Supreme Court: Ụlọikpe Kachasị ebinyela aka na Fubara, Aliyu, Kefas bụ gọvanọ Rivas, Sokoto,Taraba steeti

Ebe foto si, Simi Fubara/Ahmed Aliyu /Agbu Kefas/Facebook
Ụlọikpe Kachasị dị n’Abuja ekpebiela na ọ bụ Siminialayi Fubara nke Rịvas Steeti, Ahmed Aliyu nke Sokoto Steeti, na Agbu Kefas nke Taraba meriri n’ezie na ntuliaka ọkwa Gọvanọ nke afọ 2023 na steeti ha dị iche iche.
N’ikpe nke ọkaikpe Jọstis Uwani Abba Aji du ndị ọkaikpe naọ ndị ọzọ were nye, Ọgbakọ ọkaikpe kwuru na akwụkwọ onye feere otu APC ọkọlọtọ na ntuliaka ahụ bụ Tonye gbaghar nke o ji agbagha mmeri Fubara achịtaghị aja ma kpụpụ ya.
N'otu aka ahụ, Jọstis Tijani Abubakar nke Ụlọikpe Kachasị kagburu akwụkwọ nke Saidu Umar gbara sị ka a chụpụ Ahmed Aliyu n'ọkwa Gọvanọ Sokoto steeti.

Ebe foto si, Siminialayi Fubara/Facebook
Jọstis Lawal Garba nke Ụlọikpe Kachasị kpụpụkwara akwụkwọ nke Ọkammụta Yahaya Sani nke otu 'New Nigeria People’s Party( NNPP), gbara iji gbagha mmeri Kefas na ntuliaka gọvanọ Taraba Steeti nke e mere n'afọ 2023 , sị n'akwụkwọ ya ezughị oke.

Ụlọikpe kachasị anọrọla n'ụlọikpe ụbọchị Fraịde kapịa mmeri aka na-achị Ogun Steeti bụ Dapo Abiodun nke pati All Progressive's Congress. Ha kachapụrụ mkpesa nke onye pati People's Democratic Party na onye zọrọ ọkwa gọvanọ ahụ na pati ha bụ Ladi Adebutu na-arịọ ka akachapụ nhọpụta Abiodun.
Ụlọikpe kachapụrụ ikpe ahụ na ọ chịtaghị aja.
N'otu aka ahụ, ụlọikpe kachasị kapịkwara mmeri Sheriff Oborevwori nke Peoples Democratic Party (PDP) ka gọvanọ Delta Steeti.
Ụlịkpe kachapụrụ mkpesa nke pati APC, SDP na Labour jikoro aka mee megide mmeri Oborevwori meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Maachi 2023.
Ọzọ dịka ibe ya bụ na ụlọikpe kachasị kapịkwara mmeri gọvanọ Uba Sani nke pati APC na Kaduna, Abdullahi Sani nke APC na Nasarawa na Nasir Idris nke Kebbi Steeti.
Cheta na nke a na-abịa ka ụlọikpe kachasị kapịkwara mmeri Alex Otti, Gọvanọ Sanwo Olu, Nwifuru na ndị ọzọ n'izu ka gara aga.

Supreme Court: Mkpu ọnụ dịka Otti, Nwifuru,Yusuf na gọvanọ ise ndị ọzọ jichiri ọkwa ha

Ebe foto si, Alex Otti/Babajide Sanw-Olu/Francisi Nwifuru
Mkpu ọnụ dara n' isiobodo Abịa, Ebonyi, Kano na steeti ise ndị ọzọ dịka Ụlọikpe Kachasị kpọpụtara Alex Otti, Francisi Nwifuru na Abba Kabiru Yusuf dịka ndị meriri n'ezie na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke afọ 2023.
Ọnụ ahụ kachasị kpọtụọ na Kano Steeti bụ ebe Ụlọikpe Mkpegharị napụburu Gọvanọ Yusuf ọkwa ya; Platu, ebe Ụlọikpe Mkpegharị napụburu Caleb Mutfwang ọkwa ya; nakwa Zamfara bụ ebe Ụlọikpe Mkpegharị napụburu Gọvanọ Dauda Lawal ọkwa ya bụ nke ha nwetara site na mmeri ha meirir na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere n'abalị 18 ọnwa Maachị afọ 2023.

Ọnụ kpọtụọ dịka Ụlọikpe Kachasị kpebiri taa na Gọvanọ Francis Nwifuru meriri na ntuliaka Gọvanọ n'ezie.
Ndị ọzọ Ụlọikpe Kachasị nyere mmeri gụnyere Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs; Gọvanọ Bala Mohammed nke Bauchi nakwa Gọvanọ Bassey Otu nke Krọs Rivas steeti.
Alex Otti emeriela n'Ụlọikpe Kachasị dịka Gọvanọ Abia

