Ọtụtụ ndị ahịa ka na-erubeisi n'iwu ịnọrọ n'ụlọ n'Aba, Ọnịcha

Ọtụtụ ndị ahịa ka na-erubeisi n’iwu ịnọrọ n’ụlọ n’Aba, Ọnịcha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ahịa agaala n'ihu ịnọrọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde n'Aba dị n'Abịa Steeti, iji kpọọ oku ka a tọhapụ onyendu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Ọnọdụ a metụtara ahịa ndị a ma ama n'Aba gụnyere Arịarịa, Ahịa Ọhụrụ, Cemetery na Ekeoha shopping complex.

Ka ọ dị, ụfọdụ ndị nwere ụlọahịa n'okporoụzọ ndị a ma ama dịka Faulks Road gbapere na-enweghị ụdị mmekpaahụ ọbụla, kama ahịa ha ejighị ike azụ.

Ụlọakụ ndị dị n'akụkụ ahịa Arịarịa emepeghịkwa.

Ụfọdụ ndị ahịa gwara BBC okwu na-achọghị ka akpọọ aha ha kwuru na mkpebi ha nwere ịbịa ahịa bụ n'ime onwe ha, ma gbakwunye na e kwesịghị ịmanye onye ọbụla.

Ọtụtụ ndị ahịa ka na-erubeisi n'iwu ịnọrọ n'ụlọ n'Aba, Ọnịcha

N'Anambra Steeti, azụmaahịa ejirila nwayọ lọghachi n'Ọnịcha Main Market, n'agbanyeghị na ahịa ndị ọzọ, ọdọụgbọala na ụlọorụ ndị e nwere n'Ọnịcha ka gbachiri agbachi n'ihi iwu onye nọrọ n'ụlọ.

Oge BBC garuru Ọnịcha n'ụbọchị Mọnde 9 Febụwarị 2026, anyị chọpụtara na dịka ndị ahịa ji nwayọ na-alọghachi n'Ọnịcha Main Market, ahịa ndị ọzọ dịka Electronics, Relief, Ọchanja, na Ọgbọ Ọgwụ ka tọgbọ chakoo dịka ụlọahịa ruru pasenti iri isii ka gbachiri agbachi.

Anyị hụkwara ndị ọrụ nchekwa na mpaghara dị iche iche n'ime ahịa, dịka ha na-ahụ na e mere ihe n'ezi usoro.

Nnamdi Kanu na Ipob akagbuola Sit-at-home kpamkpam - Emma Powerful

Foto ọtụtụ ndị mmadụ na-abanye n'ụlọ ahịa ha n'ahịa Ọnịcha Main Market n'ụbọchị Mọnde 9 Febụwarị 2026 dịka e nwetere iwu 'Sit-at-home' na njedebe.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu akagbuola emume sit-at-home a na-eme kwa Mọnde ọbụla na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile malite n'ụbọchị Mọnde Febụwarị 9, 2026.

Ozi ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful wepụtara, kwuru na Nnamdi Kanu nyere iwu iji hụ na ụmụakwụkwọ laghachiri n'ụlọakwụkwọ ma hụkwa na ndị na-azụ ahịa na ụlọọrụ ndị ọzọ dị n'ala Igbo na-arụ ọrụ ha na-enweghị nsogbu maọbụ mkpagbu ọbụla.

Ozi ahụ gwara onye ọbụla na-ekweghị n'ozi a, ka ọ gaa ụlọmkpọrọ dị na Sokoto steeti Nnamdi Kanu ma nụ ya n'ọnụ ya.

Emma Powerful mere ka o doo anya na onye maọbụ otu ọbụla na-akpọ oku sit-at-home, na-enupuisi nye iwu Kanu nyere ma kwuo na a ga-ahụta ndị dị etu a dịka ndị iro na-achọghị ọdịmma na ọganihu ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ozi ahụ kwukwara na enweghị Gọvanọ ọbụla nwere ikike iyi egwu, kụkpọọ maọbụ machie ụlọ azụmahịa ọbụla ma kwuo na ha ga-azaghachi Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra steeti maọbụ Gọvanọ ọbụla yiri ndị ahịa ọbụla egwu.

N'aka nke ọzọ, ihe onyonyo gbara n'anwụ gosiri ebe ndị otu Biafran Liberation Army e kwuru na ọ bụ ha na-amanye ndị mmadụ ịnọ n'ụlọ, kwuru na a kagbuola emume sit-at-home na mpaghara ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.

Akụkọ ka na-abịa...

Ndị gbapere ụlọ ahịa ha n'ọgbọ ndị na-ere uwe n'ahịa Ọnịcha Main Market n'ụbọchị Mọnde 9 Febụwarị 2026.