'Kwụsị itinye mmanụ n'ofe egusi'

Ebe foto si, Ntanta Soups
Egusi bụ ezigbo nri si na mkpụrụ ihe a na-akpọ 'melon seeds' na Bekee.
Ndị Naịjirịa na ndị mpaghara sahel n'Afrịka ejighi egusi egwu egwu maka na ha na-eji ya emepụta ọtụtụ nrị dị icheiche.
Na Naịjirịa kpọmkwem, e ji egwusi esi ofe nke e nwezirike ịkpọ ofe zuru Naịjirịa niile ọnụ maka na ọ bụ otu ofe agbụrụ niile na Naịjirịa na-esi.
E sichaa egwusi ọ bụrụ soro m mịchaa aka.
Mana egusi ọ bụ nri na-edozi ahụ?
BBC Igbo na otu onye ọkachamara n'okwu gbasara nri mmadụ na-eri na ihe ọ na-enye n'ahụ bụ Harafat Boluwatife Busari nwere mkparịtụka banyere egusi.
Nwada Busari kwuru na egusi bụ nri dị mma nke ukwu onye ọbụla nwereike iri. O weturu obi n'ala kọwara anyị ihe ndị dịgasi n'egwusi dịka - abụba, protin, faịba, mgbadoume, kalshum, zinc, magnessium na ihe ndị ọzọ.
Busari kwuru na abụba dị n'egwusi karịrị ọkara egwusi n'onwe ya. N'okwu ya, "egwusi nwere mmanụ na abụba 52%, protin 28%, faịba 2.7% na obere mgbadume" Ihe ndị ọzọ o nwere dị ntakịrị dịka; kalshum, maganeshum na zinc.
Tupu ntị gị ekelie, Busari kwukwara na abụba dị n'egwusi bụ ezigbo abụba.
N'okwu ya; "egusi bụ nri dị mma nke ukwuu mana ọ dị mkpa ka onye na-eri ya jiri nwayọọ belata aka maka na ọ na-ebu mmadụ ibu."

Ebe foto si, Ntanta foods
Kedụ ndị na-ekwesighi iri egusi?
"Egwusi enweghi nsogbu ọbụla, ebe nsogbu dị bụ etu e siri sie ya na ugboro ole mmadụ na-eri ya", dịka Busari siri kwuo.
O kwuru na onye ọbụla nwereike iri egusi mana onye na-eri egwusi cheta na ihe karịrị ọkara ya bụ naanị mmanụ.
Nke a pụtara na onye rie ya o sere aka ma si etinyekwa ya mmanụ ọzọ ma a na-esi ya.
N'okwu ya, "itinye mmanụ n'egwusị dịka ikwanye mmanụ n'ime mmanụ sie ya" mana ọ bụrụ na i tinyeghi ya mmanụ ma na-erighi ya oge niile, nsogbu adịghị.
Busarị dọrọ aka na ntị ka ndị niile nwere ọrịa obi nke dị njọọ belata aka n'iri egusi ma ghara itinye ya mmanụ na-esi ya.








