Etu ịchị ọchị si bụrụ ọgwọ m n’ọrịa

Ebe foto si, Thinkstock
Ịchị ọchị so n’ukpuru etu e si kee mmadụ. Ụmụaka a ka ku n’aka na-achị ma egwusa ha egwu.
Nnyocha Sayensi egosila na ịchị ọchị nwere ọtụtụ uru nke gụnyere imetụta ahụike mmadụ n’ụzọ ọma.
Otu onye ọkachamara n’ọrụ ahụike nke metụtara akparamagwa ndị mmadụ bụ Dọkịnta Leonard Okonkwo gwara BBC Igbo na ya bụ ihe bụ eziokwu.
Ọ kọwara na ọchị bụ ụzọ ndị mmadụ nwere ike isi enweta ọgwụgwọ ọkachasị n’ihe gbasara idajuo ume riri elu.
Okonkwo kọwara na ịchị ọchị so etu ndị mmadụ si eme ka nkwukọrịta nakwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya dị mfe ma na-aga were were.
Ọ kọwara na ndị mmadụ anaghị achịkarị ọchị ma sọsọ ha nọrọ mana ha na-aka achị ọchị n’oge mkparịtaụka ha ibe ha ọkachasị ndị bụ enyi ha.
Ndị mmadụ kacha achọ anọ nso ndị na-achị ọchị nke bụ na imesa ha enyị na-adị mfe.
Nnyocha nagalaba sanyesị na-ahụ maka agwa ndị mmadụ kwuru na ndị mmadụ na-achị ọchị n’oge mkparịtaụka iji gosi na ha kwenyere ihe a na-ekwu maọbụ na ndị na-agwa ha okwu abụghị ndị iro ha.
E nwere ụdịrị ịchị ọchị abụọ - Nke na-adapụta n’aka ya n’oge mkparịtaụka nakwa nke ndị ọzọ kpalịtere.
Ndị sayensị kwuru na ụfọdụ ụmụ anụmanụ na-achị ọchị n’oge egwurgwu dịka enwe, ọzọdịmgba nakwa ndị ọzọ nyiri ha.
Okonkwo kwuru ọchị na-efe efe nke bụ na mmadụ nọrọ n’akụkụ ndị na-achị nke ukwuu na ha ga-achịkwa ọchị nke ga-eme ka ahụike ha na-agbasi ike.

Ebe foto si, AFP
Kedụ etu ọchị si emetụta ahụike mmadụ?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dọkịnta Okonkwo kwuru na ịchị ọchị na-eme ka mmadụ mesapụ ahụ. Ọ kọwara na ọ bụ naanị oge mmadụ nọ n’oge ọṅụ ka onye ahụ na-achị ọchị.
Mana o kwukwara na mmadụ nwereike ime onwe ya ka ọchịa ọchị agbanyeghị na obi adịghị onye ahụ mmadụ.
“Mmadụ chịa ọchị n’oge dị etu a, ụbụrụ isi ya ga-eche na obi dị ya mma nwee zipụta ihe ga-eme ka ọ mesapụ ahụ ma mee ka mụọ ya dajụọ”.
O kwuru na ihe a nke Bekee na-akpọ ‘Endophines’ na-eme ka obi dị mmadụ mma.
O gara n’ihu kwuo “Ndị endophines na-akọ n’ahụ ha nwereike idaba n’ọnọdụ ahụike nke oke nnụda mmụọ bụ ihe Bekee na-akpọ ‘depression’”.
Endophines na-enyere aka dajụọ ahụ mgbu maọbụ nchekasị ahụ.
Otu onye na-arụ ọrụ ịkpaọchị bụ Funnybone gwara BBC Igbo “Ọ bụ ihe ọṅụ nyee na ọrụ m n’enye ndị mmadụ ọgwụgwọ n’efu”.
“Ọ bụghị mfe na okwu nkiti m na-ekwu maọbụ agwa njakarị m na-egosi n’ihe onyonye na-enyere ndị mmadụ aka nwee ndụ ogologo”.
Okonkwo gbara ama nke a ma kwuo “Ịchị ọchị na-enyere aka hụ na mmadụ kubara ume ndu ma kupuu ume”.
“Ịkuru ume ndụ so n’ụzọ mmadụ ga-esi nye onwe ya ọgwụgwụ, ọ na-akwado mmadụ ihi ụra nke ọma maa nyere ime ahụ ya aka n’ọtụtụ ụzọ”
Ọ gara n’ihu kwuo na nnyocha sanyesi na-ekwu na ịchị ọchị nwereike inyere aka gwọọ ọbara mgbali elu.
Otu ahụike ụwa bụ WHO n'ịchafụ ekwuola na ọbara mgbali elu so isi ihe na-akpatakarị ọnwụ ọnwụ ike.
Na mba ofesi, ndị nkuzi John Kounios nke mahadum Drexel University nakwa Mark Beeman nke mahadum Northwestern University mere nnyocha ma chọpụta na ịchị ọchị na-enyere ndị mmadụ aka nweta echiche ọhụrụ dị mma na mee ka ịtọpee agbụ tara akpụ n’echiche dị mfe.









