Betta Edu: Etu o siri ruo Aso Rok na ihe ndi ozo i na-amaghi maka ya

Ebe foto si, Betta Edu
Kamgbe onwa Disemba afo 2023, minisita na-ahu maka ichu ubiam oso na Naijiria aha ya bu Betta Chimaobim Edu na-ewu maka ihe ojoo.
N'akuku ebe obula i tinyere isi na sosal midia na Naijiria nakwa na akwukwo mgbasaozi, ihe bu isi akuko taa bu etu onyeisiala TInubu siri kwusi minisita ya na-ahu maka ichu ubiam oso bu Betta Edu oru.
Onyeisiala kwusiri ya oru naani n'ime onwa isii a hoputara ya ma nye iwu ka otu na-ahu maka ichu mpu ozo na Naijiria bu Economic and Financial Crimes Commission, EFCC nyochaa ego niile ministri ya mefurula.
A na-atu anya na Edu ga-aga zara onu ya n'ulooru ndi EFCC ta ebe ha kporo ya oku banyere ebubo ndi ahu a na-ebo ya.

Ebe foto si, BETTA EDU/X
Gini mere e jiri chuo ya n'oru?

Ebe foto si, Betta Edu/X
Onyeisiala Bola Tinubu enyela ịwụ kwụsiri Betta Edu bụ Mịnịsta ọdịmma mmadụ na nkpochapụ ụbịam ọrụ obere oge.
Mmachi a dị n'ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke onyeisiala bụ Ajuri Ngelale weputara n'ụbọchị Monde.
Dịka ọ sịrị kwụ, mkpebi a sị na atụmatụ ọchịchị Bola Tinubu nke gbadoro ụkwụ n'eziokwu na nhazi akụnụba Naịjirịa.
Cheta na gọọmentị etiti bidoro inyocha akụkọ na-efegharị maka Ministri ahụ ịkwụ ụgwọ adịgboroja.
Ọ pụtara ihe na ngwụcha Disemba afọ 2023 na o nwere akwụkwọ a sị gosiri ebe Betta Edu ziri ozi ka ndị ngụkọ ego etiti kwụnyere ya ụgwọ n'ime ọbaego abụghị nke gọọmentị.
Ihe kpalitere okwu a
Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha amalitela ilebanya na kepukpụ na efegharị kwuru na minista na-ahụ maka ọdịmma mmadụ na kpochapụ ụbịam na Naịjirịa kwụnyere ọkpụrụkpụ ego na akara ụlọ akụ ya.
Nke mere ka agbachara ekeresimesi, ka otu ihe onyonyo gosiri na Betta Edu gwara aka na ekekọta ego Naịjirịa ka ọ kwụnyere ọkpụrụkpụ ego na akala ulọakụ ya.
Otu ụlọntakụkọ kwuru na Betta nyere ịwụ ka a kwụnyenre ya ego ahụ n'edemede ọ dere n'ụbọchị 20 nke ọnwa Dịsemba 2023.
Dịka Ụlọntakụkọ sịrị kwụ, isi okwu edemede ahụ bụ '' Mandate for Payment of Grant for Vulnerable Groups in Akwa Ibom, Cross River, Lagos and Ogun States Respectively" Mịnịsta ahụ nyere ịwụ ka a kwụnyenre ya ego ahụ n'otu akala ụlọakụ UBA nke bu aha otu 'Oniyelu Bridget Mojisola'.
Dịka okwu a na-arị elu, onyeisiala Bola Tinubu nyere ịwụ ka a malitere nyoncha pụrụiche ị ji nyọpụ ya bụ ihe.
Ihe Betta Edu zaghachiri ebubo na-efegharị

Ebe foto si, Screenshot
Betta Edu kwuru na ọbaozi X na-oweghị ihe ọjọọ ọ mere, ọ kwuru na ụfọdụ ndị chọrọ ịmebi aha ya mana ọ gaghị abịa na mmezu.
"Atụmatụ imechu m na ọchịchị ihu agaghị amịta mkpụrụ" ka o kwuru.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na ebubo ndị ahu na-efegharị enweghi isi.
Betta Edu bụ Minsta na-ahụ maka ọdịmma ndị ihe metụtara.
Ọ bụ Bola Tinubu họpụtara ya n'ọkwa mgbe ọ banyere ọchịchị.
Onye bu Beta Edu na kedu etu o siri ruo Aso Rok?
Dokinta Betta Chimaobim Edu bu onye steeti Kros Riva, a muru ya n'abali Oktoba 27 afo 1986 na London mba Briten.
Nne na nna ya kpolatara ya na umunne ya ano na Naijiria oge o di afo asato.
O bu otu n'ime ejima nwoke na nwaanyi ebe ha di umuaka ise n'ezinaulo ha.
Agumakwukwo na ndu ya
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
O nwetara asambo akwuko praimari ya n'afo 1995 n'uloakwukwo Charles Walker International Nursery and Primary School.
O dere ulo WAEC ya n'afo 2001 na uloakwukwo sekondiri ebe o guru bu Uloakwukwo Federal Government Girls' College, Calabar.
N'afo 2009, o nwetara asambodo mbu ya ka o guchara dika dokinta (MBBCh) na mahadum University of Calabar di na Steeti Cross Riva.O fere ala nna ya n'afo 2012 na steetu Kros Riva ebe o buru onyeisi uloogwu n'ime ogige ebe o fere ala nna.
O nwetala asambodo di icheiche sitere na mba di icheiche dika Graduate Diploma in Public Health for Developing Countries site na mahadum Londond School of Hygiene and Tropical Medicine na mba Briten n'afo 2014.
O retekwala nzere 'masters' nakwa nzere okachamara bu dokinta nke o zi na mahadum Texila di n'Amerika nweta.
O weputala atumatu di icheiche gbanwere etu e si eye ma na-anata ahuike na steeti nakwa na goomenti etiti.
N'afo 2013, steeti Kros Riva hoputara ya ka o buru onyeisi okwu ahuike.
N'afo 2015 ruo 2016, dokinta Edu bu onye kacha di na nwata na-enye govano ndeumodu gbasara ahuike.
Govano ahu bu Benedict Ayade hoputakwara Edu ka komishona ahuike malite na Disemba 2019 ruo March 2022 tupu o gbaa arukwaghim gaa banye otu pati ndorondoro ochichi.









