Nnia Nwodo: Ṅomie nụ nna unu Joe Achuzia

Mgbe akụkọ ọnwụ onye agha Biafra ma bụrụkwa dike ndị Igbo bụ Joe Achụzia batara n'obodo,owutere ọtụtụ mmadụ mana ha kasiri onwe ha obi maka ụdiri ndụ o biri.
Tumadị na imee ka ndị Igbo nwere onwe ha.
Nnia Nwodo bụ onye isi Ohaneze ndị Igbo gwara ụmụ dike Biafra bụ Joe Achuzia ka ha gbaa mbọ hụ na ha soro nzọụkwụ nna ha.
O kwuru nke a ka e mere emume ncheta ikpeazụ Achuzia n'Asaba ụnyaahụ.

Nwodo gwakwara ndị Igbo na ike agwụla ha n'ime ndọrọndọrọ maka ị nweta ọnọdụ ọma n'ala dimma ebe ndị obodo ahu ga-enweta ikike nhataha n'agbanyeghị ebe ha si.
O kwuru na ha mee nke a, na ọ ga bụ nnukwu nkwanye ugwu dinyere Achuzia.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:






