Enweghi m ike ịrịọ gọọmentị Naịjirịa arịrịọ ka ha tọhapụ m – Nnmadi Kanu

Onyendu Ipob, Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu bụ onyendu otu chọrọ mwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na ọ gaghị arịọ gọọmentị Naịjirịa arịrịọ ka ha tọhapụ site na mkpọrọ.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor wepụtara mgbe ndị ha gara ileta ya n’ụlọ mkpọrọ ndị Department of State Services (DSS) n’ụbọchị Mọnde 28 Ọgọọst, 2023.

Ejiofor kwuru na Kanu kwuru hoohaa “Ị rịọ gọọmentị arịọrịọ ka ha tọhapụ m bụ ite nna anyị Mbazulike Amaechi nwụrụ anwụ unyi n’ihu maka mgbọ niile ọ gbara si n’Ọwụwa Anyanwụ gaa Abuja ugboro ugboro, rịọ gọọmentị ka a tọhapụ m dịka arịọrịọ ikpeazụ n’ọnwụ ya mana ha gbara isi akwara jụụ.”

Kanu kwuru na o kwesighi ịrịọ gọọmenti arịrịọ ka a tọhapụ ya maka na ụlọikpe mkpegharị adịla mbụ kwubie okwu n’isi ya na nke ahụ dịkwa ire rute ugbua.

O kwuru na ihe dịirị onye ọbụla ime ugbua bụ ka a kpọkuo ụlọikpe kachasị ka ha hiwe ụbọchị ha ga-eleba anya n’ikpe ya nke gọọmentị etiti kpụpụrụ n’ụlọikpe ahụ dịka ọ dị n’iwu na-achị ụlọikpe kachasị.

Ihe ndị ọzọ pụtara na njem nleta ahụ

Mgbe mbụ ndị DSS kpụpụrụ Kanu n'ụlọikpe n'afọ 2021

Ebe foto si, Screen shot

Ndị ọkaiwu Kanu kwuru na isi njem ha mere bụ maka ileba anya n’ihe banyere ahụike Nnamdi Kanu nakwa ndị DSS jụrụ iwepụta akwụkwọ nyocha ahụike ya.

Nke a mere Mike Ozekhome bụ onyeisi ndị ọkaiwu Kanu jiri degara ọkaikpe nke ụlọikpe dị n’Abuja akwụkwọ sị ka ọ họpụta onye ọkaiwu ‘migistrate’ ga-aga nyocha ọnọdụ ụlọ mkpọro bụ ebe ndị DSS jichiri Kanu kamgbe ọnwa Juun 2021.

Cheta na gọọmenti Naịjirịa nwuchiri Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa n’afọ 2021. Ha kpụpụrụ ya n’ụlọikpe n’ọnụ ebubo iri na ise gụnyere ịgbasa ozi nwere ike ibute ọgbaghara na Redio Biafra.

Ụlọikpe mkpegharị dị n’Abuja kachapụrụ ebubo ndị ahụ ma sị na aka Kanu dị ọcha n’ụbọchị 13 Ọktoba afọ 2022, mana gọọmentị etiti buuru ikpe ahụ gawa n’ụlọikpe kachasị na Naịjirịa.

Akwụkwọ o degaara ụlọikpe Abuja

Ebe foto si, Mike Ozekhome

Akwụkwọ o degaara ụlọikpe Abuja

Ebe foto si, Mike Ozekhome

Akwụkwọ o degaara ụlọikpe Abuja

Ebe foto si, Mike Ozekhome