Atiku: Abuja kporo ọkụ dịka Atiku lọtara njem Amerịka
Akuko dị mkpa:

Ebe foto si, @officialKolaO
Ndị otu PDP na ndị ihe Atiku Abubakar na-amasị pụtara n'igwe n'ọdọgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja iji nabata Abubakar, onye gara mba Amerịka.
Atiku na onyeisi Ụlọomeiwu Naijiria bụ Bukola Saraki soro mee njem abalị abụọ na mba ahụ ebe dịka Atiku siri kọwa, ya ndị ọrụ gọọmenti mba ahụ na ndị ojiegoachụego nwere ọgbakọ.
Atiku ga-esonye na ndọrịtaụka nke ndị na-azọkwa onyeisiala ga-eme n'abalị Satode n'Abuja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọkụ gbara n'ụlọọrụ mmepụta mmanya Guinness
Ọkụ gbara ụlọ mmepụta mmanya nke ụlọọrụ Guinness n'Osisioma Industrial Layout, Aba, Abia steeti ụbọchị Fraide.

Ebe foto si, Getty Images
Ọkụ ahụ nke gbara rue awa isii bụ ndị ụlọọrụ na-emenyụ ọkụ, nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ nọ nso, ndị uweojii na ndị obodo ahụ nyere aka gbanyụọ ya.
Ọnụ na-ekwuru Guiness bụ Nike Ọnakoya gwara BBC Igbo na ọkụ ahụ emerụghị mmadụ ahụ nke ọ na emebei nnukwu ihe.
O kwukwara na ọrụ mmepụta mmanya ha ka dị ire n' ọdọ ha dị na Benin nakwa Ogba,Lagos Breweries.
"O nweghị ihe mmerụ ahụ maọbụ nnukwu ihe mebiri site n'ihe mere dịka ọgba nke Aba bụ maka mgbarị ọrụ ma nwekwa naanị ndị ọrụ mmadụ ole na ole. Ebe anyị jiri mere ebe mmepụta manya bụkarịrị na ọdọ anyị dị na Benini nakwa Ogba(Legọs)."
Ọ bụ akụkọ ụgha na a chọrọ inwụchi Onnoghen

Ebe foto si, Femi Adesina Facebook
Ụlọọrụ onyeisala agọọla sị na akụkọ na gọọmentị chọrọ ịnwụchi ọkaikpe ukwu Naijiria bụ Jọstis Onnoghen bụ akụkọ ụgha.
Ọnụ na-ekwuru onyeisisala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina kwupụtara n'igwe okwu Facebook ya na " akụkọ ụgha" ahụ nke ha boro otu jikọrọ ndọrọndọrọ ọchịchị (Coalition of United Political Parties(CUPP) .
Donald Trump: Ọganihu adịla n'okwu iwepụ ngwagha nuklịa Nọt Korịa

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na enwela ọganihu were anya n'okwu iwepụ ngwagha nuklịa mba Nọt Korịa.
O kwu ya dị iche n'ihe ndị ọkachara na-ekwu sị na agabeghị ya ụzọ aga fọdụkwa iru ebe a na-aga.
Liverpool na Crystal Palace chịpụrụ ya

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu,
Liverpool gbara Crystal Palace ọkpụ atọ asatara abụọ n'Asompi premier league ha mere ụbọchị Satọde.
Gọọmentị ga-ere akụnaụba ndị aka ha dị na mpụ

Ebe foto si, Facebook/EFCC
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na gọọmentị ya ga-ere akunaụba anatara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka ha dị na mpụ na nrụrụ aka.
Buhari kwuru nke a na Kaduna bụ ebe ọgara achụmata vootu ụnyaahụ.
Ọ sị na atumatụ bụ maka na ya achọghị ka eme ihe ọ sị na emere na afọ 1985, bu enyeghachi ndị a akunaụba ha.
Ndị ụlọọrụ Ọkwaiwu ukwu Naịjirịa amalitela njem ịchụtụ Onnoghen

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na Gọọmentị etiti agaala ụlọikpe Code of Conduct ịrịọ ka ewepụ Ọkaikpe Walter Onnoghen n'ọkwa ya dika Ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa nakwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ ikpe bu National Judicial Council.
Onye eji aha ha tinye ya bu akwukwọ na CCT bụ Ọkaiwu ukwu Naịjirịa Abubakar Malami
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Ihe ruru mmadụ iri abụọ anwụọla na mba Mexico ka ọkụ bara igwe na-ebu mmanụ ụgbọala.
Ọtutụ ndi ọzọ merụrụ ahụ na ihe mberede a mere na Hidalgo steeti dị na etiti Mexico.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Lobi Stars nke Naịjirịa ga-ezute Asec Mimosas nke Ivory Coast taa n'isi obodo mba ahụ bụ Abidjan na agba nke abụọ ha n'iko CAF Champions League.
Ndi Lobi ji okpu goolu abuọ asatara otu merie agba nke mbu ha na Mamolodi Sundowns gbara n'Enugwu.
Gee nkeji ndị a ebe a:
Lee ihe nkiri nke taa:











