Soludo enweghị ikike n'iwu Naịjirịa ịgbachi ahịa – Ndị Ọkaiwu

Foto ndị na-eme ngagharịiwe na ọdọ ahị Ọnịcha

Ebe foto si, BBC and screen grab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị ọkaiwu ekwuola na Gọvanọ na-achị Anambara steeti bụ Chukwuma Soludo enweghị ikike ọbụla ịgbachị ahịa.

N'ụbọchị Tuzde, Jenuwarị 27, 2026, Gọvanọ Soludo gbachiri ahịa Onicha dịka ndịahịa nupuru isi n'iwu o nyere ka ha malitekwa ịzụ ahịa ụbọchị Monde.

Soludo kwuru na abịghị ahịa n'ụbọchị monde ma bụ ịkwado ndị yinwere atụmatụ ịnọ n'ụlọ n'ụbọchị ahụ.

Mana ndị ọkaiwu kọwara na ihe Soludo na-eme dịka ịgbachị ahịa adịghị n'iwu Naịjirịa.

Ha sị na ọ bụ gọọmenti okpuru ọchịchị n'ebe ahịa ọbụla dị nwere ikike n'iwu Naịjirịa ịgbachi ya.

Ọkaiwu Abuchi Ogbachulu bụ otu onye na ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kọwara na ihe Gọvanọ Soludo na-eme ugbua dịka "steeti ịrụ ọrụ dịrị gọọmenti okpuruọchịchị.

Main Market, Headbridge na ebe ndị ọzọ dị na okirikiri ha dị jụụ taa

Ụlọahịa ndị gbachiri n'Ọnịcha Main Market
Nkọwa foto, Ụlọahịa ndị gbachiri n'Ọnịcha Main Market

Nagbanyeghị ngagharị iwe, ụbọchị Tuuzde 27 Jenụwarị, ndị ntaakụkọ BBC gagharịrị n'Ọnịcha Main Market hụrụ na udo dị n'ụbọchị Wenezde 28 Jenụwarị 2026 n'Ọnịcha Main Market.

Ebe ndị niile gbara ya gburugburu dịkwa n'ụdọ dịka ndị ọrụ nchekwa kwechiri iji hụ na udo bịaghachịrị na Main Market.

Head bridge n'ụbọchị Wenezde 28 Jenụwarị 2026 na-egosi na ụgbọala na-aga siriri werere
Nkọwa foto, Head bridge n'ụbọchị Wenezde 28 Jenụwarị 2026 na-egosi na ụgbọala na-aga siriri werere
Ọdọ ahịa dị nso na Main Market Ọnịcha

Kedụ ka ngagharị iwe si wee bido?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ụzụ ụtụtụ Tuzde, Jenụwarị 27, 2026, ndị na-achọ ka emepe ahịa mere ngagharị iwe n'Ọnịcha Main Market dịka ndị oree ahịa bịakutere n'akụkụ ọgbọ ahịa mana ndị ọrụ nchekwa ekweghị ha banye n'ime ahia maka mmachi Gọvanọ Soludo machiri ahịa Main Market dị n'Anambra Steeti.

Ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii ndị ọrụ Navy, ndị ọrụ State Anti-Touting Squad (a ma dịka SASA), nakwa Operation Clean and Healthy Anambra (OCHA Brigade) so na ndị gbochiri ụzọ ma hapụ ikwe ka ndị na-eme ngagharị iwe baa n'ọgbọ ahịa.

E mechiri ebe niile n'ime ahịa market, tụmadị Ose Market, okporoụzọ Sokoto, Kano na Bida Lane socha n'ebe ndị a machịrị.

N'ọnụ ndị hụrụ ihe mere achọghị ka a hụ ihu ya, dịka ụbọchị Tuzde gara n'ihu, ndị na-eme ngagharị iwe jiri iwe na-aga nso n'ebe ahịa, ma na-agba mbọ ịbaa n'ahịa.

N'oge ahụ ka ndị isi ndị ahịa bụ Onyeisioche Ọnịcha Main Market bụ Hon. Chijioke Okpalaugo, na ndị nchekwa so gwa ndị ahịa okwu.

Ha yọgidere ha mana ndị ngagharị iwe ekweghị mere ka ndị nchekwa ji anwụrụ ose chụsasịa ha.

Ya mere ha jiri were iwe garuo ebe ndị dịka ụzọọgbọokirikiri Borromeo Roundabout, Ahịa Ochanja na Isi Akwa mmiri Naịja a kpọrọ Bridge Head iji gosi iwe ha.

N'agbanyeghị, Onyeisioche ahịa bụ Hon. Okpalaugo nakwa Onyeisioche ndị n'ahịrị mechara gbakọọ n'ụlọọcha dị n'Ọnịcha Main Market (White House) nakwa Onyeisi niile nke a ma dịka ASMATA, Chief Humphrey Anuna, izute kwuo ka e si eme.

Ndị ahịa emeela ngagharịiwe maka ahịa Ọnịcha Main Market gọọmenti gbachiri

Ndị ahịa emeela ngagharịiwe n’Anambra Steeti maka ahịa gọọmenti mechiri

Ebe foto si, BBC, SCREENSHOT

Ụfọdụ mmadụ emeela ngagharịiwe iji gosi na obi adịghị ha mma na gọọmenti gbachiri ahịa Ọnicha Main Market.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwuru na mmadụ ndị ahụ kwere ukwe dị iche iche iji gwa gọọmenti na ha akwadoghị atụmatụ ahụ.

Ọ bụ n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị 2026 ka Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo na-achị Anambra Steeti mechiri ahịa Ọnịcha Main Market ruo otu izuụka.

Soludo kwuru na ya mere nke a n'ihi na ndị ahịa erubeghị isi n'iwu machiri ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde.

Otu ihe onyonyoo fesara na soshal midịa gosiri ebe ndị ahụ na-eme ngagharịiwe gbara ọsọ, dịka a sị na ndị nchekwa ji egbe chụsaa ha.

Ihe mere Gọvanọ Soludo jiri machie ahịa Ọnịcha Main Market

Foto Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra Steeti

Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo na-achị Anambra Steeti amachiela ahịa Ọnịcha Main Market ruo otu izuụka maka na ha erubeghị isi na mmachi gọọmenti steeti ahụ machiri ọnọdụ onye apụtala ezi (sit-at-home) na-aga n'ihu na steeti ahụ kemgbe ọtụtụ afọ ugbua.

Gọvanọ Soludo kwupụtara nke a n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị, 2026 oge ọ gara n'ahịa ahụ iji hụ etu ihe si aga, dịka o nyere iwu ka ụlọọrụ nakwa ahịa niile dị na steeti malite imepe n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

Oge Gọvanọ Soludo rutere n'Ọnịcha Main Market, ọ chọpụtara na ọtụtụ ụlọahịa kpọchiri akpọchi. Ọ bụ nke a mere o jiri kwuo na ya amachiela ahịa ahụ ruo otu izuụka.

Oge Gọvanọ Soludo gara n'ahịa Onitsha Main Market

Ebe foto si, Law Mefor/Facebook

Cheta na ozi Kọmishọna Mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Law Mefor depụtara n'akara Facebook ya, mere ka o doo anya na gọọmenti akagbuola atụmatụ ịnọ n'ụlọ a na-eme n'ụbọchị Mọnde niile na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ma kwuo na gọọmenti ga-amanye nke ahụ n'ike.

O kwuru na ọ dịghịrị Gọọmenti Anambra mfe inwe mkpebi ahụ, mana ọ dị mkpa na e mere ya n'ihi etu akụnaụba steeti ahụ si adakpọ site n'ịnọ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla kamgbe ọtụtụ afọ.

Law Mefor kwuru na ụlọọrụ ọbụla na-erubeghị isi n'iwu gọọmenti steeti ahụ nyere gbasara mmachi ọnọdụ ịnọ n'ụlọ n'ụbọchị Mọnde niile ga-enweta ntaramahụhụ si n'aka gọọmenti.

Ogige white house ahịa main market Onitsha

Gọvanọ Soludo mere ka o doo anya na gọọmenti ya kwụ chịm ịhụ na ụlọọrụ nakwa ụlọahịa na-emepe n'ụbọchị Mọnde.

Ọ gakwara n'ihu dọọ ndịisi ụlọakwụkwọ aka na ntị, ma yie egwu na a ga-achabi ụgwọọnwa onye ọrụ gọọmenti ọbụla na-erubeghị isi n'iwu a.

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ahịa Ọnịcha Main Market, ọ chọpụtara na ọgbọ ahụ kpọchiri akpọchi.

Mbọ niile ọ gbara ịnụ ọnụ mmiri okwu ndịisi ahịa ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla maka na ha achọghị ịgwa ndị ntaakụkọ okwu.

Ogige white house ahịa main market Onitsha