Nnamdi Kanu a chụrụ Mike Ozekhome, Ifeanyi Ejiofor na ndị Okaiwu ya ndị ọzọ? - Lee ihe anyị ma

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu

Kemgbe ụtụtụ Fraide ka akụkọ na-efegharị na Nnamdi Kanu achụọla Mike Ozekhome na ndị ọzọ so na-ekwuchitere ọnụ ya n' Ụlọikpe dị ụkwụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ maka na ha enweghị ike ime ka o nwere onwe ya si n' ụlọmkpọrọ ndị uweojii nzuzo bụ DSS were pụta.

Mana lee ihe BBC Igbo chọpụtala

Ndị okaiwu a ma-ama na arụrụ Nnamdi Kanu nakwa ndị otu IPOB ọrụ dịka okaiwu Ifeanyi Ejiofor nakwa Okaiwu Aloy Ejimakor tinyere ọnụ n' okwu ahụ.

Okaiwu Ifeanyi Ejiofor kwuru na ọ bụghị ihe kwesịrị ịgbagwoju mmadụ anya, maọbụ ihe ndị mmadụ ga-ahụ ka ihe akụkọ dị iche na Nnamdi Kanu kpọta onye ọkaiwu ọhụrụ ka ọ nọchịe anya ndị nke nọ anọ.

Ejiofor sịrị, "N' obi m, ihe kwesịrị ị na-ere ndị mmadụ ọkụ n' obi bụ etu ndị ụlọikpe dị elu na Naịjiria siri egbu oge iweputa akwụkwọ ha jiri kpebie ikpe na ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba, 2023, nke na-egbu ụlọikpe kwesịrị ileba anya n' okwu ya n'oge.

"Ihe ndị a kachasị mkpa karịa na Nnamdi Kanu kpọtara onye ọkaiwu ọhụrụ ga- anọchịtere ya na ụlọikpe maọbụ na ọ kpọtaghi. "

Ọ kwuru na ọ bụ Nnamdi Kanu ka ọ dịrị ịma ihe ọ chọrọ, mgbe ọ ga-akpọta onye ọkaiwu ọhụrụ nakwa mgbe ọ ga-achụ ya.

Ọ gbakwunyere na ya enweghị ikike ịgwa anyị na ọ bụ eziokwu na achụrụ Mike Ozekhome dịka Okaiwu Nnamdi Kanu.

Aka m na-arụrụ Kanu na Ipob ọrụ - Ejiofor

Okaiwu Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor /Facebook

Ifeanyi Ejiofor gara n'ihu kwuo na ya abụghị naanị okaiwu Nnandi Kanu, na ọrụ ya gbakwunyere ịbụ okaiwu ndị IPOB kemgbe afọ 2015 ruo ugbua.

O kwuru na tata ka ya sịrị na ụlọikpe dị n' Abuja apụta ebe ya na-eme ka mmadụ 100 bụ ndị ọrụ nchekwa kpụrụ n' Uga, Okpuru Ọchichi Aguata dị na Anambara Steeti bụ ndị a na-ebo ebubo na bụ ndị n- eyi mmadụ egwu.

Aka m na-arụ ọrụ m dịka ọkaiwu Nnamdi Kanu- Ejimakor

Aloy Ejimakor

Okaiwu Aloy Ejimakor mgbe ya na onye ntaakụkọ anyị kwuru okwu sịrị na achụghị ya onwe ya dịka Ọkaiwu Nnamdi Kanu.

Ọ kọwara na o tebeghi aka ya gachara hụ Nnamdi Kanu n'ebe ndị DSS dobere ya ha abụọ akpa ezigbo nkata.

Mgbe Ejimakor na onye ntaakụkọ anyị na-akparita ụka, o kwuru na ya abụghị SAN nke a na-arụ aka na Nnamdi Kanu napụrụ ọrụ.

"Go sị m e be edere aha m na edemede ahụ."

Ejimakor gara n'ihu gosi onye ntaakụkọ anyị ọrụ ọhụrụ dị iche iche ọ rụrụ metụtara Nnamdi Kanu.

Mana mgbe onye ntaakụkọ anyị juru ya, ma o so na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu chụrụ n' ọrụ, ọ sị, "were uche gị gbakọọ nke bụ eziokwu".

N' okwu gbasara Mike Ozekhome, Ejimakor, onye jụrụ ịsa okwu ahụ kpọmkwem, gwara onye ntaakụkọ anyị ya kpọọ Ozekhome n' ekwenti.