Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ

Akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ọnwa Febuwarị afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Ghana emeela iwu ga-etụ ndị LGBTQ nga

    LGBTQ Flag

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ụlọomeiwu mba Gana emeela iwu ga-eme ka akparamagwa nwoke idina nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị idina nwaanyị ibe ya bụ ihe megidere iwu na mba ahụ.

    Iwu ahụ a kpọrọ 'proper human sezual rights and family values bills' bụ nke no n'ime ụoomeiwu ahụ kamgbe afọ 2021.

    N'ime iwu ahụ, o kwuru na onye ọbụla sonyere n'ụdị akparamagwa ahụ na mba ahụ ga-aga nga.

    Onye ọbụla kwadoro ha ma gbasaozi banyere ihe ha na-eme ga-agakwa nga nke ya.

    Ndị omeiwu ahụ nabatara atụmatụ na ndụmọdụ site n'aka ndị ụkọchukwu, ndị odịnala ana ndị na-alụ ọgụ ikike na ugwu dịịrị onye mana agbanyeghi ntụnye ha, ndị ụfọdu na-eche na iwu ga-eme emekpa ụfọdụ ndị na mba ahụ.

    Mana otu onye omeiwu soro kwado iwu ahụ aha ya bụ Sam George kwuru na iwu ahụ 'ga-alụ ọgụ megide mmetọ na ihe arụ nke ụdị mmekorịta ahụ buru bata na mba ha.'

    O kwuru na 'nwoke idina nwoke abụghụ ikike na ugwu dịịrị onye, ọ bụ mmasị mmadụ banyere etu onye chọrọ isi nwee mmekọ'.

    Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ikike na ugwu dịịri onye na-eche na iwu a ga-arụnye ụfọdụ ndị mmadụ aka n'anya.

  2. Ọrịa Meningitis egbuola ụmụ akwụkwọ 17 na Yobe steeti

    Ogwu mgbochi

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ ahụike ekwuola na ọrịa Meningitis egbuola ụmụ akwụkwọ 17 n'ime ụlọ akwụkwọ ise dị na Yobe steeti.

    Komishona agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Mohammed Sani-Idris gwara BBC na ụfọdụ ndị nwụrụ ka nọ n'ụlọ akwụkwọ pramarị ebe ndị ọzọ nọ na Sekondri.

    Dịka o si kwuo, ọ sị na e nwere mmadụ 473 a ka na-enyocha maka ya bụ ọrịa nke mkpomọkụ na-akwalite.

    N'ọnwa Jenụwarị afọ a ka ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe bụ NCDC dọrọ aka na ntị na-agwa ndị mmadụ na ikpokọ ọtụtụ mmadụ n'ime ụlọ nakwa enweghị ikuku nwereike ikpalite mfesa ọrịa a n'oge mkpomọkụ.

    Gịnị bụ Meningitis?

    Dịka ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO si kwuo, Meningitis bụ ọrịa na-eme ka ụbụrụ na ọkpụkpụ azụ mmadụ malite ịcha ọkụ maka nje na-awakpo ebe ahụ.

    Ya bụ nje bụkwa nke na-adị n'ime ọnụ mmiri, ọsụsọ nakwa mmiri ahụ mmadụ ndị ọzọ.

    Ihe ndị ha kwuru na-eme ka ọrịa ahụ fesaa gụnyere:

    - Ị mị mmadụ ọnụ

    - Ị nọ nso n'akụkụ onye bụ ya bụ ọrịa

    - Mmadụ ị kwasa gị ụkwara maọbụ izesa gị uzere bụ ihe ọzọ ha rụtụrụ aka.

  3. Ndị uweojii anwụchiela ụfọdụ ndị e boro ebubo igbu Sly Onyima

    Sly Onyima bu nke egburu egbu

    Ebe foto si, Sly Onyima/Facebook

    Ndị uweojii Anambra Steeti anwụchiela mmadụ anọ echere na aka ha dị n'ogbugbu onye ndu obodo Umuoji bụ Sly Onyima.

    N'ozi nke Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii binyere aka, ọ sị na ndị ahụ e jidere ji ekwentị nakwa caadị ụlọakụ nke Onyima.

    Komishona ndị uweojii na steeti ahụ bụ Aderemi Adeoye kelere ndị otu ya n'Ogidi nakwa ndị nche ime obodo maka etu njikọ aka ha si mita mkpụrụ ịnwụchi mmadụ anọ ahụ.

    O nyekwara iwu ka anwụchie mmadụ anọ ọzọ ndị ejichiri kpọrọ aha iji chọpụta ihe mere ha ji kpaa mkpamkpa a.

    Cheta na ndị omekome bu egbe wakporo ụlọ Sly Onyima bụ PG obodo Umuoji n'abalị ụbọchị Fraide gara aga ma gbagbuo ya.

    Tupu ọ nwụọ, Onyima bụ onye ndu ọhụrụ a họpụtara n'ọkwa ahụ.

