Mid-term elections 2018: Nnamdi Chukwuocha, nwaafọ Igbo so azọ ọchịchị

Nnamdi Chukwuocha

Ebe foto si, Instagram/Nnamdiforstaterep

Nnamdi Chukwuocha so n'aha ga-adị n'akwụkwọ ntuliaka ka ndị Amerịka ga-atụ vootu n'atụmatụ akpọrọ 'mid-term election' na Bekee.

Chukwuocha bụ onye Amerịka si Naịjirịa na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ndị Demokrat n'ụlọomeiwu nke obodo Delaware.

Chukwuocha dị afọ 47, ga-anọchịte anya "District 1".

Ọ sị na ọ na-eme ndọrọndọrọ a iji nweta ohere hazie nsogbu dị icheiche ndị ọ na-enwe olileanya ịnọchite anya ha na-agabiga.

Nsogbu ndị ahụ gụnyere akụnaụba, mmepe obodo, agụmakwụkwọ, na ihe ndị ọzọ.

O meela afọ abụọ ndị Amerịka binyeere Donald Trump aka ka ọ bụrụ onyeisiala ha.

Lee ihe ụfọdụ ị kwesịrị ịmata maka ntuliaka Amerịka.

Onyeisiala Trump

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onyeisiala Trump mere ezigbote ngagharị ịchụ nta vootu maka ntuliaka

Gịnị bụ ntuliaka'mid-term'?

Ntuliaka 'mid-term' bụ ntuliaka ndị Amerịka na-eme kwa afọ anọ ọbụla.

Ọ na-adaba n'ime afọ anọ nke onyeisiala Amerịka.

Ọ bụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Novemba ka a na-eme ntuliaka a.

Ntuliaka 'mid-term' Amerịka

Ebe foto si, Getty Images

Ked ndị so azọ oche n'af a?

N'ụlọomeiwu nke nta a kpọrọ "Congress", oche niile bụ ihe a na-azọ. Oche ndị a dị 435.

Oche dị n'ụlọomeiwu nke ukwu Amerịka a kpọrọ "Senate" dị 100, mana ọ bu naanị 35 ka a ga-azọ na ntuliaka a.

Steeti 36 ga-eme ntuliaka iji họpụta onye ga-arụ ọrụ dịka gọvanọ.

Ihe a ga-enye ohere ịtụgharị ndị na-achị obodo.

Ntuliaka 'mid-term' Amerịka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị mmadụ ebidola ịtụ vootu

Ked ndị ga-emeri?

Ọ ga-ara ahụ ịmata onye ga-emeri tupu a tụọ vootu maka ihe meburu na mbụ.

Makana ntuliaka na-eme n'etiti ọchịchị onyeisiala, ọ ga-abụ ezigbote ohere iji hụ ma onye na-achị ọ na-achịta.

Dịka o si eme na mbụ, ntuliaka adịghị amasị onyeisiala na-achị.

A na-anapụ pati onye na-achị n'oche 32 na "Congress", na abụọ na "Senate".

Mana afọ a, ndị Demokrat kwesịrị irite oche 23 karịa nke ha nwere ugbua, iji bụrụ ndị ga-achị ya.

Na "Senate", ha kwesịrị inweta oche abụọ karịa nke ha nwere ugbua.

Mana, ọ gaghị adịrị ha mfe makana ha ga-agbalị ịhụ na ndị nkwado ha pụtara tụọ vootu. Ihe a bụ ihe ga-esi ike makana ndị mmadụ adịghị apụta ọfụma na ntuliaka a.

Nd ga-atụ vootu na ntuliaka a

America mid-term election

Ebe foto si, Getty Images

A na-eche na ndị ga-apụta mee ntuliaka a bụ ihe dịka pasentị 40 n'ime ndị tozuru ịtụ vootu.

Mana nchọpụta na-egosi na ndị mmadụ adịghị ka ha achọrọ iso mee ntuliaka a.

Ndị a ga-etinye n'ụloikpe nke ukwu, ihe metụtara ọgwụgwọ nke Bekee kpọrọ "healthcare", nakwa akụnaụba obodo, so n'ihe ndị mmadụ ga-eji tụnyere mmadụ.

Mana ihe kachasị nwereike ịbụ Donald Trump.

Akụkọ ga-amasị gị