Etu Victor Osimhen si si na nwata na-ebugharị ihe ghọọ 'Eze Afrịka'

Ebe foto si, Getty Images
Victor Osimhem abụrụla onye a na-etu “Eze ọhụrụ nke mba Afrịka” dịka ya bụ nwaamadị na-asụnye ọkpụ goolu mabutechara onyinye nkwanyeugwu 'ọgbaabọọlụ mba Afrịka nke afọ 2013'.
Nwaokorobịa ahụ na-agbara otu egwu bọọlụ Napoli gbara afọ 24, mabuuru ihe nrite ahụ n’oge emume nkwanyeugwu 'Confederation of African Football' (CAF) haziri n’abalị Mọnde, dịka o meriri ihe ịmaaka sitere n’aka kaptịn mba Ijipt bụ Mohamed Salah nakwa onye mkpachi mba Morocco bụ Achraf Hakimi.
Maka Osimhem, onye tolitere n' Olusosun Street nke Steeti Legọs, nke ahụ bụ “nrọ ya ịbịa na mmezu” dịka ọ gabigachara ọnyịmaụwa n’oge ọ ka bụ nwata.
Osimhen kwuru sị,“E kwesịrị m ikele onye ọbụla bụ nyeere m aka na njem a tinyekwara ụmụafọ mba Afrịka bụ ndị nyere aka mee ka m rute ebe a taa na-agbanyeghị njehie m niile.”
Dịka ụsụ ureghure dị n’ogbe ya na-ekweghị ya megharịa ahụ, Osimhen kwuru na ya nwere ọnụnụọkụnoobi ime nke ọma na-agbanyeghị ihe mkpọbiụịkwụ ọ bụla.
O rere akwụkwọ akụkọ na mmiri ọṅụṅụ nke bụ ọnọdụ ọ kọwara dịka mmadụ ịnọ “na ndagwurugwu.”
“Dịka obere nwata nwoke, onye na-ebugharị ngwaahịa n’okporoụzọ kwa ụbọchị iji gbanarị ọtụtụ nsogbu ezinaụlọ m na-agabiga, ị bụ onye a na-ahụta dịka ihe dị oke ọnụahịa na mba Afrịka nakwa egwuregwu bọọlụ n’ụwa dum bụ nrọ akụm,” nke a ka o kwuru n’otu ozi o zipụrụ na X.
“Njem m n’egwuriegwu bọọlụ bụ nke jupụtara n’ọtụtụ ihe aṅụrị na mkpọbiụkwụ dị iche iche.”

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ọ sụnyechara ọkpụ goolu 26 iji nyeere Napoli aka mabute iko Italian League mbụ ya, Osimhen bịara bụrụ nwaafọ Naịjirịa mbụ ga-amabute ihe nrite ọkachasị nkụ CAF nke ndị nwoke kemgbe ahụ onye gbabuuru otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Nwankwọ Kanụ mabutechara ya n’afọ 1999.
“Osimhen mere ihe na-atụ n’anya,” ya ka onye gbabuuru otu egwu bọọlụ Arsenal na mba Togo bụ Emmanuel Adebayor, onye mabutere ihe nrite ahụ n’afọ 2008 gwara CAF TV.
“Ịsụnye ọkpụ goolu na mba England nwere ike ị dị mfe mana ime nke ahụ na mba Italy abụghị egwu achị ụtaba n’aka were na-agba n’ihi na ha bụ ndị gbasiri ike na mkpachi.”
Dịka onye gbabuuru mba Ivory Coast bụ Didier Drogba nakwa ya onwe ya mabutere ihe nrite CAF dịka ọkachasị akụ ugboro abụọ na-akọwa nwaamadị ahụ gbabuuru Lille ka ọkaibe ọhụrụ na mba Afrịka, a na-enwe olileanya ugbua na o nwere ike bugoo Naịjirịa n’oge ọganịihu ọhụrụ.
Mgbago Osimhen n’ogo dị elu bụ nke ji nwayọọ nwayọọ were na-abịa karịa nke bịara n’otu mgbe.
Isonye n’otu egwu bọọlụ Naịjirịa mabutere iko mba ụwa ndị na-akarịbeghị afọ 17 bụ nke wetara mgbanwe n’akaraaka ya iji gosi na ọ bụ nwa ya na chi ya dị n’izu.
Ọkpụ goolu 10 ọ sụnyere na mba Chile riteere ya akpụkpọụkwụ ọlaedo ma mekwaa ka CAF hụta ya dịka ọkụbọọlụ na-eto eto nke afọ ahụ - na-agbanyeghịkwa na ọ fọrọ naanị nwa obere ihe ka a ghara ịgụnye Osimhen n’aha ndị ọkụbọọlụ gara asọmpi ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
“Elegharachaala m ya anya n’ihi na etikọtara ya na ndị ọkụbọọlụ ọzọ na-amaghị nke ha riri,” ya ka onye nkụzi otu egwu bọọlụ ahụ bụ Emmanuel Amuneke gwara BBC Sports Africa.
“Mana otu n’ime ndị ọrụ m kpọtara echiche m n’ebe ọ nọ. E nyere m ya ohere ọzọ bụ nke o ji gosi na ya tozuru oke isonye n’otu ahụ.”
Ọ bụghị ihe ịtụnaanya na dịka ọ natachara ihe nrite CAF na Morocco, Osimhen toro onye nkụzi ya n’oge ochie n’abalị Mọnde maka inyeere ya aka nwetazuo ọhụ ya.
“Ekele m pụrụ iche na-agara Emmaanuel Amuneke maka na e wezuga ya, e cheghị m na m nwere ike ịkwụrụ n’ebe a jide otu ihe nrite a na-akwanyere ugwu pụrụ iche negwuriegwu bọọlụ mba Afrịka,” nke ahụ ka o kwuru.
Ọ bụ eziokwu na enweela ụfọdụ ihe mkpọbiụkwụ n’ụzọ m.
Ịgafe n’otu egwu bọọlụ Wolfsburg nke mba Germany n’ime ọnwa Jenụwarị 2017 fọrọ ihe obere ka ọ bụrụ ihe egwu nyere ya bụ nwaamadị ka na-eto eto bụ onye sooro gbaa bọọlụ ugboro 16 na-asụnyeghị ọkpụ goolu ọ bụla tupu nnyepụ enyepụrụ ya n’efu n’otu egwu bọọlụ Charleroi nke mba Belgium n’oge akụmbọọlụ 2018 banyere 2019 enye ya olileanya.
Mpi Osimhem bịara dị elu n’otu egwu bọọlụ Lille nke na anyị nwetara ozi na Napoli kwụrụ $96m (€81.3) – nke bụ otu n’ime ọnụahịa dị elu karịsịa a kwụrụ maka nwaafọ mba Afrịka – iji zụbata ya n’otu egwu bọọlụ ahụ n’ime ọnwa Julaị 2020.
Tutu oge akụmbọọlụ o jiri mabute iko Serie A, ntiwapụ nje ọrịa coronavirus na ihe mmerụahụ o nwetara n’ihu bụ nke mere ka ọ na-eyi mkpuchi ihu mere ka ọ ghara isonye n’asọmpi African Cup of Nations (AFCON) afọ 2021.
Nke kasị nke a bụrụ na ọ na-eru uju ọnwụ nne na nna ya n’afọ 2020.
“Ịtufu nne na nna m dịka m na-eme njem a nyere m nnukwu ọnya n’obi dịka ha bụ ndị na-enye m ume nke m ji aga n’ihu,” nke ahụ ka Osimhen gbakwunyere n’akara X ya.
“Maka ụnụ ndị ezinaụlọ ọma m, ụnụ emeela maka ịkwadọ m nakwa ịhụ m n’anya nke ukwuu. Apụghị m irute n’ogo a ewezuga nkwado ụnụ.”
Onye na-agbara otu egwu bọọlụ Liverpool n’ihu bụ Salah na onye gbabuuru otu egwu bọọlụ Reds bụ Sadio Mane, ndị gbachara afọ 31 n’otu n’otu amabutela ihe nrita CAF anọ ndị gara aga n’etiti ha dịka nturuugo Osimhen na Marrakesh nwere ike ị bụ mmalite ọgbọ nke ọhụrụ.
Onye ogbo ya na Super Eagles bụ Victor Boniface (Bayern Leverkusen), onye na-agbara mba Ghana n’etiti bụ Mohammed Kudus (West Ham) na onye na-asụnyere mba Guinea ọkpụ goolu bụ Serhou Guirassy (Stuttgart) etichaala ịgba pụrụ iche n’oge akụ bọọlụ a.
Etu osiladị, ndị njali si Naịjiria nwere olileanya na dịka a kwanyeere Osimhen ugwu ahụ, na ọ ga-enye otu egwu bọọlụ Naịjirịa ume ọ ga-eji maa aka maka iko AFCON bụ nke mba ndị e nwere n’ọwụwa anyanwụ mba Afrịka mabutere nke ikpeazụ ya na 2013.
Otu egwu bọọlụ ahụ gbara ọnyụpa inweta ntozuoke maka ogo nke ikpeazụ n’afọ 2015 na 2017, gbaa onye nke atọ n’afọ 2019 dịka a kụpụrụ ha n’ogo nke na-esote nke na-esote nke ikpeazụ n’afọ 2021 na mba Cameroon.
“Nkwanyeugwu a bịara n’ogo kachasị elu bụ nnukwu akpamịike n’egwuriegwu bọọlụ Naịjirịa,” ya ka onyeisioche Abuja Football Association bụ Adam Muktar Mohammed gwara AFP.
“Ọ bụ ihe doro ewu na ọkụkọ anya na enwere ụbara ọnatarachi na Naịjirịa. Naanị ihe anyị pụrụ ime bụ ịṅachapụta ọnatarachi a ka ọ bụrụ okwu a kpụ n’ọnụ n’egwuriegwu bọọlụ mba ụwa.”
Drogba – Onye Osimhen kọwara dịka ihe nlereanya ya n’oge ọ na-eto eto – kwetara na Naịjirịa nwere ike ị bụ mba a ga-atụ egwu n’asọmpi AFCON 2023 ga-ebibi ọkụ na mba Ivory Coast n’ọnwa na-abịa abịa.
E tikọtara Super Eagles na mba na-ele ọbịa tinyere Equitorial Guinea na mba Guinea Bissau n’ọgbara A.
“Anyị na-eche gị n’ọnwa Jenụwarị,” ya ka Drogba gbakwunyere n’ozi ekele ya nye Osimhen.
Ya bụrụ ma Osimhen mabute iko AFCON n’abalị 11 nke ọnwa Febrụwarị n’Abidjan, ọjịjamma o nwetara n’egwuriegwu bọọlụ - nke gbara ụmụafọ Naịjirịa ara kemgbe etuwere ya ugo n’abalị Mọnde – ga-alakwu elu.