  4. Gịnị bụ 'Oronsaye Report' onyeisiala Tinubu nyere iwu ka e mezuo ozugbo?

    Onyeisiala Bola Tinubu na ndị otu na-ahụ maka akụnaụba obodo ekpebiela ụbọchị Mọnde ka a malite imezu ihe dị na nchọpụta nke Stephen Oronsaye mere. Nchọpụta Oronsaye kwuru ka e kpochapụ ụfọdụ ngalaba gọọmentị ma jikọọ ụfọdụ iji belata ego gọọmentị na-emefu n'ọchịchị.

    N'afọ iri na abụọ gara aga, gọọmentị etiti nyere Stephen Oronsaye ikike ka ha mee nyocha etu a ga-esi hazigharịa gọọmentị ma belata ego.

    Oronsaye nyere gọọmentị akwụkwọ ọcha nchọpụta ya n'afọ abụọ gara aga mana gọọmentị Buhari ebinyeghi ya aka.

    Etu ọ dị ugbua, onyeisiala Tinubu ekwuola ka e soro ihe nchọpụta ahụ kwuru.

    Stephen Orosoanya

    Ebe foto si, Bayo Onanuga

    Etu gọọmentị chọrọ ịhazigharị ngalaba dị icheiche

    - Ụlọọrụ National Salaries, Income and wages Commissionga-anọzi n'ime ụlọọrụ Revenue Mobilisation and Fiscal Commission. Ụlọomeiwu ga-emegharị iwu ga-etinye nke ahụ.

    - A ga-ekpoko ụlọọrụ Infrastructure Concession and Regulatory Commission na ụlọọrụ Bureau of Public Enterprise ma gụgharịa ya aha ka ọ bụrụzie `Public Enterprises and Infrastructural Concession Commission.

    - Ụlọọrụ National Human Rights Commission ga-elozi ụlọọrụ Public Complaints Commission.

    - A ga-ekpochapụ ụlọọrụ Pension Transitional Arrangement Directorate(PTAD) ma ghara ọrụ ha nye n'aka ụlọọrụ mịnịstrị na-ahụ maka ego Federal Ministry of Finance.

    - Ụlọọrụ NEMA na National Commission for Refugees ga-abịakọọnụ bụrụzie National Emergency and Refugee Management Commission.

    - Ụlọọrụ Border Communities Development Agency ga-abụzị ngalaba n'okpuru ụlọọrụ National Boundary Commission.

    - NACA na NCDC ga-abịakọ ọnụ.

    - Ụlọọrụ SERVICOM ga-abụzi ngalaba n'okpuru Bureau for Public Service Reform (BPSR)

    - Ụlọọrụ NALDAga-alọghachi azụ n'okpuru mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ ugbo na nchekwa nri bụ Ministry of Agriculture and Food Security.

    - Ụlọọrụ mịnịstrị nke sayensi ga na-elokotazi ngalaba ọhụrụ ga-ejikọ NCAM, NASENI na PRODA.

    - Ụlọọrụ National Commission for Museums and Monuments na National Gallery of Arts ga-abịakọ ọnụ, a ga-akpọ ha National Commission for Museums, Monuments and Gallery of Arts.

    - A ga-ekpokokwa ụlọọrụ National Theatre na National Troupe.

    - Ụlọọrụ mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ ga na-elekọtazi ụlọọrụ directorate of Technical Cooperation in Africa and Directorate of Technical Aid Corp,

    - Ụlọọrụ Diaspora Commission ga-abụzi otu ngalaba n'okpuru mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi.

    - Ụlọọrụ Federal Radio Corporation na Voice of Nigeria ga-abụzi otu a ga-akpọ Federal Broadcasting Corporation of Nigeria

    - Ụlọọrụ National Biotechnology Development Agency(NABDA) na National Centre for Genetic Resources and Biotechnologyga-abụ otu a na-akpọ National Biotechnology Research and Development Agency(NBRDA).

    - Ụlọọrụ National Institute for Leather Science Technology na National Institute for Chemical Technology ga-abụ otu.

    - Nigeria Natural Medicine Development Agency na National Institute of Pharmaceutical Research na Development ga-abụ otu ngalaba.

    - The National Metallurgical Development Centre na National Metallurgical Training Institute ga-abịakọ ọnụ.

    - National Institute for Trypanosomiasis ga-abanye n'okpuru Institute of Veterinary Research in Vom, Jos. wdgz.

    Dịka onye nkwuchiteọnụ onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga siri kwuo, "a ga-ekpochapụ ọtụtụ ngalaba gọọmentị ebe a ga-ekkpoko ọtụtụ".

  5. Ụmụ Gaza jisiri ike na-achọrọ ezinaụlọ ha nri ka ha dị ndụ

    Mohammed Zo'rab gụnyere n'ime puku kwuru puku ụmụ bu na Gaza bụrụla ndị na-azọtara ezinaụlọ nri kwa ụbọchị.
    Nkọwa foto, Mohammed Zo'rab gụnyere n'ime puku kwuru puku ụmụ bu na Gaza bụrụla ndị na-azọtara ezinaụlọ nri kwa ụbọchị.

