Nnamdi Kanu news: Mazị Kanu abụghị onye obi okwute, ọ bụ mmegbu ndị Igbo mere o ji aba mba - Master Prophet

Master Prophet bụ onye na-akpọ onwe ya onyeamụma nakwa onye ndụ nke mmụọ maka ndị otu nnwereonwe Biafra.
Ọ bụkwa ọgọ nwoke Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi ndị IPOB; ọ bụ ya bụ di Chinwe Kanu-Godwin, onye bụ nwanne nwaanyị Kanu.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Wenezde, Master Prophet kwuru na ọ ma Mazị Kanu dịka onye nwere obi ọma, nakwa onye ihe nwanne na-emetụ n'obi.
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na gị na Mazi Nnamdi Kanu nọọ nso, ị ga-achọpụta na ọ bụ mmadụ nwere obi ọma."
"Ọ bụ onye ihe Chineke na-adị mma, ọ bụghị mmadụ na-achọ nsogbu."
"Ihe o ji dịka ọ na-aba mba oge niile na mgbasa ozi ya bụ n'ihi mwute ọ na-enwe maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa."
Master Prophet gara kwuru na nwunye ya bụ nwanne Nnamdi Kanu nwere mmetụta gbasara nnwuchi a gọọmentị Naịjirịa nwuchiri ya.
"E gosiri nwunye m ya bụ ihe otu izuụka tupu o mee," onye amụma ahụ kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya na-ekpe ekpere ma nwekwaa olileanya na ọgọ ya nwoke bụ Kanu ga-enwere onwe ya n'oge adịghị anya.
Gbasara ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia, ọ kachasị nke na-ekwu na ọ bụ nwaanyị ka Nnamdi Kanu chọgara na Kenya, Master Prophet kwuru na akụkọ ndị ahụ bụ akaọrụ ndị asịrị.
"Ndị asịrị ga na-akọ ihe dị ha mma, mana nke ahụ agaghị eme ka eziokwu ghara ịpụta ihe."















