Anyị anaghị egbu oge maọbụ ese okwu, ọ bụ ikike Nnamdi Kanu ka anyị na-azọ - Aloy Ejimakor
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo, Amaka Bassey na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos
Aloy Ejimakor bụ otu ọkaiwu n'ime otu ndị ọkaiwu na-anọchị anya Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob n'ụlọikpe akụwaala akịoyibo nsugbe.
Na mkparịtaụka nke ya na BBC nwere, ọ kọwara ihe mere ikpe Kanu ji bụrụ ihe e ji anya ọkụ e so.
Ọ sị na ọ bụ n'ihi na ọtụtụ ebubo e boro Kanu bụ ndị agbakwunyere ikpe ọnwụ maọbụrụ na ikpe mara onye ahụ.
N'ọnụ ya "Ọ bụghị na anyị na-egbu oge maọbụ na anyị na ọkaiwu na-ese okwu maọbụ anyị na ndị ọkaikpe gọọmentị etiti na-ese okwu mba!
Anyị na-azọ ikike ruru ya ma na-azọsi ya ike."
O bokwara ebubo na DSS na-ege ntị n'ihe ya na Kanu na-akpa ma ọ gaa ịleta ya nke mere na eji ya agba ha mgba n'ụlọikpe.
Rue ugbua, BBC ka na-eche ọsịsa ụlọọrụ DSS gbasara ebubo nke a dịka Ejimakor na-ekwu na ọ bụ ya mere o ji agba mbọ ka ọ pụta n'aka ụlọọrụ nchekwa nzuzo ahụ.
Dịka ikpe Kanu si kwụrụ ugbua, Ọkaikpe Binta Nyako esepụla aka n'ikpe Nnamdi Kanu dịka Kanu kwuru na o nweghizi ntụkwasiobi n'etu Nyako si ekpe ya bụ ikpe.
Mana Ejimakor n'onwe ya na-ebokwasa DSS ebubo ọzọ na-ekwu na ha ejirila iwe ahụ gbochie Nnamdi Kanu ịhụ onye ọbụla nke gụnyere ndị ọkaiwu ya n'agbanyeghị na omume nke a dara iwu nke ụlọikpe nyere.






