Etu nwa TB Joshua Ajoke si runye 'nna' ya aka n'anya maka ebubo ndi e boro ya

Ajoke
    • Onye dere ya, Charlie Northcott na Helen Spooner
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Africa Eye

BBC ekpughela etu TB Joshua bụ onye nwe ụka ukwu a ma ama bụ nke e boro ebubo ọtụtụ ihe aruruala si megbuo ma kechie nwa ya tupu a chụpụ ya n'ụlọ na Legọs ebe ọ gbazi aka. 

"Nna m na-atụ ụjọ, mgbe niile. Ọ na-atụ ụjọ na mmadụ ka ekwupụta okwu otu ụbọchị" bụ ihe Ajoke - onye bu ụzọ tọsaa nkata ma kpọọ BBC gbasara ihe na-eme n'ụlọụka nna ya bụ SCOAN.

Joshua nwụrụ n'afọ 2021 ka ọ dị afo 57 bụ onye e boro ebubo gbasara mmetọ na mmegbu dị icheiche gafere afọ 20.

Ugbua ọ dị afọ 27, Ajoke na-ebi ndụ na nzuzo ma gbanwee aha ya wepu Joshua. BBC agaghị eweputa aha ọhụrụ ya.

O nwechaghi ihe a ma maka nne mụrụ Ajoke, bụ onye e cheere bụ otu onye ụka Joshua. Ajoke si na ọ bụ nwunye Joshua a kpọrọ Evelyn bụ onye zụrụ ya kemgbe o nwereike icheta. 

Ruo oge o di afo asaa, Ajoke kwuru na ntolite ya bu ihe onu ebe ya na-eso ezinaul Joshua aga njem nleghari anya n'ebe dika Dubai.

Mana otu ubochi, ihe niile gbanwere. Ha kwusiri ya akwukwo maka otu okwu ebe otu onye ntaakuko dere otu akuko kowara ya dika nwa TB Joshua muru n'ezi. Oge ahu ka e wepuru ya n'uloakwukwo kporo ya gaa na mbara SCOAN na Legos.

"Akporo m tinye n'ime ulo ndi nsonso. Eweputaghi m onwe ibu onye nsonso. Ha manyere m sonye," ka o kwuru.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Until di age of seven, Ajoke say she bin get a very happy childhood, she bin dey go on holiday with di Joshua family to places like Dubai.

Ndi nsonso bu otu ndi tinyere uchu na-eso TB Joshua ma binyere ya n'ime ulouka. Ha si mba di icheiche n'uwa bia, ufodu n'ime ha ebiela n'ime ulouka ahu otutu afo.

Ha bi n'okpuru iwu tara akpu: a naghi ekwe ha hie ura ihe kariri ufodu elekere n'otu oge, a machiri ha inwe ekwenti nke ha maobu ileta obaozi ha n'intaneti, a manyekwara ha ikpo TB Joshia "Nna".

Di disciples be one ogbonge group of dedicated followers wey serve TB Joshua and live with am inside di di church. Dem come from all over di world, many stay for di compound for decades.

"A saala ndi nsonso ahu isi ma ha na-enyekwa ya aka. Mmadu niile na-akpa agwa site na iwu e nyere aha - ka zombi. O nweghi onye na-enyocha ihe obula maobu aju ase," dika o siri kwuo.

Ajoke bu naani nwata agaghi eso iwu ndi ahu ka ndi nsonso ndi ozo: o kweghi eguzo oto oge pasto ahu batara n'ime ulo ma kpochie nti banyere iwu ihi ura.

O techaghi aka a malite imegbu ya.

O techaghi aka oge o biarutere, oge o di afo asaa, o chetara na a na-eti ya ihe maka na o nyuru mamiri n'akwa ma mee ya ka o gagharia na mbara niile nyara ederede na-ekwu "ana m anyu mamiri n'kwa".

"Otu oge n'ogbako ndi nsonso, o (Joshua) kwuru na onye obula nwereike iti ya ihe. Onye obula n'ime ogige ebe obibi umunwaanyi nwereike iti ya ihe ma echetara m etu ndi mmadu si na-ama ya ura ma ha na-agafe," dika o siri kwuo.

Malite oge Ajoke gbara ukwu n'ime ogige ulouka ahu di na gburugburu Ikotu, a na-akpaso ya agwa ka o bu osu.

