Gun Salute: Ihe ọghọm dị n'ịgbali egbe elu n'ebe a na-eme emume

Ebe foto si, Getty Images
'A sị na ihe ọbụla lara elu ga lọtarịrị n'ala', etu a ka ọ dị mgbọ egbe a gbaliri elu.
Ọtụtụ mgbe ndị ọrụ nchekwa na ndị ọzọ na-adị agbalikarị egbe elu n'obi aṅụrị karịsịa ebe a na-eme emume.
Ụdị agwa a ebutele ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ dịka mgbọ egbe a gbaliri elu tụrụ ha.
Otu n'ime ndị nwụrụla a na-eche na ọ bụ n'ihi ịgbali egbe elu a bụ Ndubuisi Emenike, bụ onye pati All Progressives Congress (APC) n'Imo Steeti.
Ọ nwụrụ site na mgbe tụrụ ya oge otu onye ọrụ nchekwa gbaliri egbe elu dịka ha na-aṅụ ọṅụ na mmeri nwada Princess Miriam Onuoha meriri na ntuliaka.
N'ihi nke a, ka anyị lebanya n'ọghọm ndị dị n'ịgbali egbe elu.
Kedụ ihe na-eme ma a gbalie egbe elu?

Ebe foto si, Getty Images
Otu onye ọkachamara n'ihe banyere egbe na mgbọ bụ David Dyson sị na mgbọ egbe a gbaliri elu na a ga ogogo dị anya.
Mana a naghị ama ebe ọ ga-ada, ohere dị na o nwereike ibute mmerụ ahụ maọbụ ọnwụ.
Nyocha kwuru na agbanyeghi na ọsọ mgbọ egbe ji ada n'ala dị nta karịa nke o ji gbalie elu mana o nwereike ibute ọnwụ.
N'ihi nke a ọtụtụ obodo dị n'ụwa dịka Califonịa, Texas, Arizona amachiela ndị mmadụ ịgbali egbe elu.
Ihe mere ndị mmadụ ji agbali egbe elu

Ebe foto si, BanksPhotos
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Orlando Ikeokwu sị dịka omenala ndị si dị na a na-ahụta ya dịka nkwanye ugwu.
Na ọ bụ mkpọnala ka a na-agbakarị mana ugbua ndị mmadụ malitere ịgbali egbe elu karịsịa ndị ọrụ nchekwa.
O kwuru na nke a adịghị mma na o nwereike igbu mmadụ na ọ bụ imefu ngwa agha e kwesịrị iji rụọ ọrụ.
Orlando si n'agbanyeghi na o nweghi iwu machiri ịgbali egbe elu na Naịjirịa mana e nwere ike ịkpọpụ mmadụ ụlọikpe maka ime ụzụ na ihe ndị ọzọ.









