Gun manufacturer: Aka akparala nwoke na-arụpụta egbe na-eresi ndị omekome n'Enugu

Gun

Ebe foto si, STEFAN HEUNIS

Ndị uweojii n'Enugwu Steeti akọọrọla BBC Igbo otu ha sị nwụchie Cyprain Eze, nwoke kụrụ ngwọrọ nke ha na-ebo ebubo ịrụpụta egbe ma na-eresi ndị otu nzuzo na ndị abalịdịegwu.

Ebere Amarizu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu, kwuru na ha ga-akpụpụ nwoke ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.

Dịka Amarizu sị depụta n'akwụkwọ ozi ya, a nwụchịrị Eze n'ụbọchị Monde mgbe ndị uweojii gara maara usisi wee ruo ebe o bi.

Ngwa ọgụ a natara ya gụnyere: otu egbe ọnụ abụọ, egbe anọ e bere ebe, egbe ọnụ mkpụmkpụ isii, mgbọegbe iri agbabeghi agba, mgbọegbe iri na atọ agbarala agba, na akụrụngwa ndị ọzọ e ji arụpụta egbe.

Mgbọegbe
Nkọwa foto, Mgbọegbe agbarala agba

Amarizu gara n'ihu kwuo na Eze sara asịsa na ya na-eresị ọtụtụ ndị otu nzuzo egbe.

Otu n'ime ha bụ Ugochukwu Ogba, 28 years, onyeisi ndị otu nzuzo a kpọrọ "Black Axe" bụ onye wetara egbe ya ka Eze rụziere ya.

Amarizu kwukwara na ohere gọọmentị etiti nyere maka ndị mmadụ iweghachite egbe ha agafeela, ya mere na a ga-anwụchị onye ọbụla a hụrụ egbe n'aka ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee nwaafọ Igbo zọtara ọkwa ọchịchị ugboro atọ na Belgium