Ọ bụ Eziokwu na Nnamdi Kanu achụọla Ozekhome, Ejiofor dịka ndị ọkaiwu ya?

Nwanne Mazi Nnamdi Kanu bụ Kanunta Kanu, ekwuola na ezinụlọ Kanu achụọla ọkaiwu Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor dịka ndị ọkaiwu na-anọchite anya Nnamdi Kanu n'ụlọikpe.
Mana ndị ọkaiwu abụọ a, Ozekhome na Ejiofor ekwuola na nke ahụ bụ okwu ụgha, nakwa okwu nkọgheri.
Nnamdi Kanu bụonyeisi ndị otu 'Indigenous People of Biafra', bụ ndị na-azọ maka nnwereonwe mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke ha na-akpọ mba Biafra.
Kanu nọ na mkpọrọ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ DSS n'Abuja, n'agbanyeghị na ụlọikpe mkpegharị enyela iwu ka atọhapụ ya.
N'ụbọchị Tọzde nakwa taa bụ Fraịde, bụ ụbọchị 15 na 16 nke ọnwa Jun 2023, Kanunta dere n'akara Twitter ya na Ozekhome na Ejiofor ereela Nnamdi Kanu ma gbahapụ ya na mkpọrọ.
Kanunta boro ebubo na Ozekhome na Ejiofor gbochiri ndị dọkịta bịara inye Nnamdi Kanu ọgwụgwụ n'ebe ọ nọ n'ụlọmkpọrọ ndị DSS kamgbe ọnwa June afọ 2021.
"N'ihi ihe ndị a, anyị (bụ ezinụlọ Mazi Nnamdi Kanu) achụọla Moke Ozekhome (SAN) na Ifeanyi Ejiofor dịka ndị ọkaiwu na-anọchite anya Nnamdi Kanu," ka Kanunta dere.
"Ezinụlọ Kanu na-ekele ụnụ maka mbọ niile ụnụ gbarala, biko nyefeenu akwụkwọ ikpe niile na-egbughị oge."
Ọrụ ọjọọ nke Kingsley Kanụ akpụọla n'ala - Ifeanyi Ejiofor

N'akwụkwọ ozi nke Ifeanyi Ejiofor ziteere BBC Igbo, o kwuru na ihe niile Kingsley 'Kanunta' Kanu depụtara gbasara ya na Ozekhome bụ nnukwu ụgha.
Ejiofor kwuru na "Onwebeghị oge Onyendu Mazi Nnamdi Kanu chụpụrụ maọbụ kwupụta mmasị ịchụpụ ndị ọkaiwu ya, nke onye isi ha bụ Ọkammụta Mike Ozekhome (SAN)."
"Anyị na-agwa ndị ọha mmadụ ka ha ghare ige ntị n'okwu ụgha, okwu nduhie, okwu mkparị nakwa okwu ọjọọ nke si n'aka Kingsley Kanu, onye e jikwa Kanunta Kanu mara."
"Ozekhome n'onwe ya amaghịdị onye nwa amadị a bụ Kingsley Kanu bụ."
"Ihe kpatara akụkọ ọjọọ ndị a ji apụta ugbua bụ maka na ndị iro Nnamdi Kanu chọrọ ka ndị ọkaiwu ya wee iwe ma gbahapụ ya n'ụlọ mkpọrọ, mana nke ahụ agaghị eme."
Ejiofor gara n'ihu kwuo na Ụlọikpe kachasị etinyela ụbọchị 14 nke ọnwa Sepụtemba dịka ụbọchị ha ga-ekpebi ikpe maka okwu Nnamdi Kanu ma ọ bụrụ na ndị ọkaikpe lọghachite n'ezumike ha.
Nke a bụ akụkọ ọhụrụ nyere m - Ozekhome

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
BBC Igbo gbalịrị ịkpọ ọkaiwu Mike Ozekhome mana ekwentị ya agaghị, nke a nwereike ịbụ maka na ọ nọ n'ụlọikpe mkpegharị n'Abuja, ebe o so na ndị ọkaiwu na-anọchite anya otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' n'ikpe gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ọnwa Febrụwarị afọ a.
Mana ụlọntaakụkọ Guardian kwuru na ha na ya nwere mkparịtaụka gbasara okwu a o wee kwuo na ihe Kalunta kwuru bụ ụgha.
"Nke a bụ nke mbụ m na-anụ ụdị ihe dị otu a. Amaghị. Onweghị onye gwara m ihe ọbụla," ka Ozekhome gwara ndị ntaakụkọ Guardian.
"Mụ na ya nọrọ izu ụka abụọ gara aga. Aloy Ejimakor (ọkaiwu ya nke ọzọ) na nwanne Kanu nwoke nke nta na-agbasi mbọ ike kwa ụbọchị n'ụlọikpe kachasị.
"Agara m na nke ndị DSS izuụka abụọ gara aga iji nweta ụbọchị ndị dọkịta ga-abịa nye ya ọgwụgwọ. Ya mere amaghị m ihe nke a pụtara.
"Alụọla m nnukwu ọgụ maka nwa amadị ahụ. Onweghị onye amaghị etu m sị lụọrọ ya ọgụ. Mụ na ya esebeghị okwu mbụ. Ugbua bụ mbụ m na-anụ ihe ụnụ na-ekwu."
Onye bụ Kanunta Kanu?

Ebe foto si, Screengrab
- Ọ bụ otu n'ime ụmụnne Nnamdi Kanu, onye nke ọzọ bụ Emmanuel Kanu
- Kanunta anọghị na Naịjirịa, akụkọ na-ekwu na o bi na mba Germany
- O sokwa na ndị na-eti mkpu oge niile maka nnwereonwe Biafra










