiri a gosiri ma igwe e ji atunye aka nke Bekee kpọrọ 'electronic voting' - bụ usoro Amerịka ji eme ntuliaka ha.

Ntuliaka a mechara gaa etu e si tụọ anya ya - Pati Demokrat ritere erere ka ndị ga-achị ụlọomeiwu nke nta Bekee kpọrọ "Congress", nke bụ mbụ ha na-erite Kemgbe 2010.

Pati Repọblikan ka jikwa ụlọomeiwu nke ukwu Bekee kpọrọ "Senate".

Ntuliaka mid-term Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Enweghị ihe ukwu ọbụla mere, mana akụkọ pụtara na ya bụ emume karịri, nke nyere kepu kepu ihe ga-eme na ntuliaka Amerịka ga-eme n'afọ abụọ na-abịa.

Lee ihe anyị hụrụ na ya bụ okwu.

1) Ụmụnwaanyị pụtara gaa tụọ vootu karịa etu ọ na-adị

Ndị mmadụ kwuburu na afọ a bụ nke ụmụnwaanyị tupu ntuliaka mid-term a eghe.

Ndị mmadụ na-ekiri ọnụọgụgụ ntuliaka n'Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ntuliaka a o gosiri etu ndị Demokrat nwere ike iji hazigharịa nke 2020?... o nwereike

Nke a mechara bụrụ eziokwu. Ugbua, ụmụnwaanyị nọ n'ụlọomeiwu nta karịchazịrị etu ọ dị na mbụ.

Ndị "mbụ" ga-eso ma a kpọwa aha ha, so nọrọ n'ọgbọ.

2) Ụzọ ndị Demokrat ga-esi soro Trump maa aka

Ndị Demokrat enweghị ọtụtụ ohere ịnapụ ndị Repọblikan ọchịchị sineti, mana ha mere etu e si tụọ anya na ndọrọndọrọ nke ụlọomeiwu nta - n'agbanyeghị na ha emeghi ihe ebube ọbụla.

3) Nke a ọ bụ "ezigbote mmeri" nye Trump?

Trump sị na etu ntuliaka a si gaa na-enye ya aṅụrị, na mmeri ha nwere na Sineti bụ ihe ha kwesịrị iji nwee ọṅụ.

4) Nkewa dị n'etiti ndị ime obodo na ndị bi n'obodo mepere emepe

Ndị Repọblikan achịtaghị aja ọfụma na ntuliaka e mere n'ime obodo. Ihe a mere na mba Amerịka niile.

Ihe a nwereike inye ha nsogbu n'ihu.

5) Ndị govanọ na-akwado Trump nwere ọsọndi owendị

O nwere ndị nwere akụkọ ọma, nwekwa ndị ọchị adịghị n'ọnụ n'ime ndị na-akwado Trump zọọrọ ọchịchị dịka gọvanọ na steeti dị iche iche.

Ntuliaka 2020 ga-adị kpọọkpọọ n'ezie.

Ilhan Omar

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ilhan Omar bụ onye ụka alakụba ga-eso na Kongress, ya na onye ọzọ bu ndị ụka ha mbụ nwetere oche a

Akụkọ ga-amasị gị