Kingsley Moghalu: Ndị kwe ndị ekweghi so na-ebute mpụ na Naịjiria

Aha onyonyo, 'Ihe anyị chọrọ ugbua bụ 'kedụ onye ga-arụ ọrụ a?' - Kingsley Moghalu

Kingsley Boseh Ayodele Moghalu bụ nwafọ Igbo bụ onye Nnewi, n’Anambra steeti, a mụrụ na Legọs steeti.

Ọ ruru ọrụ na United Nations nakwa ụloakụ kachasị nke Naịjiria, dịka osote onye isi.

Ọ rụkwaala ọrụ n’ọnọdụ dị iche iche na mba ofesi.

Kingsley na-apụta ọzọ iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n’ọkoloto pati African Democratic Congress (ADC) n'afọ 2023.

O sobu cheere Buhari aka mgba na 2019 mgbe ha zọburu mbụ.

Na mkparịtaụka a ya na BBC Igbo nwere, Moghalu tinyere ọnụ n'ọtụtụ ihe dị iche iche nke na-akpagbu obodo Naịjirịa, ihe na-ebute ha na ụzọ ọ ga-esi memilaa ha.

O kwuru maka mpụ na nrụrụaka, enweghị ezi nchekwa, nsogbu dị n’agụmakwụkwọ na ihe ndị ọzọ.

Ọ sị na nkewa so n'ihe na-ebute mpụ na Naịjiria.

Gee ya ntị ka ọ tụnye gị azụ.