O nweghi 'sit at home' ọzọ anyị hibere na-abụghị ụbọchị 21 October - Ipob

Ebe foto si, Getty Images
Otu Ipob agọrọla isi onwe ha n'akụkọ ụgha na-efegharị gbasara 'sit at home' a sị na ha hibere.
Ha kwuru na ọ bụ naanị ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba ka ha sị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ iji kwanye ugwu maka ikpe onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.
Ihe ọzọ ha kwuru bụ maka Sit at home kwa ụbọchị Monde, nke ọzọ ụbọchị Tuzde iji cheta otu afọ kemgbe e mere ngagharịiwe 'End Sars' ha kọwara na o sghi ha n'aka.
N'ozi ha wepụtara, ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful kwuru sị "anyị na gwa ọha na eze mmadụ ha ha gbajọọ akụkọ ụgha na-efegharị gbasara iwu nọrọ n'ụlọ.
"Anyị chọrọ ka o doo anya na ozi ahụ esighi n'ọnụ Ipob pụta, anyị chọkwara ịwepu onwe anyị n'ihe niile gbasara ya bụ akụkọ ụgha" ka ozi ahụ kwukwara.
























