Sit-at-home: A ka na-eme ya n'ala Igbo?

Ụfọdụ mmadụ ka na-erube isi n'iwu onye apụla ezi a ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere kemgbe gọọmentị Naịjirịa nwuchiri onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu na Kenya ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị 2021.
Lee foto ka o si aga ebe ụfọdụ n'ala Igbo.


N'Owerri ebe ụfọdụ nọ n'ụlọ ndị ọzọ na-azụ ahịa.


N'Umụahịa, ebe ụfọdụ na-agara onwe ha ndị ọzọ nọkwa n'ụlọ.

Asuu ga-ezuko maka ịnwe ọgbakọ pụrụiche na njikere nzukọ ha na gọọmentị etiti

Ebe foto si, Festus Kiyamo/Twitter
Ndị otu jikọrọ ndị nkuzi Mahadum bụ Academic Staff Union of Universities bụ Asuu n'aha ịchafụ ga-enwe ọgbakọ pụrụiche n'Abụja taa bụ Mọnde gbasara abụbụ ọrọ a ha nọ n'ime ya ụgbụa.
A tụrụ anya na ha na gọọmentị etiti ga-ezuta n'ime izuụka a gbasara ya bụ ọkwụ abụbụ ọrụ bụ nke ha nọ n'enụ ya ugbua.
N'izụ gara aga ka Asuu banyere abụbụọrụ ịdọaka na ntị otu ọnwa ka ha kulichara n'ọgbakọ abalị abụọ ha mere.
Asuu sị na ọnweghị ihe ọzọ ha ga-eme karịa ịgba ya bụ abụbụ ọrụ n'ihi ihe ha kpọrọ mkpọchị ntị gọomentị etiti gbasara ọdịmma ndị ọrụ na ụlọakwụkwọ.
Minista ndị ọrụ bụ Chris Ngige kwere ndị ọrụ a nkwa na ha ga-elebe anya na mkpa ndị niile n'ọgbakọ ha nwere na 14 Ọktọba 2021.
Akwụkwọ akụkọ Punch na-akọwa na ama gbaaara ha na ụfọdụ ndị ọrụ a awuchielarị n'Abuja maka ya bụ ọgbakọ dị mkpa ha na-akwado n'abalị ta bụ Mọnde.
Onyeisioche ndị Asuu bụ Prof. Emmanuel Osodeke kwuru na ya bụ abụbụ ọrụ na-abịa maka mkpochi ntị ndị gọọmentị etiti.
Ọ sị na, "Ọ bụ ọgbakọ ka ha kpọrọ anyị. Ha ga-agwa anyị ihe ha jiri maka ya kpọọ anyị mgbe oge ruru n'ime izuụka a".
Osodeke rịọrọ ndị ndị mmadụ ka ha rịọ gọọmentị ka ha mezuo ngwa ihe ha kwere ha.









