Amarachi Ugochukwu: Etu e si hụ ozu nwagbọghọ na-arụ n'ụlọakụ a na-enyo kwụgburu onwe ya na Legọs Steeti

Ebe foto si, Amarachi Ugochi/ Linkedin
Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na a ga-eme nnyocha ozu nwagbọghọ a na-enyo kwụgburu onwe ya n'ụlọakụ ebe ọ na-arụ na Legọs na nsonso a.
N'abalị asatọ nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2028, a hụrụ ozu Amarachi Ugochukwu gbara afọ 32 n'ụlọmposi ụlọakụ anyị achọghị ịkpọ aha ya bụ ebe ọ na-arụ ọrụ n'Ikorodu dị Legọs ma hụ mkpọ nsi nakwa akwụkwọ ozi o dere dota.
Ndị ọrụ ibe ya nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ d ika ekwentị ọ hapụrụ n'oche ọrụ ya kụkatara ọ zaghị ya, ka e jichiri chọwa ya ma hụta na e si n'ime gbachie ụlọmposi ahụ, a gbakara ụzọ ma hụ ebe nwa ada ahụ nke ọrụ ya bụ ịkpọtara ụlọakụ ahụ ndịahịa ka ọ tọgbọ n'ala n'ozu.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Lagọs Steeti bụ Benjamin Hundeyin onye gwara BBC na ya bụ akụkọ "bụ eziokwu" .
Ozi mgbasaozi Hundeyin mechara wepụta kwuru sị, "Mgbe a kpọrọ dọkịta ga-ele ya ahụ, ọ chọpụtara na Amarachi anwụọla.
" E burula ozu ya gaa dọnye n'ụlọozu dị na Ikorodu Legọs, ebe a ga nọ mee ozu ya nnyocha pụrụ iche nke ndị beeke kpọrọ 'Autopsy'."
Gịnị ka a na-eche bụ obi Amarachi?
Dịka akụkọ ọnwụ ya malitere iwu na soshal midia, ọtụtụ ndị ma ya na-akọwapụla na na ọ bụ 'nwata na-agba mbọ ma bụụkwa onye na-enwe ihu ọchị oge ọbụla."
Nke mere ka ụfodụ ndị mmadụ ji ajụ ihe dagidere ya dunyere ya n'ụdị iwepụ ndụ onwe ya.
Akwụkwọ edemede ahụrụ n'akụkụ ozu ya rụtụrụ aka na ọ bụ ihe isi ike nakwa enwelighị ike mezuo ihe a chọrọ n'aka ya dịka onye ọrụ n nke Bekee kpọrọ , target.
N'ozi ahụ ọ gara n'ihu rịọ nne na nna ya mgbaghara.
Edemede ahụ sịrị, "O nweghị ihe na-aga aga na ndụ m, obodo kpọrọ akpọ"
"Ụbụrụ m enweghị ihe ọ na-aghọtazi."
"Anaghị m enwetazu ihe a chọro n'aka m."
N'afọ ole na ole gara aga, ịkwụ ụdọ malitere iri elu na Naijiria n'ihi ihe isi ike na ndakpọ akụnaụba.
Ihe isi ike kwesiri dịka oke ọnụahịa na enweghị ọrụ kawanyela njọ na Naijiria kemgbe ọnwa Juun afọ 2023 dịka ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu wepụrụ ego nkwụbilata ego mmanụ ụgbọala nke Bekee kpọrọ 'fuel subsidy'.











