Nigeria Independence: Lee etu Nigeria na mba Africa ndị ọzọ nweere onwe ha na 1960 si kwụrụ

Emume nwereonwe Naịjirịa nke 2019

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Emume nwereonwe Naịjirịa nke 2019
    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

Dịka Naijirịa na-eme emume nnwereonwe, ụfọdụ na-ajụ kedụ ebe Naijirịa nọ n'ihe gbasara ọganihu.

Ha dị ọtụtụ mba n'Afrịka ha na Naịjirịa nweere onwe ha n'afọ 1960.

Ha gunyere Gabọn, Mọritenịa, Mali, Bene Repụbụlik, Senigal na Togo.

Mba ndị a na-akwadokwa emume ịgba afọ 59 nke ha.

Mba ndị a niile bụ ọgbọ mana Igbo si na "nwoke na ibe ya ha bụ n'ọnụ".

Ọ bụrụ n'omenala Igbo, onye gbara afọ iri ise na itoolu ekwesila imezu ihe a tụrụ anya na ndụ ya.

Na ntule anyị mere, anyị chọrọ ịchọpụta mba kacha eme nke ọma.

Ihe enyochara

Ihe ndị anyị ji mee nchọpụta a gụnyere ọnwụ ụmụaka amụru ọhụrụ nke Bekee kpọrọ "Infant Mortality", ogologo afọ ndụ (life expectancy), ụgwọ opekatampe (minimum wage) na nrụrụaka (corruption).

Anyị jụkwara onye ọkammụta n'ihe gbasara akụnụba mba bụ Mazi Samuel Iheanyichukwu Ohuabunwa na Dọkinta na-ahụ maka ahụike obodo bụ Ikenna Onoh.

Ọkọlọtọ Naijirịa na mba ndị ọzọ
Nkọwa foto, Ọkọlọtọ Naijirịa na mba ndị ọzọ

1) Ọnwụ ụmụaka a mụrụ ohụrụ (Infant Mortality)

Nwanyị jị nwa n'aka.

Ebe foto si, Huw Evans picture agency

Nkọwa foto, "Ọnwụ ụmụ ọhụrụ ga-ebelata ma a kuziere ndị nne etu esị eledo afọime na ụmụ ọhụrụ ha anya." Ikenna Onoh

Ọnwụ ụmụaka a mụrụ ọhụrụ ka njọ na Naịjirịa karịa mba ndị ọgbọ ya.

Dịka ndị 'Worldbank.org' si depụta n'afọ 2018, Naijirịa jiri akara 75.7 were bụru onye nke ikpeazụ ebe Senegal bụ onye nke mbụ n'akara 31.8.

Ihe na-egosi ọnwụ ụmụaka amụrụ ohụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe na-egosi ọnwụ ụmụaka amụrụ ohụrụ

Anyị jụru dibia Bekee bụ Ikenna Onoh onye bụkwa ọkammụta n'ihe gbasara ahụike ọha nke bekee kpọrọ 'public health'.

Ọ kọwara na ọtụtụ ihe na ebute ọnwụ nwa amụrụ ọhụrụ kama ọ nwere nke gọomentị kwesịri ime.

Dọkinta Ikenna Onoh

Ebe foto si, Ikenna Onoh

Nkọwa foto, Dọkinta Ikenna Onoh

Onoh kwuru na gọmentị kwesịrị ime ka ụlọọgwụ ruo mmadụ niile aka, ọkachasa ndị bi n'ime obodo na ogbe nkịrika ụlọ.

O kwukwara na ọ dịịrị gọọmenti ịgbasa ozi ma kuziere ụmụnwanyi di ime na ndị mụrụ ụmu ọhụrụ etu ha ga-esi ledo ụmụ ha anya.

2) Afọ ole a tụrụ anya mmadụ ibi ndụ (Life Expectancy 2016)

Onye Dokinta na onye ọrịa

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ afọ ole a na-atụanya na mmadụ nwere ike ibi ndụ n'obodo ọbụla site na nwata tupu onye ahụ anwụọ.

Naijiria gbakwara onye nke ikpeazụ na nnyocha ndị WHO mere n'afọ 2016.

Afọ ole a tụrụ anya mmadụ ibi ndụ
Nkọwa foto, Afọ ole a tụrụ anya mmadụ ibi ndụ

Ikenna Onoh ji ihe mberede okporoụzo were maa atụ dịka okporo ụzo ọjụọ sọ n'ihe na-ebute ọnwụ erughi eru na Naịjirịa.

Onoh kọwara na mgbe ihe mberede okporo ụzo mere, onweghi ndị gbatagbata nke goomenti ga-abia nyere ndị ihe mberede ahụ metụtara aka.

O kwukwara na gọọmenti kwesịri itinye ụchụ n'ịkuziri ndi mmadụ maka ahụike ma rụkwaa ụlọọgwụ ebe ndị mmadụ ga-anata ọgwụgwọ ọrịa maọbụ nnyocha ahụ.

3) Ụgwọ opekata mpe

Ndị ọrụ Naijirịa na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọomentị buliri ụgwọọnwa opekatampe site na N18,000 ruo N30,000 n'afọ 2019, mana ebidobeghị kwụwa ya.

N'ime mba asaa ndị ha na Naịjirịa bụ ọgbọ, Naịjirịa gbara onye nke atọ na ụgwọ opekatampe.

N'ọdịnsoa ka e buliri ụgwọọnwa opekatampe na Naịjirịa ruo puku naịra iri atọ nke pụtara $83.10 ma a tụgharịa ya.

Ugwọọnwa opekata mpe 2019
Nkọwa foto, Ugwọọnwa opekata mpe 2019

Gabon gbara onye nke abụọ n'onụ $249.27 ebe Mauritania gbara onye nke mbụ n'ụgwo $801.26 opekete mpe.

Mali gbara onye nke ikpeazụ n'ụgwo $47.29 ụgwo opekete mpe.

4) Nrụrụaka (Corruption)

Ihe gosiri mba kacha eme nrụrụaka n'ime mba asaa ndị a.
Nkọwa foto, Senigal kacha bụrụ mba na-akwụba aka ọtọ n'ime mba asaa ndị a

A bịa na nrụrụaka, Naijiria na Mọritenịa bụ ndị nke ikpeazụ n'ime mba asaa ndị a bụ ọgbọ.

Nke a bụ dịka ngalaba na-ahụ maka ịkwụba aka ọtọ bụ 'Transparency International' si depụta.

Ha nyere Naịjirịa na Mọritenia akara 27/100.

N'ụwa niile, mba abụọ a gbara ndị nke 144 n'ime mba 180 ngalaba ahụ nyochara.

Senigal ji akara 45/100 bụru onye nke iri isi na asaa n'ime mba 180 ndị 'Transparency' nyochara.

Kedu ihe bụ Nsogbụ Najirịa

Sam Ohuabunwa

Ebe foto si, sofee.org.ng

Nkọwa foto, " Naijirịa ga-eme nkeọma ma anyị nweta ezigbo onye ọchịchị" Sam Ohuabunwa

Ọ bụ Okoro etoghị eto wara ọgọdọ na-enye Naijirịa nsogbu?

Anyị jụrụ Mazi Samuel Ohuabunwa ihe kpatara o ji dị ka Naịjirịa a na-alaghachi azụ.

O kwuru na-enweghị ihe afọ olee Naijirịa dị nwere ime maka mmepe obodo.

Ohuabunwa kwuru na Naijirịa na-emebu nke ọma oge a na-eme ọchịchị onye hazie akụ ya nke Bekee kpọrọ 'Regional Government'.

Ọbụ mgbe ndịagha batara n'ọchịchị ka ihe niile ghasara.

Na mpịachi, Ohuabunwa kwuru na ọ bụ ajọ ọchịchị na ajọ ndị ọchịchi mere na Naijirịa etobeghị.

Ọ kọwara na Naijirịa nwee ezigbo ndị ọchịchị, na ha ga-etokwute mba ndị ọzọ na eme ọfụma.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?