Victor Osimhen eturula ugo 'ọkachasị agba bọọlụ' n'asọmpi Serie A' nke Italy afọ 2023

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Isaiah Akinremi and Emmanuel Akindubuwa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Sports Africa
- Ebeg o si, Lagos
Nwafọ Naịjirịa na-asụnye ọkpụ goolu bụ Victor Osimhen eturula ugo dịka ọkachasị agba bọọlụ nke afọ a nke otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba Italy nyere ya n'ihi ike dị egwu ọ kpara na Napoli n'oge akụmbọọlụ gara aga.
Onyinye nkwanyeugwu ahụ bụ nke e chere n'ihu nwaamadị ahụ na-agbara otu egwu bọọlụ Super Eagles n'abalị Mọnde dịka o nyechaara otu egwu Napoli ọ na-agbara aka iji mabute iko mbụ ha kemgbe afọ 33.
Osimhen sụnyere ọkpụ goolu 26 n'asọmpi Serie A nke afọ 2022 banyere 2023, nke kachapụrụ kọwara akwụkwọ George Weah dịka nwafọ Afrịka kachasị nye goolu n'asọmpi mba Italy.
Onye a gbabuuru otu egwuregwu Lille na Wolfborg bọọlụ bụ nwafọ Afrịka mbụ ga-erite onyinye nkwanyeugwu AIC award dịka o sonyere ndị dịka Zlatan Ibrahimovic, Adrea Pirlo, Cristiano Ronaldo na onye nke natara onyinye ahụ n'afọ gara aga, Rafael Leao n'ịmabute onyinye nkwanyeugwu ahụ.
"Ụnụ emeela maka ịhụta m nakwa onyinye nkwanyeugwu ndị a, ana m ekele ndị ezinaụlọ m, ndị enyi na ndị nkwado m maka vootu ụnụ na nkwado ụnụ na-enweghị atụ,"
Osimhen, onye a gụnyekwara maka ịnata onyinye nkwanyeugwu otu egwu bọọlụ Serie A nke afọ a, kwuru nke a n'ozi ọ bipụtara n'akara X.
Osimhen bụ onye nwetara ihe mmerụahụ n'oge akụmbọọlụ a mana nwamadị a dị afọ 24 enyela goolu 6 n'asọmpi 10, dịka ọ lọghachiri n'otu egwu nke Walter Mazzari dịka onye e ji agbannwe mmadụ n'asọmpi ha meriri Atlanta n'ụbọchị 25 Nọvemba 2023.
Dịka ọ natara onyinye nkwanyeugwu AIC nke sochiri nkwanyeugwu Ballon d'Or nke ụmụnwoke afọ 2023 ebe ọ gbara onye nke asatọ, Osimhen na-asụnye ọkpụ goolu nwere olileanya ịbụ nwafọ Naịjirịa mbụ ga-eturuugo ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka "Confederation of African Football (CAF)" nke ụmụnwoke n'afọ a kemgbe Kanu Nwankwo gbaara Arsenal bọọlụ ritechara ya n'afọ 1999.

Ebe foto si, Getty Images
Etu osiladị, ọnụ ọchị ekweghị ụmụafọ mba Afrịka fụnyụọ ọkụ dịka nwafọ mba Malawi bụ Tabitha Chawinga mabutere onyinye nkwanyeugwu AIC maka ndị nwaanyị n'oge ọ gbachara onye nke mbụ n'ịsụnye ọkpụ goolu maka goolu 23 o nyeere otu egwu bọọlụ Inter Milan.
Nwaagbọghọ ahụ gbara afọ 27, bụ onye enyepụrụ n'efu n'otu egwu bọọlụ Paris St-Germain, bụ nwaanyị mbụ n'Afrịka kacha enye goolu n'asọmpi Serie A Femminile.
A na-ekwu na CAF leghaara Chawinga anya maka nkwanyeugwu nwaanyị kachasị agba bọọlụ n'Afrịka nke afọ a, dịka a na-agụnyeghi ya na ndị a họpụtara maka onyinye ahụ.
A ga-ama ndị ga-erite nturuugo a CAF na-ahazi n'ụbọchị Mọnde ụbọchị 11 nke ọnwa Disemba n'obodo Marrakesh mba Morocco.









