A tụrụ ogbunigwe n'Izombe, Imo steeti ụnyaahụ?

Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-akọwa na ndị ojiegbe tụrụ ogbunigwe n'ahịa dị n'Ogboroafor, Izombe, n'okpuruọchịchị Ugwuta dị n'Imo steeti, n'ụbọchị Mọnde, 20 nke ọnwa Juun afọ 2022.
Akụkọ ahụ kwuru na ha tụrụ ogbunigwe iji yie ndị mmadụ egwu ka ha ghara ịpụta ezi, n'ihi iwu nọrọ n'ụlọ ndị Ipob tinyere ma mechaa kagbuo.
Mana ọ bụ eziokwu?
BBC mere nchọpụta ma hụ na ọ bụghị ogbunigwe ka a tụrụ n'ahịa ahụ.
Ndị hụrụ ka ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ọ bụ ndị ojiegbe chụturu ndị njem nọ n'ụgbọala ma mụnye ụgbọala ahụ si Izombe aga Ogbaku ọkụ, iji yie ndị mmadụ egwu ka ha nọrọ n'ụlọ.
Ha kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbara egbe aghara aghara n'ikuku iji chụsasịa ndị ahịa nọ ebe ahụ.
James Ike, bụ otu onyeisi obodo ahụ, kwuru na enweghi onye e tiri ihe, onweghịkwanụ onye nwụrụ na ya bụ ihe.
O kwukwara na ọ bụghị eziokwu na a gbara ogbunigwe n'ahịa ahụ.
Oge BBC kpọrọ Michael Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti, o kwuru na akụkọ ogbunigwe abụghị eziokwu.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii ga-ewepụta akwụkwọ ozi banyere ihe a merenụ n'oge adịghị anya.