Ebe foto si, Alex Otti
Ụlọikpe Ojechaọgwụ ekpebiela na Alex Otti nke Labour Party bụ onye meriri na tuliaka ọkwa Govanọ Abia steeti na ntuliaka e mere n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Ụlọikpe ahụ kụchapụụ n'ụsọ akwụkwọ nke Okey Ahiwe nke PDP gbara iji gbaghaa mmeri Otti.
Ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ ụ Jọsis Abba Aji, kwuru na akwụkwọ Ahaiwe aa enweghị ume.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ụlọikpe Kachasị ekpebiela na ọ bụ Caleb Manasseh Mutfwang nke PDP merriri ezie na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Platu steeti e mere n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Ụlọikpe ahụ dowere n'ụsọ mkpebi nke ụlọikpe Mkpegharị nke chututu Mutfwang ma nye Nentawe Yilwatda nke APC mereri n'ihi etu e si họpụta ya.
Na mkpebi ya, ọkaikpe Jọstis Emmanuel Agim kwuru na ikpe Mutfwang wetara rijuru afọ.
Jọstis Agim kwuru na ọ bụghị ihe a na-adọ adọ na ọ bụ Komiti nke ndịisi pati ahụ hiwere họpụtara ka ọ zọ ọkwa ahụ n'aha pati ha, ya mere na Ụlọikpe Mkpegharị enweghị ikike ịnụ ikpe ahụ.
O kwukwara na APC bụ ndị gbara akwụkwọ ahụ abụghị ndị otu PDP bụ ndị okwu gbaasara onye ha họpụtara na pati gbasaara.
Ụlọikpe Ukwu nke Platu steeti nyeburu PDP iwu ka ha mee ntuliaka ọhụrụ na wọọdụ na ebe ndị ọzọ mana nke egbochighị ikike nke ndị isi pati nwere ịhazi ntuliaka imeụlọ pati ha.
N'okwu ahụ ekwesịghị ha ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka gee ya ma ya fọdụkwa ụlọikpe Mkpegharị.
Agim, onye kọwara nke dịka imebi usoro ikpe, gara n'ihu si, "Ndị ọrụ iwu teta n'ụra iji hụ na ha emeghị ka ugwu ọrụ a kpụọ n'ala."

Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook
Ụlọikpe Kachasị ekwubiela na ọ bụ aka na-achị Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru nke APC meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere na steeti ahụ n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Ụlọikpe Kachasị kwugidere na mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nke Ebonyi Steeti nyere nke kụpụrụ akwụkwọ Chukwuma Odii nke PDP gbara ji kagbuo nhọpụta a họpụtara Nwifuru na ntuliaka.
Ụlọikpe Kachasị kwuru na Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka enweghị ikke ikpe ikpe banyere ma Nwifuru o tozuru etozu ịzọ ọkwa ahụ.
n'okwu izipụ mpụtara ntuliaka, ụlọikpe kwuru na ndị wetara ikpe ahụ egosighị ihe akaebe na na-agbaghị ya n'ụzọ kwesịrị.
Ya mere ọkaikpe Jọstis Tijani Abubakar kpụpụrụ ikpe ahụ sị na o rijughị afọ.
Ụlọikpe Kachasị ekwechirila na mmeri Gọvanọ Yusuf nke Kano

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Ụlọikpe Kachasị ekpebiela na ọ bụ Gọvanọ Abba Kabir Yusuf nke otu New Nigeria Peoples Party (NNPP) meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Kano steeti e mere n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Ụlọikpe ahụ dowere n'ụsọ mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyeburu nke kagburu mmeri Yusuf na ntuliaka ahụ ma ya ya Nasiru Yusuf Gawuna nke APC.
Jọstis John Inyang Okoro, onye nyere mkpebi ahụ n'akwụkwọ nke Yusuf na otu NNPP wetara n'ụlọikpe ahụ kwuru na akwụkwọ ha gbara rijuru afọ.
Ngwa ngwa ụlọikpe nyere mkpebi ahụ, mkpu ọnụ dara na gburugburu ụlọikpe n'Abuja nakwa na Kano dịka ndị na-akwado Abba Yusuf na-enwe anụrị na mmeri ya n'ụlọikpe.
Supreme Court: Ụlọikpe Kachasị akụpụla akwụkwọ LP,PDP gbara Sanwo-Olu

Ụlọikpe Kachasị akụpụla akwụkwọ nke Otu PDP na LP wetara megide Gọvanọ Legos Steeti bụ Babajide Sanwo-Olu nke APC.
Ụlọikpe Kachasị kwụgidere na mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere n'akwụkwọ nke onye feere Labour Party ọkọlọtọ bụ Gbadebo Rhodes-Vivour na ogbo ya nke PDP bụ Abdul-Azeez Adediran bụ ndị guzo na Osote Sanwo-Olu bụ Kadri Obafemi Hamzat etozughị etozughị oge a zọrọ ọkwa ahụ were gbagharịa akwụkwọ.
Na mkpebi ya,Jọstis Mohammed Lawal Garba onye kpụụrụ akwụkwọ ha gbara sirị na o nweghị ume(lacked merit).
Akụkọ ka na-abịa
Taa ka Ụlọikpe Kachasị ga-enye mkpebi maka ntuliaka Govanọ Abia, Ebonyi, steeti isi ndị ọzọ

Ugo eberela na mgbagbu dịka Ụlọikpe Kachasị ga-enye mkpebi n'ikpe e kpegharịrị na ntuliaka gọvanọ afọ 2023 na steeti asatọ.
Ụlọikpe Kachasị ga-enye mkpebi n'ikpe metụtara Abia, Ebonyi,Legọs, Bauchi, Kano, Zamfara, Krọs Riva na Platu steeti.

Ka ọ dị ugbua, aka na-achị Ebonyi bụ Francis Nwifuru, ọgbo ya nke Kano bụ Abba Yusuf, nke Platu bụ Caleb Muftwang, nke Zamfara bụ Dauda Lawal,nke Bauchi bụ Bala Mohammed of Bauchi State, awụjiela n'ụlọikpe n'Abuja ha na ndị nkwado ha.
Ọgbọ tachiri atachi dịka ndị ọrụ nchekwa juru ebe nile gunyere n'ime nakwa gburugburu Ụlọikpe Kachasị, iji belata igwe nti mmadụ tụrụ ebe ahụ.












