Nigeria Election 2023: PDP na APC aghasaala Naịjirịa - Chukwuemeka Ezeife
Dịka ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na-akpudebe nso, Chukwuemeka Ezeife, bụ aka chịburu Anambra steei, ekwuola na nzọpụta Naịjirịa agaghị esi n'aka otu 'Peoples Democratic Party' (PDP) maọbụ otu 'All Progressives Congress' (APC).
Ezeife, onye e ji Ọkwadike mara, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a.
O kwuru na APC na PDP egosila na ha abụọ bụ otu ihe; "ha abụọ bụ babasị".
Okwadike kwuru nke a dịka kepukepu na-efegharị na ndị PDP emegheela ụzọ ha ka onye ọbụla si mpaghara ọbụla na Naịjirịa, nwere mmasị iso zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, bịa tinye akwụkwọ.
Cheta na a na-echebu na Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 nwere ike isi mpaghara Ndịda, n'ihi na Onyeisiala ugbua bụ Muhammadu Buhari si mpaghara Ugwu.
Nke a bụ maka na pati abụọ kachasị na Naịjirịa bụ APC na PDP na-eyigharị mpaghara ebe ha na-esi ahọpụta ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa; a na-akpọ nke a 'zoning' na bekee.
Nke a pụtara na ọkwa Onyeisiala gaara ndị Ugwu n'oge a, ọ ga-agara ndị Ndịda n'oge nke ọzọ.
Otu APC ekwuola na ọ bụ na mpaghara Ndịda ka ha ga-esi ahọpụta onye ga-azọ ọkwa Onyeisiala na 2023.
Mana PDP ekwubeghị nke ha kpọmkwem, kama akụkọ na-ekwu na ha ekwuola ka onye ọbụla nwere mmasị bịa soro zọọ.
Okwadike kwuru na ihe a ndị PDP mere jọgburu onwe ya maka na o doro anya na ọ bụ ndị Igbo ka ọkwa Onyeisiala ruru na 2023.
"Naanị ọnwa isii ka onye Igbo nọrọla n'isi ọchịchị na Naịjirịa; ya bụ Aguiyi Ironsi n'oge ndị agha," o kwuru.
"Na nke ndị Yoruba, Obasanjo chịrị afọ atọ dịka onye agha, bịakwa chịa afọ asatọ dịka onye nkịtị."
"Osinbajo bụkwa osote Onyeisiala ugbua, ọ ga-anọ ya afọ asatọ."
"Ị gaa na South South, Jonathan chịrị afọ isii."
"Etu e si eme ọchịchị Naịjirịa bụ onye wepụ ibe ya ewere, ndị Ugwu wepụ, ndị Ndịda ewere."
"Ndị o ruuru ugbua bụ ndị Ndịda, abịa na Ndịda ahụ, ọ bụ ndị Igbo ka o ruru."
"Kedụzi etu ọ ga-esi bụrụ ugbua o ruru ndị Igbo ka ndị PDP ga-asịzi onye gbata ya were?"
Okwadike kwuru na ihe nke a gosiri bụ na "Chineke na-akwadoro anyị Naịjirịa ọhụrụ nke na-abụghị PDP maọbụ APC".
"Chineke egosila anyị akara anyị ga-eji mara na otu abụọ a abụghị ya."
Okwadike gara n'ihu kwuo na ya nwere nkwenye siri ike na onye Igbo ga-ewere ọchịchị Naịjirịa n'afọ 2023.
O kwukwara na ọ bụ mgbe onye Igbo ga-abụ Onyeisiala ka Naịjirịa ga-ahụ ihe dị iche na mmepe obodo.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Nnamdi Agbanelo, na Chukwudi Okereke.