    N'ebe ụfọdụ, n'oge ụfọdụ ịdị ndụ n'anaya nwata nwoke bụ ihe o ji etu ọnụ - ọ fọzie ịpụ gaa ebe ọ ga-achọta nri ga-ezu ezinaụlọ ya ma dowe ha ndụ.

    Kwa ụtụtụ, Mohammed Zo'rab, dị afọ 11, na-apụ gaa ndịda obodo Gaza bụ obodo Rafah maka otu ihe.

    Ọ na-ewe otu efere dị mbara gaa ụlọakwụkwọ yaha megharịrị bụrụ ụlọ gbatagbata ebe ndị gbara ọsọ ndụ agha na Gaza ni ka ha chọta ihe ha nwereike iri maọbụ chọtara ihe ụmụ ha nwerike iri.

    Mohammed na-agakwa n'ụlọ ọgwụ ebe a na-akpọga ndị merụrụ ahụ kwa mgbe, ya gaa ebe ọzọ o nwerike izute ihe izendụ.

    "M buru nri a gaghachi ebe ezinaụlọ m zoro, onye ọbụla na-enwe aṅụrị," o kwuru.

    "Mgbe ụfọdụ, o nweghị ihe m ji aga, ọ na-eme m obi mwute."

  6. Unu na-eso anyị unu emela aṅaa?

  7. Kedụ ndị tozuru ịnata ego N75,000 gọọmentị chọrọ inye ndị mmadụ?

    Tinubu na nri

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọomentị Naịjirịa ewepụtala usoro ga-etozu ndị mmadụ isonye na ndị ga-erite ego ruru N75,000 gọomentị etiti chọrọ inye ezinaụlọ ụmụ Naịjirịa ruru mmadụ N15nde maka ọtanisi na-eme n'obodo. Ha na-eme nke a n'atụmatụ a kpọrọ 'Social investment Programme'.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na ya ahazichala ihe iji malitegharịkwa inye ego ahụ a na-esite n'ụlọakụ eke ndị kachasị nọrọ n'ụbịa na Naịjirịa dịka ndị Naịjirịa na-eti mkpu na ihe esika.

    Tupu ha akwụsị ike ego ahụ n'ọnwa ole na ole gara aga, ụmụ Naịjirịa ruru nde atọ na-anatabu ego ahụ mana dịka ego nri malitere na-arị elu, gọọmentị kwuru na ha ga-etinyekwu ọnụọgụgụ ndị na-enweta ya ka ha ruo mmadụ nde 15.

    Mịnịsịta na-ahụ maka ego na akụnaụba obodo bụ Wale Edun kwuru na ndị ga-anata ego ahụ ga-enweriri ihe ndị:

    1. National Identity Number (NIN): Nke a bụ akara njirimara onye ọbụla na Naịjirịa

    2. Biometric Verification Number (BVN): Nke a bụ akara azụmahịa onye ọbụla bụ nke a na-eny n'ụlọakụ.

    3. Ekwenti: Onye ọbụla ga-esonye n'atụmatụ a ga-enweriri ekwenti.

    O kwuru na nke a bụ iji hụ na ego ahụ na-eru ndị o kwesiri iru na-enweghi nrụrụaka ọbụla dị na ya.

    Edun kwuru na ha ga-enye ndị mmadụ ihe ruru puku N75,000 n'ọnwa atọ nke ga-apụta na ha ga-enweta N25,000 kwa ọnwa ruo ọnwa atọ.

    N'okwu ya; " Nke ahụ ga-abụ N25,ooo kwa ọnwa nye ezinaụlọ nde 15 nwere ihe ruru mmadụ ise n'ime ya. Nke a ga-eme na a ga-azụ mmadụ nde75".

    Ọzọ dịka ibe ya bụ, mịnịsịta ahụ kọwara na gọọmentị chọkwara inye ndị ọrụaka, ndị ntoroọbịa, ndị na-azụ ahịa, ụmụnwaanyị na ndị na-azụ obere ahịa puke naịra ise ha agaghị akwụghachi akwughachi.

    Mana na nke a, a ga-eji igwe dijitaal nyocha ndị mmadụ ga-eru mmadị 1000 n'ime ọkpụrụ ọchịchị 774 niile dị na Naịjirịa nke a ga-abụ ego ruru ijeri naịra 50 ọzọkwa iji nyere ndị mmadụ aka.

    Maazi Edun kwuru na nke a bụ ụzọ dị laarị iji nyere ndị mmadụ aka ugbua.

  8. ECOWAS ewepula ụfọdụ mmachi ha tinyere n’isi mba Niger, Mali na Guinea

    Otu jikọtara mba dị na Ọdịda Anyanwụ Afrịka

    Ebe foto si, ECOWAS/Twitter

    Otu Economic Community of West African States (ECOWAS) ewepụla ụfọdụ mmachị ha machiri mba ndị dịka Niger Republic, Mali na Guinea.

