Sheikh Gumi: Anyị ekwuola okwu gbasara nwaamadị a ugboro ugboro mana Buhari achọghị ịma - Ohaneze Ndigbo"

Ọnụ n'ekwuru Ohaneze Ndị Igbo bụ Maazị Alex Ogbonnaya akatọọla okwu dị icheiche ụkọchukwu ụka alakụba bụ Sheikh Ahmad Gumi na-ekwu gbasara ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob).
Ogbonnaya kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde, ebe ọ nọrọ kọwaa na ya bụ ihe gosiri ịkpa oke.
Ọ katọkwara etu gọọmentị etiti si eji aka ike eso ndị na-azọ nnwereonwe Biafra, ebe Sheikh Gumi na-arịọ ka a gbaghara ndị ekperima na-eyi ndụ egwu na mpaghara Ugwu.
O kwuru na ya bu omume na-egosi ikpe n'ezighi ezi n'okwu ikpe udo n'ala Naijiria.
Maazị Ogbonnaya tinyekwere ọnụ n'ọtụtụ okwu metụtara Gumi.
Lee ụfọdụ n'ime o kwuru ebe a:
- N'okwu Ipob na ESN
- N'okwu ndị ome egwu a na-akpọ 'bandits'
- N'okwu ndị Ipob na ndị agha Naijiria
- N'ịsa okwu Gumi kwuru
- Maka Agwa Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na-akpasi Gumi

Cheta na ndị agha Naịjirịa agbaala onye ndụ ndị ụka alakụba a ma ama bụ Sheikh Ahmad Gumi ụkwụ maka ọtụtụ ebubo o boro ha.
Gumi kwuru na ụfọdụ ndị agha Naijiria, na-adọnyere ndị omekome ukwu n'iyi ndị mmadụ egwu.
O kwuru nke a oge ya ndị ntaakụkọ Arise TV nwere mkparịtaụka n'ụbọchị Wenesde.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Onyema Nwachukwu katọrọ Gumi ma kwuo na ọ na-achọ itisa Naịjirịa.
"Ọrụ ndị agha bụ ọrụ dị oke mkpa dịka ha n'etinye ndụ ha n'ihu ọgụ n'agha," Nwachukwu kwuru.
"Ndị agha bụ ndị na-akwanyere onwe ha nakwa ndị ọzọ ugwu pụrụ ịche."
Nwachukwu kwetara na o nwere ike nwee ndị ọjọọ n'etiti otu ndị agha Naịjirịa, mana anya rụrụ ha ala inyochapụta ha ma taa ha ahụhụ kwesịrị ha.
Ugboro ugboro ka Sheikh Gumi gwarala ndị ntaakụkọ na gọọm̀entị Naịjirịa kwesịrị ịgbaghara ndị ekperima a kpọrọ 'bandits', ndị na-eyi ndị mmadụ egwu na mpaghara Ugwu Naịjirịa.
Gumi na-ekwu na ọ bụ n'ihi na gọọmentị anaghị akpachapụrụ ha anya mere ha ji buru egbe malite ịtọ ndị mmadụ.
Mana n'aka nke ọzọ, Gumi na-ekwu na otu ndị dịka IPOB bụ ndị gọọmentị kwesịrị ịmekpa ahụ n'ihi na ha na-egbu ndị Ugwu bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.