"O di ka a kporo ya na o bu ohu ezenaulo ahu" kwuru Rae si mba Briten bu onye biri n'ime ulouka ahu afo 12 ka onye nsonso. Dika ndi nsonso ndi ozo BBC gbara ajujuonu, o kwuru na o bu naani aha mbu ya ka o ga-aza.

Rae chetara otu oge Ajoke hiri ura karia, Joshua etie ya mkpu n'isi ka o kulie.

Onye nsonso ozo kporo ya gaa ebe a na-asa ahu "jiri otu waya oku latrik pia ya ma gbanye mmiri oku", ka o siri kwuo.

Ka o na-echeta ihe ahu mere, Aoke kwuru: "Ano m na-eti mkpu n'oke olu ha ahapu mmiri ahu ka o na-awusa m n'isi ogologo oge."

Udi mmegbu ahu akwusighi akwusi, ka o kwuru.

"Anyi na-ekwu maka mmegbu af kwuru afo. Mmegbu di egwu. Ndu m dika nwata si n'afo nwaanyi ozo bu ihe ima aka n'ihu megide he niile o (TB Joshua) kwuru na ya kwunyere."

Mmegbu ahu riri ibe ya elu gaa ogogo ozo oge o gbara afo 17 oge o mara nna ya aka n'ihu maka "akuko ndid mmadu o huru gabigara mmeto na mwakpo aramara".

"Ahuru m ndi nsonso umunwaanyi ka ha na-agbago n'imeulo ya noo otutu oge. Ana m anu akuko dika: "udi ihe a mere, o choro iwakpo m.' Otutu ndi mmadu na-ekwu otu ihe ahu", ka o kwuru.

BBC gbara ihe ruru mmadu 25 bubu ndi nsonso ajujuonu - ndi si mba Briten, Naijiria, Saut Afrika, Gana, Namibia na Jamini - ha niile kwunyere otu mgbaama na ha natara mmeto na mwakpo n'aka ya.

"Enweghi m ike inatazi ya ozo. M gaa n'ime ulooru ya ubochi ahu. Ejiri m oke olu m tie mkpu si ya: 'Kedu ihe i ji eme ihe ndia? Gini kpatara i ji akpagbu umunwaanyi a niile?'

"Ihe niile dika ujo nwoke a apuola m n'anya. O gbaliri ile m anya ka m kwusi mana na ana m ele ya anya na mkpuru anya," o kwuru.

Emmanuel bu onye ulouka ahu afo 21 noro ihe ruru afo iri n'ime ogige ahu dika onye nsonso chetara ubochi ahu kpomkwem nke oma.

"O [RB Joshua] bu onye mbu malitere iti ya ihe...ndi ozo were tinye aka," ka o kwuru.

"O no na-ekwu: 'Legodi ihe o na-ekwu maka m? Agbanyeghi na a na-eti ya ihe, na-aku ya ihe, o na-ekwukwa ihe o na-ekwu."

"I bin don lost every single fear for dis man. E try to look me so I go back down, but I bin dey look into im eyes," she tok.

Emmanuel, wey be part of di church for 21 years and spend more dan a decade living in di compound as a disciple, remember dat day clearly.

"E [TB Joshua] be di first pesin wey start to dey hit her… den oda pipo bin join," e tok.

"E bin dey say: 'Can you imagine wetin she dey say about me?' Even as much as dem dey hit her, beat her, she bin still dey say di same thing."

TB Joshua
Nkọwa foto, Ajoke kwuru na o kwuru itu nna y egwu n'afo 17

Ajoke kwuru na a kpupuru ya n'ime ulooru ya tinye ya n'ime otu imeulo dipuru adipu n'ebe ndi ulouka ndi ozo no, ebe o bi naani ya o nweghi onye na-atupuru ya onu ruo otu afo.

Nke a bu udi ntaramahuhu di na Scoan a na-akpo "adaba" nke Rae gabigakwara afo abuo.

N'ime oge a, Ajoke kwuru na a na-eji igwe iga maobu mgbanukwu apia ya kwa ubochi.

"O turu m n'anya etu m siri di ndu gafee ubochi ndi ahu. Agaghi m akwuli oto otutu ubochi ma e tichaa m ihe ahu. Anaghi m asali ahu. O na-agbasi mbo ike otutu oge ikwusi ndi mmadu ige m nti."

Otu ubochi oge Ajoke di afo 19, e duuru ya puo n'ihu uzo ulouka ahu hapu ya. A gwara ndi nchekwa ulouka ahu bu egbe ka ha ghara ikwe ya ibata n'ime ulouka ahu ozo. Nke a mere afo isii tupu nna ya anwuo.

"Ahuziri m onwe, enwghizi m ebe obibi. O nweghi onye m nwereike ikpo. O nweghi onye ga-ekweta m. O nweghi ihe kwadoro m maka udo ndu ahu," dika o siri kwuo.

Dika nwata nwaanyi na-etolite etolite na-ejighi ego, Ajoke mere ihe o nwereike ime iji di ndu ebe o biri otutu afo n'ime ogbe.

Ajoke buru uzo kpoturu ndi BBC n'afo 2019 oge o lechara otu nyocha BBC Africa Eye - etu a ka nyocha a BBC mere banyere mmegbu na mmeto na-eme n'ime Scoan siri malite.

BBC kpoturu ndi Scoan maka ihe ha choputara n'ime nyocha a. Ha azaghachighi ha, mana ha goro banyere ebubo ndi mbu e boro TB Josua.

"Iweputa ebubo na-agbadoghi ukwu ebe obula megide Onye amuma TB Joshua abughi ihe ohuru...O nweghi ihe di okpurukpu e gosiri kwadoro ebubo ndi a," ka ha kwuru.

Site n'enyemaka ufodu ndi bubu ndi nsonso na ufodu ndi enyi, Ajoke gbaliri puta n'ime ogbe n'oge na-etechabeghi aka. Mana o danyela n'ime nsogbu na-emetuta echiche ya ufodu oge.

Agbanyeghi ihe niile o gabigarala, o gbara isi akwara foro ntutu taa na ya ga-egosiriri nke bu eziokwu banyere nna ya.

"Oge niile ha tiri m ihe, oge niile ha mere m akaja, o na-echetara m na o nwere nsogbu di n'ime oru a," ka o kwuru.

Ndi bubu ndi nsonso gwara BBC na ka ha huru ka Ajoke guzoro oto megide nwoke ahu mere ha jiri na-ajuzi onwe ha asa banyere okwukwe ha n'ebe TB Joshua no.

"O debere anyi niile ka ohu, onodu ohu di egwu," ka Emmanuel kwuru.

"Ajoke nwere obi nwee nkwuwa okwu ima ya aka. Ana m ahuta ya ka dike."

Eziokwu ka Ajoke kwuru bu ihe kacha ya mkpa: "ihe niile fulari m, ebe obibi m, ezinaulo m mana o bu eziokwu bu ihe kacha m mkpa."

"Ma ya burughala na ndu di m n'ime, aga m na-achuso eziokwu ahu ruo na ngwucha".

Ebumnobi y bu na otu ubochi, o ga-agaghachi n'uloakwukwo guchaa akwukwo ya nke e gbubiri n'etiti.

Nyocha nke Africa Eye a bu CHarlie Northcott, Helen Spooner, Maggie Adresen, Yemisi Adegoke na Ines Ward mere ya.

Disciples: Ihe dị egwu mere n'ime ụlọụka TB Joshua

TB Joshua

Ebe foto si, Getty Images

TB Joshua bụbu onyeisi otu ụlọụka kachasị n'ụwa niile manyere aka na mpụ dị icheiche dịka otu nyocha nke BBC mere gosiri.

Akụkọ akaebe si n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ pụta kwuru na ikekwe Joshu na-emetọ ụmụ agbọghọ si mba ụwa dị iche iche kwa izu n'ime ihe ruru afọ iri abụọ.

Ịdọakanantị: Akụkọ a metụtara okwu mmegbu, idinan'ike nakwa mmerụ onwe ahụ.

N'afọ 2002, ka otu nwaanyị a na-akpọ Rae furu efu.

Mgbe ikpeazụ a hụrụ ya, ọ nọ na Mahadum Brighton ebe ọ na-agụ "Graphic design". Rae mara mma ma bụrụ onye a ma ama.

"Ọ dị m ka ọ nwụọla mana enweghị m ike iruru ya uju" bụ ihe enyi ya mgbe ahụ akpọrọ Carla kwuru.

Ọtụtụ izu tupu nke a e mee, ya na Rae gara Naijiria ịchọta otu nwoke a sị ji aka agwọ ndị mmadụ ọrịa. Ọ bụ onye ukochukwu nwere afọ ọnụ ojii na-eyi uwe ọcha. Aha ya bụ TB Joshua ndị nso ya na-akpọ ya "Onye amụma"

Rae na Carla kwadoro ịga ụlọụka ahụ bụ Synagogue Church of All Nations [Scoan] naanị otu izu mana Rae anaghị be ya ọzọ. Ọ kwara gawa be Joshua.

"A hapụrụ m ya ebe ahụ, agaghị m a gbaghara onwe m" ka Carla kwuru dịka ọ na-ebe akwa.

ulouka scoan

Ebe foto si, bbc

Nkọwa foto, Etu ime ulouka TB Joshua si di

Ụlọụka ahụ dịka otu nke Goth dị n'Ikotun dị na Legọs. 

Joshua bụ onye haziri ụlọ ogogo iri na abụọ dị ebe ahụ bụ ebe ya na ndị nsọ ya bi. 

Ọ rụrụ ụzọ atọ e ji abanye n'ime mkpuru ya, ụzọ atọ e ji abanye ime ụlọ nke yanwa. Otu ime ụlọ ekpere nke enyo juru na ya nakwa ebe akpọrọ "ụlọọgwụ" dị n'ala ebe ahụ. 

Anyị gbara mmadụ iri abụọ na ise ajụjụ ọnụ bụ ndị biri n'ime ebe ahụ. Ha kọọ akụkọ ihe dị egwu na-eme n'ime ebe ahụ dịka agbanari go ụwa n'onwe ya. 

N'ime ụmụ nwanyị ndị agbara ajụjụ ọnụ, ụfọdụ sị na Joshua metọrọ ha, ụfọdụ si na o na-edina ha n'ike ebe ndị ọzọ kwuru na ọ manyere ha tepu afọ ime mgbe ha tụrụ ime. 

carla na rae

Ebe foto si, Carla strut

Nkọwa foto, Carla (aka ekpe) na Rae sị na obi gbawara ya mgbe ọyị ya nwaanyị anataghị

Taa, Rae alaghachila Ingland ebe obi n'otu ime obodo. Ọ na-achi ọchị mana o nwere ihe edochaghi anya maka ya.

"Na mpụta ihe niile dị mma mana ezughi m ezu" ka o kwuru.

Mgbe Rae na-aza ajụjụ maka afọ kwuru afọ ndị o biri na Legọs, ọ na-ejisi onwe ya ike. Ụfọdụ oge, ịhụ na ihu ya gbanwere. O biro afọ 12 n'ụlọ Joshua.

"Akụkọ dịka akụkọ na-eyi egwu, ọ dịka ihe onyonyo, mana ọ bụ eziokwu".

Nyocha a were afọ abụọ bụkwa nke ihe karịrị ndị ntaakụkọ BBC 15 n'ala atọ jikọrọ aka mee. Ngalaba mbaụwa dị icheiche gụnyere Open Democracy binyere aka na ya.

Ha kpokotara ihe onyonyo ndị ochie, akwụkwọ ndekọ nakwa elekere kwuru elekere ebe agbara ndị mmadụ ajụjụ ọnụ iji chọpụta akụkọ Rae na ndị ọzọ.

Ihe karịrị mmadụ 25 si mba Briten, Naịjirịa, Gana, Amerịka, Jamini na Saụt Afrịka gbara akaebe maka ihe ndụ dị ka ya be Joshua ka nke kachasị dị ọhụrụ si afọ 2019.

Ụlọụka Scoan jụrụ ịsa ebubo ndị e boro ha mana ha kwuru na ebubo ndị ochie enweghi isi na ọdụ.

Ndị na-agabu ụka ahụ ochie kwuru na ha anwabuola ikwuputa okwu mana Scoan machiri ikwu okwu maọbụ katọọ ha. Mmadụ abụọ si na awakporo ha.

TB Joshua

Ebe foto si, Getty Images