    Ha mere mkpebi a n’ọgbakọ pụrụiche ha mere maka udo, ndọrọ ndọrọ nakwa nchekwa na mpaghara Ndida Anyanwụ mba Afrịka n’Abuja n’ụbọchị Satọde.

    Otu a kpebiri na ụfọdụ mmachi metụtara ndọrọ ndọrọ dị n’isi mba Niger Republic ka-adị ire, mana o wepụrụ ụfọdụ mmachi ego na akụnaụba dị n’isi mba Guinea nakwa ụfọdụ mmachi dị n’isi mba Mali.

    Cheta na ECOWAS tinyere mmachi n’isi mba Niger Republic maka etu ndịagha si were ọchịchị n’ike ma chutuo onyeisiala ha bụ Mohamed Bazoum n’ụbọchị 26 Julaị, 2023.

    Ndị ndu otu ECOWAS

    Ebe foto si, ECOWAS/Twitter

    Onyendu otu a bụ Omar Alieu Touray mgba ọ na-agụpụta mkpebi ha kwuru na ha wepuru mmachi ndị a n’isi mba Niger Republic n’ihi “obi ebere n’ebe ndị mmadụ nọ” iji belata ahụhụ ha na-ata.

    Ndịagha na-achị mba atọ ndị nọ mpaghara ọzara Sahel, tinyere Guinea nwere ohere isonye n’ọgbakọ otu a na-eme banyere ndọrọ ndọro ọchịchị nakwa nchekwa.

    Ecowas gara n’ihu kpọọ oku ka a tọhapụ Onyeisiala Mohamed Bazoum a chụpụrụ achụpụ ma gwa mba anọ ndị a ka ha gosi atụmatụ oge ha ga-eji enyefe ọchịchị n’aka ndị nkịtị.

  9. Ihe mere mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala ekweghi egosi n’ịtanetị - Inec

    Igwe Bvas e ji eme ntuliaka na Naịjirịa

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission bụ Inec akọwaala ihe mere mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’afọ 2023 egosighi n’ịntanetị mgbe ahụ a na-eme dịka ha kwere na kwa.

    Na-agbanyeghi na igwe ntuliaka a kpọrọ Bimodal Voter Accreditation System (BVAS) rụrụ ọrụ ya ọfụma n’inyocha ndị bịara ịtụ vootu mana itinyezi mpụtara ya n’ịntanetị bụ ebe ọ kụrụ afọ n’ala.

    Dịka ọ fọrọ ụbọchị ole ma ole ka o ruo otu afọ e mere ntuliaka ahụ, ụlọọrụ Inec wepụtara akwụkwọ ozi kọwara etu ntuliaka niile si gaa.

    N’ime akwụkwọ, Inec kwuru na mpụtara ntuliaka ndị ụloomeiwu banyere n’ịtanetị na-enweghi nsogbu ọbụla kama na nke onyeisiala jụrụ ịga ma wepụta ozi dịka “HTTP server error response”.

    Ha kwuru na mechara mezie ihe mgbochi ahụ nke mere mpụtara ntuliaka onyeisiala mbụ banyere n’ịntaneti n’elekere 8.55 nke abalị n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023.

    Inec kwuru na ọgbatauhie ahụ bụ ihe dapụtara maka etu akụrụngwa igwe ntuliaka ahụ si dị bụ nke ha kwuru raara ahụ ịtụ anya ma gbochie ya.

    Mana ha kwusiri ike na ọgbatauhie ahụ emetụtaghị nkwụwa aka ọtọ nke ntuliaka ọkwa onyeisiala ahụ.

    Ha kwuru na nchịkọta, na ntuliaka afọ 2023 niile ahụ gara ọfụma, na-enweghi nsogbu ọgbaghara ọbụla na Naịjirịa.

  10. Ndị ojiegbe egbuola Sly Onyima bụ onye ndu obodo Umuojii

    Sylvester Onyima bụ onye e gburu be ya

    Ebe foto si, Onyima Sly/Facebook

    Ndị obodo Umuoji dị n'okpuruọchịchị Idemili North dị n'Anambra steeti nọ n'ụfụ na mwute dịka ndị ojiegbe gburu otu onye ndu obodo ha akpọrọ Sly Onyima be ya.

    Akụkọ kwuru na ndị omekome ahụ ruru mmadụ 15 wakporo be ya na mgbede ụbọchị Fraịde ma jiri egbe gbagbuo ya.

    Otu onye hụrụ ebe ihe mere gwara ụlọntaakụkọ Punch na ndị ahụ kpuchiri ihu ha mgbe ha wakporo be Onyima.

    Ọ sịkwa "Onyima banyere ọkwa ahụ (President General) ọhụrụ, ọ haziela naanị otu ntuliaka e merela n'obodo anyị"

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC n'ekwentị na e gburu nwoke ahụ n'ezie.

    Ọ sị "Anyị bụ ndị uweojii ebugala ozu nwoke ahụ n'ụlọ njụoyi nke ozu".

