O nwere uru dị n'iwete ego Abacha 'zuru' n'aka Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwenyela na onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Sanị Abacha, zuru ọtụtụ ego.
BBC Igbo na-achọ ị chọpụta ihe ihe ego Abacha 'zuru' ga-emenwuru Naịjirịa.
Mịnịstrị na-ahụ maka akụnaụba kwuru na nde dọla narị atọ na iri abụọ na abụọ ($322) ka ndị mba switzerland nyeghachịrị Naịjirịa.
Ha kwuru na akuola ego a n'ụlọọrụ ego Central Bank n'ụbọchị iri na asatọ n'ime ọnwa Dizemba afọ 2017.
Cheta n'afọ 2003, gọọmentị kwuru na a hụrụ ego Abacha zuru ruru nde dọla iri abụọ na abụọ ($22m)

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2002, gọọmentị ala Switzerland kwuru na ha enyechietala gọọmentị Naịjirịa ego Abacha zuru ru nde dọla narị asa ($700m).
N'afọ 1998, Buhari kwuru na Naịjirịa kwesiri ị na-ekele Abacha makana o bulitere akụnaụba ala Naịjirịa.
Ha, na ndị ọzọ chịrị Naịjirịa dịka Ibrahim Babangida na Abdulsalami Abubakar kwuru ihe a, na ngwụcha otu izuuka Abacha nwụrụ.
Akụkọ ka -na-abịa

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










