Ndubuisi Godwin Kanu: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Ndubusi Kanu bụ Gọvanọ mbụ Imo steeti," nwụọrọla

Muhammadu Buhari, Ndubuisi Kanu na Babajide Sanwo-Olu

Ebe foto si, Mbuhari/CFM/LASG

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buharui atụọla ezipụlara ezinaụlọ ọchịagha mmiri bụ Rear Admiral Ndubuisi Kanu bụ onye nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde ka ọ rịchara ahụ ogologo oge.

Otu onye dị ya nso achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na Kanu nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde n'ụlọọgwụ a kpọghị aha ya na Legọs ka ọ gbachara afọ 77.

N'ozi nke onye nnyemaka ya na soshal midia bụ Bashir Ahmad wepụtara n' igwe okwu Twitter, Buhari tiri ezinaụlọ ya, ndị Legos na Imo steeti bụ ebe ọ chịrị aka n'obi maka ọnwụ ya.

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Twitter/APC Nigeria

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'otu aka ahụ onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila kwuru na ihe a ga-eji echeta Kanu bụ 'uchu o tinyere n'imepe Legọs steeti na steeti ndị ọzọ ọ chịrị.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gọvanọ Imo steetị bụ Hope Uzodinma, onye kwuru na ya bụ ọnwụ dara ya na mberede sị na Kanu ji obi ya na ike ya niile gbara Naijiria odibo.

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu kwuru na ọnwụ ya bụ nnukwu ihe furu Naijiria.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Ihe ndị ọzọ nwere agba na-ekwu maka Ndubusis Kanu

Senetọ Shehu Sani kwuru na Kanu bụ "odogwu nwoke nakwa otu n'ime nna ọchịchị onye kwuuche ya".

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Goddy Uwazuruike bụbụ onyeisi otu Aka Ikenga kwuru na "dịka gọvanọ Imo nakwa Legos, o gosiri ụkpụrụ tọrọ atọ...."Nnukwu mmadụ furu anyị."

Goddy Uwazuruike

Ebe foto si, Goddy Uwazuruike

Ihe ị kwesiri ịma maka Kanu

Ndubuisi Kanu

Ebe foto si, Center for memories

  • Nwa afọ a nwetara ọzụzụ n'agha mmiri n'India bụ ọkpọka ọchiagha mmiri aha ya dara ụda oge ndị agha na-achị Naijiria.
  • Dike Igbo ji eme ọnụ bụ gọvanọ Imo steeti mbụ chịrị Imo steeti n'afọ 1976 oge ọchịchị Olusegun Obasanjo ka e kewapụchara steeti ahụ site n' "East Central State'onyeisi agha.
  • Kanu chịkwara Legos bido n'afọ 1977 rue 1978.
  • Dịka otu 'Centre for Memory' siri kọwaa, ọ bụ oge Obasanjo gara nleta n'Imo steeti were hụ ụdị ọrụ ọma Kanu na-arụ ka ọ laghariri were tụga ya Legos dịka gọvanọ n'afọ 1977.
  • Onye Ovim n'okpuru Ọchịchị Isikwuatọ n'Abia steeti, Kanu bụ onye Igbo mbụ so n' ọgbakọ 'Supreme Military Council'( SMC) n'ọchịchị Murital Mohammed tupu Olusegun Obasanjo ekposaa ya bụ ọgbakọ oge ọ rigoro n'ọcha ọchịchị dịka onyeisiala n'afọ 1976.
  • Kanu so na ndị na-agba mbọ maka ikike dịrị onye lụrụ ọgụ June 12 site n'otu National Democratic Coalition(NADECO)dịka o so na ndị haziri ngagharịiwe NADECO jiri kpọọ oku ka enye MKO Abiola o here ọchịchị dịka onye meriri na ntuliaka Onyeisiala e mere na Juun 12 afọ 1992.Ọ rụrụ ụlọọrụ mgbasaozi, Imo Broadcasting Service.
  • Ọ rụrụ ọtụtụ okpooroụzọ n'Owere ma weta ọtụtụ ihe mmepe obodo n'Imo steeti oge ọ chịrị steeti ahụ.
  • Ọ bụ onye anaghị atụ ekwu ikwu obi ya dịka ọ ọsọghị anya ịgwa ọchịchị Sani Abacha uche ya banyere ka obod is aga nke mere ndị ọrụ nchekwa na-achọkarị ya oge ahụ.
  • Ọ so na ndị nwere agba kpọrọ oku ka e nyefe ọchịchị n'aka Goodluck Jonathan oge onyeisiala mgbe ahụ Musa Yar'Adua dara n'oke ọrịa.
  • A rụrụ ebe nnọsapụ ahụ "Ndubuisi Kanu Park dị na GRA , Legọs na ncheta ọrụ ya dịka gọvanọ steeti ahụ.
  • Ọ lụrụ nwaanyị ugboro atọ ma mụta ụmụ iri.
  • Nwunye ya ugbua bụ Gladys Ndubuisi Kanu.