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ezigala ndị uweojii n'obodo ahụ ịchọpụta ihe mere dịka nyocha malitere n'okwu ọnwụ Onyima a ma dịka 'Sly'.

    Ndị Umuoji nọ na soshal midia nakwa ụfọdụ ndị enyi nwoke ahụ amalitela igosi mwute ha n'elu soshal midia.

    Otu onye dere sị "ihe ọjọọ metụtara Umuojii! eberela naanị Sly akwa, beere obodo Umuoji akwa"

  11. Ataala ụmụnwaanyị 100 ahụhụ maka izipu ụmụ ha ịrịọ arịrịọ

    Aka obere nwa gosiri etu e si arịọ arịrịọ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu ụlọikpe na mba Yuganda amaala ụmụnwaanyị ruru 100 ikpe maka izipu ụmụ obere nwa ha ịrịọ arịrịọ n'isi obodo mba ahụ bụ Kampala.

    Ahụhụ enyere ha dịka amachara ha ikpe bụ iji ha rụọrụ gọọmentị ọrụ n'ime obodo n'efu.

    Amachikwara ụmụnwaanyị ahụ ịlaghachite n'isiobodo mba ahụ kama ha laa na mpaghara ebe ha si bụ Napak dị n'ugwu Yuganda.

    Ụmụ nwaanyị ahụ rịọrọ mgbaghara ma kwuo na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị di ha nwụrụ na ndi na-azụlite ụmụaka naanị ha dịka ụlọntaakụkọ mba ahụ bụ Vision Newspaper si kwuo.

    Ọkaikpe na-ahazi ikpe ha bụ Edgar Karakire kwuru na o geela ha ntị ma kwuo na ịtụ ha nga agaghị amịta mkpụrụ kama na ọ "ga-ata ha ahụhụ iji mee ka ha gharị ịnwa ya bụ ihe ọzọ" ka ụlọ ntakụkọ Daily Monitor si na o kwuru.

    Iji ụmụaka arịọ arịrịọ maọbụ idupu ha arịrịọ megidere iwu mba ahụ nke bu ahụhụ ịga ụlọ mkpọrọ ọnwa isii.

    A nwụchiri ụmụnwaanyị ahụ mgbe a na-achụsasị ndị na-arịọ arịrịọ juru n'isi obodo Kampala dị ka a na-akwado mmemme mba na mba dị ịcheiche ebe ahụ.

    A kpọrọla ụmụaka ahụ kpọga na Masulita Children's Village dị n'etiti Yuganda bụ ọdọ ụmụaka azọpụtara azọpụta.

  12. Labour Party ahọpụtala Olumide Akpata ka ọ zọọ ọkwa Gọvanọ n’Edo Steeti

    Olumide Akpata bụbu onyeisi otu jikọtara ndị ọkaiwu na Naịjirịa

    Ebe foto si, Olumide Akpata/Facebook

    Otu Labour Party ahọpụtala Olumide Akpata dịka onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ ọkwa Gọvanọ n’Edo Steeti n’ọnwa Sepụtemba afọ 2024.

    Akpata bụbu onyeisi otu jikọtara ndị okaiwu na Naịjirịa (NBA) nwetere vootu 316 iji merie na ntuliaka ihe ụlọ ha mere na Benin n’ụbọchị Fraịde.

    Osote Gọvanọ Abia Steeti bụ Ikechukwu Emetu, onye rụrụ ọrụ dịka onyeisi nhazi ntuliaka ahụ kpọpụtara aha Akpata dịka ntuliaka ime ụlọ ha bịara na njedebe.

    Na nnabata mmeri ahụ, Akpata kwanyeere Rotimi Akeredolu bụbu gọvanọ Ondo Steeti nwụrụ ukwu ikpeazụ ma kelee ndị nkwado ya maka ịhọpụta ya.

    Mmeri a na-abịa dịka Akpata nọọrọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2023 kwupụta ebumnobi iji aha Labour Party azọ ọkwa Gọvanọ Edo Steeti.

    O kwuru n’ebe uche ya nọ bụ inye ụmụafọ Edo Steeti ọchịchị ziri ezi ma o merie na ntuliaka na-abịa n’ọnwa Sepụtemba.

    Akpata gbara arụkwaghịm n’ọrụ ya dịka ọkaiwu n’ọnwa Ọgọọstụ afọ 2023 iji banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

  13. Etu e si kwaa ozu Kelvin Kiptum nwafọ mba Kenya bụ ọkaibe n'ọsọ ike agwụ nwamkpị

    Akwamozu Kelvin Kiptum

    Ebe foto si, Reuters

    Akwa na anya mmiri jupụtara ụmụafọ mba Kenya ọnụ na anya n’emume akwamozu Kelvin Kiptum bụ ọkaibe n’ọsọ ume agwụ nwamkpị nwụrụ anwụ.

