Nigeria's Economy: Ihe ndị na-achọ Biafra sara ndị ugwu kwuru na ha bụ aka ji akụ Naịjirịa

Ndị ji Biafra ọkọlọtọ /Abdullahi Awwal Aliyu

Ebe foto si, BBC/Abdullahi Awwal Aliyu Facebook page

Ralph Uwazuruike bụ onyeisi Biafra Independent Movement ekwuola na onweghị onye ma onye Abdullahi Awwal Aliyu bụ onyeisi otu akpọrọ Northern Concensus Movement bụ.

"Nke a mere na onweghị ihe anyị ga-eji okwu ya kpọrọ, onye anyị ma bụ Yerima Shetima bụ onyeisi ndị ntoroọbịa ndị ugwu."

Uwazuruike kwuru na ihe kacha ya mkpa ugbua bụ ijikọta otu niile na-achọ Biafra ka ha bụrụ otu.

"O nwezie ihe ndị ugwu chọrọ anyị enye ha. anyị agaghị agbara ha ọsọ nke anyị ji atụ ha ụjọ."

O kwuru na ụbọchị iri atọ ndị ugwu nyere ndị gọvanọ ndida nayanwụ ịkwụghachị ndị bee ha egburu ma mebie ihe ha ụgwọ ebuka, "anyị chọrọ naanị otu ụbọchị, ha biazia mee ihe ha chọrọ ime."

Ihe onyeisi Biafra Defacto Customary Government sara

Asari Dokubo

Ebe foto si, Asari Dokubo Facebook Page

Asari Dokubo bụ onyeisi Biafra Defacto Government kwuru na ndị ugwu tụrụ ezigbo asị mgbe ha kwuru na ọ bụ ha bụ aka ji akụ Naịjirịa.

O kwuru na ọ bụ maka oke ụbịam dị na mpaghara ugwu mere ndị ọcha ji bụkọta ha ndị mpaghara ndida anyanwụ niile nwere oke akụ na ụba n'atụmaatụ akpọrọ "amalgamation' na bekee.

Gbasara agụmakwụkwọ, Dokubo kwuru na ọ bụ naanị agụmakwụkwọ alakụba ka ndị ugwu chịtara aja na ya mana onweghị iheọma ha ji ya mepụta.

Gbasara ụbọchị iri atọ Abdullahi Awwal Aliyu bụ onyeisi otu akpọrọ Northern Concensus Movement nyere ndị gọvanọ ndịda anyanwụ maka ịkwụghachị ndị ugwu egburu n'ala ha ego iti aka n'obi, Dokubo kwuru na ụjọ anaghị atụ onye ọbụla.

N'ọnụ ya, "ha gosi anyị ndị bee ha e gburu, ọ bụrụ Nnamdi Kanu ka ha na-ege ntị, ha mara na ọ na-alafu ha." Ọ bụruzikwa na ha chọrọ i bịa mee ihe ọbụla, anyị anaghị atụ ụjọ."

'Ndị ugwu bụ aka jị akụ Naịjirịa, anyị abụghị ndị arịrịọ'- Onyeisi Northern Concensus Movement

Mmanụ na ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images/Discovery Channel

Abdullahi Awwal Aliyu bụ onyeisi otu akpọrọ Northern Concensus Movement ekwuola na ọ bụ ndị ugwu bụ aka ji akụ Naịjirịa agbanyeghị na-akpọrọ ha ndị ndabere.

O kwuru nke a n'onyonyo na-efegharị na soshal media ebe ya na ndị ugwu ndị ọzọ na-enwe ọgbakọ.

Aliyu kwuru na ọ bụ ego ndị ugwu si na "groundnut pyramid' nakwa 'cotton' ka e ji mee nyocha ma chọpụta ebe e si gwupute mmanụ n'ụfọdụ mpaghara Naịjirịa mere ha ji etu ọnụ ugbua.

O kwuru na o kwesiri ka e hibe ngalaba 'Northern Develpoment Commission' dịka e si hibe Niger Delta commission ma nye ọkpụrụkpụ ego ha ji ahazi ngalaba ahụ.

Aha onyonyo, Ndị Ugwu na-achị Naịjirịa adaala, ka enye ndị Igbo ọchichị - Onye Fulani

Ihe ndị ọzọ o kwuru gụnyere:

  • Ọ bụ ego ndị ugwu ka e ji mee ka ndị niile nọ na ndịda anyanwụ nwete agụmakwụkwọ n'oge gboo
  • A chọpụtala mmanụ na Gombe, Bauchi na Taraba n'akụkụ Lake chad mana otu 'ndị a' edunyela ndị Boko Haram ka ha wete ọgbaghara mere na amịpụtawabeghị mmanụ ahụ
  • Anyị nwere onunu ọlaedo na Birnin Gwari mana "ndị a" dunyere ndị 'bandit' ka ha weta ọgbaghara mere na anyị egwuwebeghị ọlaedo ahụ
  • Ndị ugwu kwenyere n'idi n'otu Naịjirịa ma a sị ka ekwukwe
  • Ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ndịda ndida anyanwụ chemie echiche tupu ha na-egbu maọbụ mebie akụ na ụba ndị ugwu bi na bee ha makana ọgụ daa ihe ha ga-efuefu maọbụ mebisie ga akarị
  • Anyị kwenyere n'ịdị n'otu Naịjirịa mana ọ bụrụ na ndị mpaghara ndị ọzọ ekwenyeghị, anyị ga-anọrọ onwe anyị mana anyị ga na-aza Naịjirịa
  • Anyị nye ndị gọvanọ steeti ebe ndị egburu maọbụ mebie ihe ndị ugwu ụbọchị iri atọ (30 days) ka ha kwụghachị ndị ugwu ahụ ego iti aka n'obi
  • Ọ bụrụ na ndị gọvanọ akwụghachighị ndị ugwu a egburu maọbụ mebie ihe ha na steeti ha, iwe ewekwala ha n'udiri mbọgwara anyị ga-eme

Anyị na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo nakwa ndị gọvanọ nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Akụkọ ka na-abịa