Ecowas: Gịnị ga-emezi ugbua Niger, Mali na Bukina Faso kwuru na ha ahapụla otu a?

Ndị ọchịagha na-achị mba Niger, Mali na Burkina Faso

Ebe foto si, bbc

Mba atọ gụnyere Niger, Mali na Burkina Faso ekwupụtala ọpụpụ ha site n'otu jikọtara mba Ndịda Afrịka bụ Economic Community of West Afrcian States (Ecowas).

Ndị ọchịagha na-achị mba ndịa mere mkebi ama kwupụta ya n'ihe onyonyo n'ụbọchị Sọnde 29 Jenụwarị 2024.

Mba ndị a kwuru na ihe mere ha jiri puo n’otu a bụ maka na Ecowas dara n'enyemaka ha tụrụanya n’aka ha n’ihe gbasara nchekwa obodo nakwa ọgụ mmegide ndị oyinduegwu (terrorism).

‘’Ka afọ iri anọ na itoolu gachara, oke mba Mali, Niger na Burkina Faso ji obi mgbawa chọpụta na otu 'Ecowas' a hapụla ihe ndị nnanna anyị jiri hiwe ya nakwa mmuo ịchọ ọ dị mma mba Afrịka (Pan Africanism)." dịka ọnụ na-ekwuru ndịagha mba Niger bụ Abdramane si kwuo.

Cheta na otu Ecowas machiri mba ndị a nwa obere oge dịka ndịagha wechaara ọchịchị n’ike na mba ndị a.

Ecowas gwara ndịagha Niger ka ha were ọchịchị nyefe n'aka ndị nkịtị mana ha jụrụ ajụ, ha gwara 'Ecowas' na ha ga-achị afọ atọ tupu ha enyeghachị nkịtị ọchịchị, mana Ecowas jụrụ ajụ.

Na nsonso a, Burkina Faso na Rọshịa nwere mkparịtaụka n’ime onwe ha, nke gosiri na mba abụọ ahụ amalitela mmekọrịta.

Ka nke a mechara, Rọshịa meghere ụlọọru ha dị na Burkina Faso ha mechirị kamgbe ọtụtụ afọ gara aga.

Ọpụpụ mba atọ ndị a pụrụ alaala mbọ 'Ecowas' na-agba ịjị hụụ na ndị nkịtị weghara ọchịchị na mba ndị a n'iyi.

Niger, Mali na Burkina Faso ka so n'otu anyị - Ecowas

N’ozi ha wepụtara, Ecowas kwuru na ha anatabeghi ozi site n’aka mba ndị a banyere mkpebi ha isi n’otu ha pụọ.

“Ndị ndu otu anyị na-agbasi mbọ ike ịhụ na e weghachịrị ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ndị a.

“Mali, Niger na Burkina Faso ka bụ ndị otu Ecowas dị oke mkpa, anyị na-anwa ike anyị ịhụ na e weghachịrị udo na mba ndị a.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Kedụ ihe ọ pụtara ịgbahapụ otu Ecowas?

Niger, Mali na Bukina Faso ahapụla otu ‘ECOWAS’

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Niger, Mali na Bukina Faso ahapụla otu ‘ECOWAS’

Tolu Ogunlesi bụbu onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa kọwara ihe ọ pụtara mba so n’otu Ecowas ịgbahapụ otu a.

Ọ kọwarana ihe ọ pụtara bụ na mba Mali Niger na Burkina Faso agaghị enwetezi oke niile ruuru ha gụnyere akwụkwọ njirimaara Ecowas ga-enye ha ohere ịbanye mba ndị nọ n’Ecowas.

O kwuru na ebe ihe jiri dị njọ bụ ala ụkpọrọ gbara mba ndị a gburu gburu nke pụtara na ha ekepụla onwe ha iche.

O kwuru na nke a abụghị mbụ mba so n’Ecowas ga-apụ n’otu ahụ, mba Mauritania hapụrụ Ecowas n’ọnwa Disemba 2020.

O kwuru na ha lọghachịrị azụ n’afọ 2019 ka ha na mba Ecowas nwee nkwekọrịta banyere azụmaahịa nakwa ime njem.