    Nwunye ya bụ Asenath Rotich butere ụzọ dịka ọtụtụ ndị ọzọ na-eru uju sochiri ya azụ n’oge akwamozu a.

    Nwada a bere nnukwu akwa mgbe ọ gbara ama na ya di ya bụ Kiptum chọrọ ime emume agbamakwụkwọ ha n’ụzọ pụrụiche n’ọnwa Eprelụ.

    Ha gbara akwụkwọ n’ụzọ omenala n’afọ 2017.

    Mana Kiptum dị afọ iri abụọ na anọ nwụrụ n’izu gara aga site n’ihe mberede okporoụzọ ya na onye nchịkọta ya.

    Ọtụtụ ndị a ma ama bịara emume akwamozu ya

    Ebe foto si, Reuters

    Nwamadị a mere ihe tụrụ ụwa n’anya mgbe o tuuru ugo n’ọsọ ike agwụ nwamkpị.

    ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu bịara akwamozu ya nke gụnyere Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto, onyeisi ndị egwuregwu athletics n’ụwa bụ Sebastian Coe.

    Ndị ọgba ọsọ ibe ya bịakwa emume akwamozu ahụ dịka mba Kenya bụ ndị a ma ama n’egwuregwu ọsọ.

    E mere akwamozu ya n’ọgbọ ngosi dị n’obodo Chepkorio, ebe Kiptum na-eme ọzụzụ ya na mpaghara ọdịda anyanwụ Kenya.

    A ga-eli ozu ya na mgbede ụbọchị Fraide 23 Febụwarị 2024.

  14. Ọkụ gbara n'ụlọ obibi dị na Valencia, mba Spen egbuola mmadụ anọ

    A ka na-achọ mmadụ iri na ise achọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nnukwu ọkụ ọgbụgba agbariela ụlọ abụọ nọkọrọ ọnụ dị n’obodo Valencia nke mba Spen ma gbuo mmadụ anọ merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

    Ndị ọrụ gọọmentị kwuru na a ka na-achọ ihe karịrị mmadụ iri na ise n’ụlọ ebe ndị ahụ ọkụ gbara.

    Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ụdịrị akụrụngwa ndị e jiri rụọ ụlọ ndị a nyere aka mee ka ọkụ ahụ ree ma banye n’ụlọ ndị ọzọ.

    Praịm minista mba Spen bụ Pedro Sanchez agaala njem mgbaru na Valencia ebe ọkụ a gbara ma tie ndị o metụtara aka n’obi.

    O kwuru na ya na onyeisi obodo Valencia na-akpa nkata iji maara ka a ga-esi nyere ndị a aka.

    Mmadụ anọ nwụrụ n'ọkụ ọgbụgba a

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ kwuru na ụmụ ndị dị n’agbata afọ atọ nakwa ụbọchị iri na ise so na ndị a na-achọ achọ.

    Di na nwunye na ụmụaka ha abụọ bi n’otu n’ime ụlọ ndị a ọkụ gbara ka na-efu efu rute mgbe akụkọ a pụtara.

    Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-agba mbọ ịba n’ime ụlọ ndị a mana okpomọkụ si na ya dị ukwuu na-agbanyeghi na ha agbanyụọ ọtụtụ ọkụ ahụ.

    N’otu aka ahụ ha gbakwara mbọ zọpụta ụfọdụ ndị bi n’ime ụlọ ndị a nakwa ọtụtụ ndị merụrụ ahụ

  15. Nnamdi Kanu, ahụhụ na ihe ndị ọzọ ndị ọchịchị Igbo kpebiri na nzụkọ ha

    Nnamdi Kanu nakwa ndị ichie

    Ebe foto si, BBC/Getty images

    Ndị isi na ndị ọchịchị n’akụkụ niile nke ndị Igbo gbakọtara ọnụ gbaa izu n’ụbọchị Tuusde.

    Ọgbakọ a nke gụnyere otu Ohaneze Ndigbo, ndị isi ahụrụ kwaba okpu n'azụmahịa na ọrụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị omeiwu ochie na ndị nọ n'ọkwa ugbua, ndị Igwe na Eze obodo dị icheiche wdg.

    He mere mkpebi gbasara ọtụtụ ihe na-emetụta ndị Igbo ebe ọbụla ha nọ na mba ụwa niile nke ahụhụ na ọnọdụ ihe isi ike nke Naịjirịa ji bụrụ okwu akpụ n'ọnụ.

    Nke a pụtara n'ozi nke odeakwụkwọ otu Ohaneze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia binyere aka.

    Lee ha n'uju ebe a:

    - Ndị ọchịchị ndị Igbo kelere onyeisioche Ohaneze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu maka ozi o zisara na-agawa ndị Igbo niile ha esonyela na ngagharịiwe ọbụla maka ijide ha aka jiri ha chụọ aja ndọrọndọrọ ọchịchị.

