Okeoma Chidiebube: 'Etu ndị uweojii na-arụ n’obi gọọmenti Imo steeti si kụọ m dụka dụka'
Chidiebube Okeoma bụ onye ntaakụkọ ụlọọrụ mgbasaozi Punch ekwuola etu ndị ọrụ nchekwa gọọmenti Imo steeti si tie ya dụka dụka.
O kwuru na ọ bụ oge ọ gara isetee ụmụnwaanyị na-eme ngaghariwe n’ihu obi gọọmenti Imo steeti n’ụbọchị Mọnde June 21, 2021 ka ha kụrụ ihe.
Okeoma gwara BBC Igbo na ọ na-abata ka ọ kpọlatachara nwa ya n’ụlọ akwụkwọ mgbe ọ hụrụ ụmụnawaanyị na-eme ngaghariwe. “A kwụsịrị m dịka onyentakụkọ jụwa ụmụnnwaanyị ahụ ihe butere ha n’ihu obi gọọmenti Imo steeti.”
Okeoma kwuru na ụmụnwaanyị ahụ kwuru na ha bụ ndị na-azacha okporoụzọ iri ise dị n’Imo steeti gwara ya na ha na-eme ngaghariwe makana gọọmenti Imo steeti ji ha ụgwọ ọnwa ruru ọnwa isiii.
O kwuru na ndị uweojii ahụ na-arụ n’obi gọọmenti ji ndị agboro si n’ Owerri Capital Development Authority kụọ ya dụka dụka tupu ha buru ya dọnye n’ụgbọala na-eche eche.
O kwuru na a anakọrọ ya ngwa ọrụ ya niile ma buru ya gawa n’ụlọọrụ gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma ebe a nyefere ya n’aka onyeisi ndị ọrụ nchekwa gọọmenti akpọrọ Shaba Adamu.
Gere ihe Okeoma kwuru n’uju n’ihe nkiri a dị ebe a .
O nweghị onye tiri Okeoma ihe n’obi gọọmenti – Kọmịshọna mgbasaozi Imo steeti
Declan Emelumba bụ Kọmishọna mgbasaozi Imo steeti kwuru na Okeoma biara ịsete ụmụnwaanyị na-eme ngaghariwe n’ihu obi goọmenti, mana mgbe a jụrụ maka akwụkwọ njirimara ya, o jighị ya.
O kwuru na Okeoma malitere sewe obi gọọmenti nke mere ka ajụwa gịnị mere o ji esete ebe ahụ ebe ọ bụ na ndị na-eme ngaghariwe alachala.
“Okeoma gwara ndị ọrụ nchekwa na ọ bụ iwu Naịjirịa kwadoro ya dịka onye ntaakụkọ ya setee ihe ọ na-ese.”
Emelumba kwuru na o nweghị onye tiri Okeoma kpam n’ahụ, “Nwamadi ahụ na-atụ asị.”
Ihe o kwuru n’uju dị n’ihe nkiri dị ebe a.
Okeoma abịaghị mee mkpesa ebe kwesirinụ- Kọmịshọna uweojii Imo steeti
Kọmịshọna ndị uweojii nọ n’Imo steeti bụ Abutu Yaro kwuru na o kwenyere n’ihe kọmịshọna mgbasaozi Imo steeti bụ Declan Emelumba kwuru makana Okeoma emeghị mkpesa n’ụlọọrụ ndị uweojii dịketere obi gọọmenti.
O kwuru na mkpesa Okeoma biara mee n’ụlọọrụ kọmịshọna uweojii adabaghị.
Ihe o kwuru n'uju dị n'ihe nkiri a dị n'akụkọ a.