Food blockade: Ndị ugwu akwụsịla abụbụ ha gbara maka ibubata nri dịka gọọmentị kwetara ịkwụ ha ụgwọ

Yahaya Bello
Nkọwa foto, Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello nọchiri anya gọọmentị etiti n'ọgbakjọ ahụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu jikọrọ ndị na-ere ihe nri nakwa anụ na mpaghara Ugwu Naịjirịa akwụsịla abụbụ ọrụ (food blockade) ha gbara nke ha ji kwụsị ibubata ihe oriri nakwa anụ ehi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa.

Ha mere nke a dịka ha na gọọmentị etiti nwechara ọgbakọ n'Abuja n'ụbọchị Wenezde, ebe Gọvanọ Kogi Steeti bụ Yahaya Bello nọchịrị anya gọọmentị etiti.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Femi Fani-Kayode, onye bụbu Mịnịsta njem ụgbọelu na Naịjirịa, nọkwa n'ọgbakọ ahụ.

Ebe a na-ere anụ.
Nkọwa foto, Ọgbọ anụ tọgbọ chakoo n'Enugwu dịka ndị si mpaghara Ugwu ebute anụ gbara abụbụ ọrụ

Muhammad Tahir bụ onyeisi otu a kpọrọ 'Amalgamated Union of Foodstuff and Cattle Dealers of Nigeria' (AUFCDN) kwuru na ha kwụsịrị abụbụọrụ ha gbara n'ihi na gọọmentị ekwetala ịkwụ ha ụgwọ iti aka n'obi ma kwe nkwa ichekwa ndị otu ha.

Tahir kwuru sị: "Obi dị anyị bụ ndị otu ahịa nri mma, n'ihi na ihe niile anyị chọrọ gọọmentị emeela ya."

Ọgbọ ehi tọgbọ chakoo
Nkọwa foto, Onweghịkwa ihe dị n'ọgbọ ehi

"Gọvamọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello arịọla anyị n'aha gọọmentị etiti, ya mere anyị ji kwe ịkwụsị abụbụ ọrụ a taa (bụ Wenezde Maachị 3)."

"Gọọmentị kwetara ịkwụ anyị ụgwọ iti aka n'obi, ma wepụkwa ọtụtụ ụtụisi ha na-ana anyị, nke a ga-eme ka anyị na-azụ ahịa anyị nke ọma."

Ndị Ugwu na-ere mkpụrụ osisi ahụkwaghị ihe ha ga-ere
Nkọwa foto, Ndị Ugwu na-ere mkpụrụ osisi ahụkwaghị ihe ha ga-ere

Etu nkwụsị mbubata nri si metụta ala Igbo

Food Blockade: Ọnụ ego yabas arịakwala elu

Ebe foto si, ABS Radio Tv

Dịka azụmahịa ndị ugwu na Naịjirịa manyere nkwụsị orire nri si n'ala ha maka esemokwu dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụ ugbo, ndị mmadụ ebidola hụwa ụkọ ma mbuli ọnụahịa ọtụtụ nri di icheiche na mpaghara ala Igbo.

Soro anyị na njem ahịa dị icheiche na mpaghara ala Igb ka anyị gosi gị etu ọnụ ahịa ha sị dị

N'ahịa dị n'Ọka (Awka, Anambra steeti)

Nke a bụ Awka Flyover, Anambra steeti
Nkọwa foto, Ihe a bụ otu n'ime fly over dị n'Awka, Anambra steeti

N'Ọka dị n'Anambra steeti, ndị mmadụ na-azụ ahịa sị na ọnụ nri ndị esi ugwu Naijirịa arịala elu.

Onye ntaakụkọ ABS gara n'ahịa ahụ ịme nchọpụta n'ahịa Eke Awka bụ onye hụtara nke a.

O kwuru na ma ndị na-azụ ahịa ma ndị na-ere ahịa na-atamụ maka ọnụ ahịa ahụ.

Lee ihe ọ chọpụtara n'uju:

Food Blockade: ụko anụ n'Anambra

Ebe foto si, Abs

Anụ adịghịzi adị, nke ọnụ ahịa ndị a hụrụ gbaliri oke elu nke mere ka ndị mmadụ hapụ ịzụ azụ ya.

Food Blockade: Ọnụ ego tomato na ose arịala elu

Ebe foto si, ABS

Nkata tomato bubụ N3,000 bụzị N25,000

Nkata ose bụbu N4,000 bụzị N15,000

Ji

Ebe foto si, ABS

Ji bụbụ 600 bụzị 800 wdg.

Food Blockade: Otu mkpụrụ magoro bụzị N100 site N50 nmgbe mbụ

Ebe foto si, Getty Images

Mangoro bubu 50 bụzị 100 ugbua.

Cheta na ndị azụmahịa ugwu Naịjirịa manyere nkwụsị orire nri si n'ala ha maka esemokwu dị n'etiti ndị ọchiehi na ndị ọrụ ugbo.

Na Legọs steeti

Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Gbenga Omotosho agwaala ndị steeti ahụ ha atụla egwu maka ụkọ nri.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

O kwuru na n'agbanyeghị na gwongoworo bu nrị si ugwu abịa tọrọ n'ụzọ na nrị ga-adịrị ndị Legọs steeti niil.

O kwukwara na 'gọọmentị ma anya ihe na-aga ma kwuo na ha agaghị ekwe ya ghọrọ ọgbaghara.

Akụkọ si styeei ndị ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ka na-abịa...