    - Ha kwuru na oku niile ndị Igbo nwere agba na-akpọ ka atọghapụ Nnamdi Kanu iji mee ka akwụsị ọnọdụ 'Sit-at-Home' n'ọwụwaanyanwụ bụkwa nke o nweghi onye ṅara ntị na ya dịka ewezugara ya n'akụkụ ka "nsogbu Igbo"

    - Ha gwara ndị Igbo ha kee nkwụcha ma gbado anya ọ kachasị n'oge ihe isi ike a maka na Igbo agafebuola oge ahụhụ mgbe gara aga ma si na ya pụta. A dọkwara ndị Igbo niile aka na ntị sị "onye aghana nwanne ya".

    - Ha kpọrọ ndị Gọvanọ, ndị isioche okpuruọchịchị, ndị Eze na Igwe obodo dị icheiche ha jikọọ aka mee ka oge ịkọ nri na ịkụ mkpụrụ na-abịa baara ndị Igbo uru ka ha nwee ike kọta nri ha na ezinaụlọ ha na agbataobi ha ga-erinwu.

  16. Onyendu Yoruba Nation bụ Sunday Igboho awụchiela Naịjirịa

    Sunday Igboho

    Sunday Adeyemo e ji Sunday Igboho maara bụ onyendu otu chọrọ nwereonwe ndị Yoruba a kpọrọ Yoruba Nationa alọta na Naịjirịa.

    Ọnụ na-ekwuru nwamadị a bụ Olayomi Koiki kwupụtara nke a n’akara soshal midia X ya ma sị na Igboho lọtara ka ọ bịa lie nne ya nwụrụ anwụ.

    Kamgbe afọ atọ ka Igboho hapụrụ Naịjirịa gbaa ọsọ mgbe ndị uweojii nzuzo bụ DSS wakporo ụlọ ya dị na mpaghara Shoka Ibadan nke Oyo Steeti.

    Koiki n’ihe ahụ o dere kwuru “n’ezie ya Sunday Igboho awụchiela na Naịjirịa maka olili ozu nne ya bụ S.A Adeyammo.

    “E bu ozu nne ya si n’ụlọozu dị na Saki bata n’awa ole ma ole gara aga.

    Cheta n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị afọ 2021 ka ndị ọrụ nchekwa DSS wakporo ụlọ Igboho, gbuo mmadụ abụọ ma buru mmadụ iri na atọ gawa n’ụlọọrụ ha dị n’Abuja.

    Ha mebiri ọtụtụ ihe dị n’ụlọ ahụ dịka ụgbọala gbachara ọkụ ebe ọbara jupụtara n’ala niile.

    DSS boro Igboho ebubu izo ngwa agha dị iche iche bụ nke ha sị na ọ chọrọ iji amalite ọgụ megide ọchịchị Naịjirịa.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  17. A maala Dani Alves ikpe maka idina nwaanyị n'ike n’ụlọ nkwari

    Dani Alves gbabuuru Barcelona bọọlụ

    Ebe foto si, Reuters

    Otu ụlọikpe dị na Spain amaala Dani Alves gbabuuru Barcelona bọọlụ ikpe maka idina otu nwaanyị n’ike n’ụlọ nkwari dị n’obodo Barcelona.

    A mara ya ikpe ma tụọ ya nga afọ anọ na ụma.

    Nwamadị a dị afọ iri anọ ma bụrụ otu n’ime ndị kachasị mabute iko n’asọmpi bọọlụ gọrọ na aka ya adịghị n’ebubo idina nwaanyị a n’ike n’isi ụtụtụ 31 Disemba 2022.

    Ọkaiwu ya gwara ụlọikpe ka a tọhapụ ya ma kwuo na ọ gbagha mpụtara ikpe a mara ya.

    Mana ọkaiwu nwaanyị ahụ nabatara mkpebi a ma kwuo na “nke a gosiri ihe doro anyị na mbụ: nke bụ eziokwu dịka onye o metụtara si kọwaa nakwa ahụhụ ndị ọ tarala”.

    Na mgbakwụnye afọ anọ a tụrụ Alves nga, ụlọikpe a sị na ọ ga-anọkwu afọ ise maka nwalee agwa ya.

    Ndị boro ya ebubo gwara ya ụlọikpe ka a tụọ ya nga afọ itoolu. Na mba Spain, ntaramahụhụ dị n’ebubo idina mmadụ n’ike na bụ kaarị mkpọrọ afọ anọ ruo afọ iri na ise.

    Ndị ntaakụkọ kwuru na ụlọikpe lebara anya na nkwa Alves kwere n’ịkwụ otu puku narị paụnds na puku iri abụọ na asatọ (£128,500) na-agbanyeghi ihe ga-abụ mpụtara ikpe ahụ.

    Mana ụlọikpe jụrụ ịnabata arịrịọ ọkaiwu ya rịọrọ nke sị ka e belata oge mkpọrọ ya maka na o ji anya mmanya kpaa agwa ahụ.

    Nwunye ya bụ Joana Sanz dị afọ iri atọ na otu kwuru na di ya nọ na-eme ka onye ṅụrụ mmanya mgbe ọ lọtara n’ụlọ ha dị na Barcelona n’ụbọchị ihe ahụ mere.

