Kedu etu Naịjirịa ga-esi kwalite onwe ha na njem itozu ikombaụwa?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Emmanuel Akindubuwa and Isaiah Akinremi
- Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa
- Ebeg o si, Lagos, Nigeria
Ndị nso na ndị nkịtị akatọọla otu bọọlụ Naịjirịa maka etu ha si gbaa na njem itozu maka asọmpị ikombaụwa nke FIFA n'afọ 2026 dịka ha na-eche na ugo Naịjirịa nwereike ịdapụ tupu eruo agba nke ikpeazụ nke ugboro abụọ.
Otu Naịjirịa na Lesotho gbara onwe ha onye laba onye laba n'asọmpị mmepe ha nke otu C ma mechaa napụ Zimbabwe otu point mgbe ha zutere n'egwu nke abụọ ha.
Nke a mere ka onyenkuzi ha bụ Jose Peseiro nọrọ n'oche ọkụ dịka ya na otu ọ na-edu emeghi ka esi tụ anya mana onye na-echeburu Naịjirịa bọọlụ be Peter Rufai agwaala ndị nso ha agbahapụna ndị Super Eagles ozugbo ozugbo.
Ha ka nwereike ịme ihe ga-atụ anyị n'anya. Egwu bọọlụ nwere ka ọ dị. E kwenyere m na ha nwereike ịgbanwe ihe ma mee ndị Naịjirịa obi aṅụrị" ka ocheebọọlụ ahụ gbara n'agba ikpeazụ ikombaụwa nke 1994 na 1998 gwara BBC Africa.
"Ihe emebibeghi.
"A na m atụ anya na ha ga-atụgharị ihe ma tozuo ya bụ egwuregwu"
Naịjirịa nọ n'ọkwa atọ n'otu C ugbua dịka ha ji point abụọ nọrọ n'azụ Rwanda bụ ndị meriri Saụt Afrịka n'ụbọchị Tuusde.
Cheta na ohere ịga asọmpị ikombaụwa afọ 2022 funarịị Ugo Naịjirịa mgbe mba Ghana meriri ha.
Peseiro na otu ya nwere ọtụtụ ọgbatuhie chere ha aka mgba dịka anya ndị mmadụ n'aga n'asọmpị iko mba Afrịka ga-amalite n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị.

Ebe foto si, BBC Sport
E nwere nsogbu n'otu ahụ?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Kemgbe ọ bidoro ọrụ n'afọ 2022, Peseiro emeriela asọmpị isii, daa isii ma gba onye laba onye laba n'atọ n'ime egwu 15.
Ndị otu ya enyela goolu 31 nke 10 n'ime ya si n'ime otu asọmpị mgbe ha zutere Sao Tome na Principe dịka enyerela ha goolu 21.
Onye nkuzi ha si mba Portugal enyerela ha aka itozu maka asọmpị ikomba Africa dịka point ndị funariri ha si mgbe Guinea-Bissau meriri ha.
Mana mgbe ha na Lesotho na Zimbabwe gbara onwe ha onye laba onye laba, onye nkuzi ahụ bụbu onye nkuzi Sporting Lisbon na Porto n'ọzị n'ọnọdụ nchekasị ugbua.
"Anyị ebidoghi ọfụma maọbụrụ na ịchee maka etu anyị si emebu nakwa ụdịrị ndị ọgba bọọlụ anyị nwere", ka David Doherty bụ onye na-achọpụta ndị ọgba bọọlụ gwara BBC Sport Africa.
"Anyị a ga-emenwu ọfụma? N'ezie anyị nwereike - mana onye nkuzi a agaghị emeli ya.
"Ọ bụrụ na ị nwere onye nkuzi ma ọrụ, onye nwara ike ya, ị ga ahụ ya n'ọgbọ egwuregwu."
Otu onye na-aru na ngalaba na-elekọta bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF kwuru na obi adịghị mma n'ọrụ Peseiro na-arụ, mana ha enweghi ego ị chụ ya n'ọrụ.
"Ọ bụrụ na anyị nwere ego (ịkwụ ya ego itiakanobi) anyị dị njikere ị sị ya hapụ ọrụ a" ka Nse Essien kwuru.
