Nnamdi Kanu news: Mazị Kanu abụghị onye obi okwute, ọ bụ mmegbu ndị Igbo mere o ji aba mba - Master Prophet

Nnamdi Kanu na Master Prophet.
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Master Prophet.

Master Prophet bụ onye na-akpọ onwe ya onyeamụma nakwa onye ndụ nke mmụọ maka ndị otu nnwereonwe Biafra.

Ọ bụkwa ọgọ nwoke Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị IPOB; ọ bụ ya bụ di Chinwe Kanu-Godwin, onye bụ nwanne nwaanyị Kanu.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Wenezde, Master Prophet kwuru na ọ ma Mazị Kanu dịka onye nwere obi ọma, nakwa onye ihe nwanne na-emetụ n'obi.

O kwuru sị: "Ọ bụrụ na gị na Mazi Nnamdi Kanu nọọ nso, ị ga-achọpụta na ọ bụ mmadụ nwere obi ọma."

"Ọ bụ onye ihe Chineke na-adị mma, ọ bụghị mmadụ na-achọ nsogbu."

"Ihe o ji dịka ọ na-aba mba oge niile na mgbasa ozi ya bụ n'ihi mwute ọ na-enwe maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

Master Prophet gara kwuru na nwunye ya bụ nwanne Nnamdi Kanu nwere mmetụta gbasara nnwuchi a gọọmentị Naịjirịa nwuchiri ya.

"E gosiri nwunye m ya bụ ihe otu izuụka tupu o mee," onye amụma ahụ kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya na-ekpe ekpere ma nwekwaa olileanya na ọgọ ya nwoke bụ Kanu ga-enwere onwe ya n'oge adịghị anya.

Gbasara ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia, ọ kachasị nke na-ekwu na ọ bụ nwaanyị ka Nnamdi Kanu chọgara na Kenya, Master Prophet kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ akaọrụ ndị asịrị.

"Ndị asịrị ga na-akọ ihe dị ha mma, mana nke ahụ agaghị eme ka eziokwu ghara ịpụta ihe."