    Mana ụlọikpe kwuru na ogogo mmanya ọ ṅụrụ emetụtaghị agwa ọ kpara n’abalị ahụ.

    Ọkaikpe kwuru na Alves na enyi zụtaara ụmụnwaanyị atọ mmanya Champagne, tupu ha raara otu n’ime ha banye n’ime ime ụlọ nkwari ahụ nke nwaanyị amaghị maka ya.

    Ọ bụ n’oge ahụ ka ha nwere nrụrịtaụka n’etiti ha dịka nke nwaanyị na-achọghị ka Alves dinaa ya mana o mechara mee nke ahụ.

  18. Ndị uweojii atọhapụla Onyeisioche Labour Party ha nwuchiri n'Edo Steeti

    Julius Abure

    Ndị uweojii ngalaba Zone 5 atọhapụla Onyeisioche Labour Party bụ Julius Abure bụ onye ha nwuchiri n’ụbọchị Wenezde.

    Onụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Tijani Momoh gwara ndị ntaakụkọ na a tọhapụrụ Abure n’elekere abụọ nke isi ụtụtụ Tọzde.

    N’otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru Labour Party bụ Obiorah Ifoh, kwuru na ọ bụ eziokwu na a tọhapụla onyeisi ha na mmadụ anọ ndị ọzo.

    A mabeghi kpọmkwem ihe Abure na ndị uweojii kpara n’ụlọọrụ ha mana a kpụụrụ ya ka ọ gaa zara ọnụ ya maka ebubo ndị e boro ya na mmadụ anọ.

    Ebubo ndị a gụnyere;

    Atụmatụ igbu mmadụ, ibu ngwa egbe nakwa mpụ ndị ọzọ.

  19. Ihe butere mwepu Hope Uzodimma dịka onyeisi achụmnta vootu APC n'Edo steeti

    Hope Uzodimma na ogbo ya nke Cross River steeti nọchiri anya ya

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook.

    Otu ndọrọndọrọ nọ n'ọchịchị bụ APC ewepụla Hope Uzodimma bụ Gọvanọ Imo steeti dịka onyeisioche kọmịtị ntuliaka nke Edo steeti.

    Nke a bịara dịka enwere nghọtahie na esemokwu dịka ha mechara ntuliaka imeụlọ onye ga-anọchị anya otu ha na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Edo steeti n'abịa n'ọnwa Sepụtemba afọ a.

    Sulaiman Argungu bụ odeeakwụkwọ nhazi nke APC kwuru nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Wenzde ma kwuo na Bassey Otu bụ Gọvanọ Cross Rivers ga-anọchị anya ya.

    Dịka ozi Argungu si kwuo, Otu bụzi onye ga-ahazigharị ntuliaka imeụlọ otu ahụ taa bụ ụbọchị 22 nke ọnwa Febụwarị.

    Gịnị butere okwu?

    Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/Facebook

    Nsogbu malitere mgbe Uzodimma kpọpụtara aha Dennis Idahosa dịka onye meriri ntuliaka imeụlọ ahụ e mere n'ụbọchị 17 nke ọnwa Febụwarị.

    Uzodimma sịkwa na Idahosa ji vootu 40,483 merie ya bụ ntuliaka imeụlọ.

    Mana ndị mkpọpụta ọnụọgụgụ vootu kpọpụtara aha Sunday Dekeri dịka onye meriri ya bụ ntuliaka.

    Dịka ọnụ na-ekwuru ndị mkpọpụta bụ Ojo Babatunde si kwuo, ọ sị na Dekeri ji vootu 25,384 were meri ya bụ ntuliaka.

    Ọzọ kwa bụ na onye mkpọpụta ọzọ bụ Stanley Ugboaja kpọpụtara Monday Okpebholo dịka onye meriri ntuliaka ahụ.

    Ọ bụ ihe ndị a mere ka otu APC mee nzụkọ gbatagbata, gbanwee kọmịtị ntuliaka ma kpọpụta ụbọchị ọzọ maka ntuliaka imeụlọ ha n'Edo steeti.

  20. A nwụchiela otu Bishop ụlọụka Katọlik maka ebubo mmetọ ụmụaka na idina n'ike

    Foto gosiri onye yi uwe ụlọụka Katọlik

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii na mba Australia anwụchiela otu Bishop aha ya bụ Christopher Saunders maka ebubo mmetọ ụmụaka na idina mmadụ n'ike.

    Nke a bịara dịka emechra nyocha nke onyeisi ụlọụka Katọlik bụ Poe Francis nakwa ndị uweoji mere.

    BBC ghọtara na Saunders dị afọ 74 kwuru na ọ gaghị aza n'aka ya dị na ya ma akpụpụ ya ụlọikpe.

    Akụkọ a dị mkpa n'ihi na Saunders bụ onye ụkọchukwu Katọlik kachasị n'ọkwa a ga-ebo ụdịrị ebubo a.