"Mmadụ niile na-achọ ka achụọ onyeisi onye nkuzi otu Super Eagles. Ọ bụ ihe mwute na n'ime ihe ruru point isii, anyị nwere naanị point abụọ. Anyị nọ n'ọnọdụ ọjọọ."
Kedụ ebe Naịjirịa nwereike ịme ọfụma?

Ebe foto si, Getty Images
Olileanya ukwu nke ndị nso Super Eagles na-enwe kwesiri maka ụdịrị ndị ọgba bọọlụ a ma ama nọ n'otu ahụ.
Ndị ọgba bọọlụ ukwu so n'otu ahụ gụnyere Victor Osimhen na-agbara otu Napoli, Victor Boniface nke Bayer Leverkusen, Taiwo Awoniyi nke Nottingham Forest nakwa Ademola Lookman na-agbara Serie A n'Atlanta, otu Super Eagles kwesiri ịmegharị otu dịka Lesotho na Zimbabwe anya.
Mana ndị ọnụ na-eru n'okwu maka bọọlụ nwere nsogbu n'ebe ọzọ n'ọgbọ egwuregwu.
"Ndị na-agba bọọlụ ugbua erughi iso n'otu ndị anyị nweburu na Naịjirịa site na 2013 rue 1950" ka Eseoghene Edafe na-ede maka egwuregwu kwuru.
Ohere John Obi Mikel na-agbaburu Chelsea bọọlụ hapụrụ kemgbe o si n'otu Naịjirịa laa ezumike nka ka bụ nnukwu nsogbu.
Onye na-agbaburu Otu super Eagles bụ Duke Udi kwenyere na mmezi nsogbu ahụ dị n'ijikọ ọgba bọọlụ niile n'abụghị naanị ndị na-agbaso ndị ọzọ bọọlụ.
"O nwee akụkụ anaghị arụ ọrụ, ọ bụrụ nsogbu otu niile maka na mmadụ niile kwesiri ịrụ kọ ọrụ ọnụ," ka ọ gwara BBC Sport Africa.
Peseiro e nwereike ịtụgharị ihe n'asọmpị iko mba Afrịka?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ha nwechara ọpụpụ edoghi anya n'ihu ụwa, olileanya e nwere n'ebe Super Eagles nọ adaala dịka ndị mmadụ na-eche na ha agaghị emejuputa anya n'asọmpị ikomba Afrịka.
Olileanya si n'aka ndị nso dị obere n'agbanyeghi akụkọ 'Lets Do It Again' nke NFF na-eme na soshal midia iji wulite nkwado nke ndị Super Eagles n'Ivory Coast ebe ha ga-ezute mba ahụ, mba Guinea Bissau, Equatorial Guinea n'otu A.
Ha enwereike ime ka ndị mmadụ chefuo mbido ọjọọ ha n'itozu asọmpị ikombaụwa?
"Anyị agabigala ụfọdụ ọgbatuhie n'oge gara aga" ka onye ndu Moses Simon dere n'ozi n'akara X ya mgbe ha zutechara Zimbabwe.
"Ugbua bụ oge ịche echiche ma bilikwa n'ike."
Nlaghachite nke Osimhen a na-atụ anya kwesiri iwulite mmụọ ndị mmadụ mgbe nwa afọ ahụ dị afọ 24 bụ onye nyekarịrị goolu n'Afcon ebe o nyere goolu iri gbakee na mmerụ ahụ ya.
Ebe e ji kpakpando Napoli ahụ n'aka, Udi kwenyere na Naịjirịa nwere ike ị nweta kwa otu mmeri tinyere mmeri atọ ha ma kwudo kwa Peseiro n'azụ ugbua.
Chi ka bụ ụtụtụ iji chụ onye nkuzi otu ahụ n'ọrụ maka na ndị otu ya gbara onye laba onye laba n'asọmpị abụọ." ka o kwuru.
Anyị ka kwụ chịm n'asọmpị abụọ ndị a. N'Ivory Coast, ihe ọbụla nwereike ịme."








