Ebuka Obi, Junior Pope, Obi Cubana, AnyiDons na akụkọ ndị ọzọ BBC Igbo mere wuru ewu n'afọ 2024

Ebe foto si, Screenshot
N'afọ 2024, BBC News Igbo mere ọtụtụ akụkọ ndị wuru ewu metụtara ọtụtụ ezinaụlọ n'ala Igbo nakwa mpaghara dị icheiche n'ụwa niile.
Akụkọ ndị ahụ gụnyere ajụjụ ọnụ, ihe ọdachị nakwa ihe nkụzi dị icheiche.
Ọtụtụ n'ime akụkọ ndị ahụ bm̄m̄ụ ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ma gbasaa na soshal midịa maka na igwe mmadụ kesara ya n'akara ha.
Ngwa bịa hụrụ akụkọ ndị ahụ n'uju:
Ọnwụ Jnr Pope na ndi ọzọ wutere ndị mmadụ, o wuruewu karịa otu izu

Ebe foto si, Junior Pope/Instagram
Jnr Pope nwụrụ mgbe ọ na-eme njem n'elu mmiri River Niger aga ebe ha na-eme ihe onyonyoo n'Asaba, Delta steeti.
Ha nwere ihe mberede n'elu osimiri oge ụgbọmmiri bu ha na ndị ọzọ kwakọtara isi.
Soshal midịa nwuuru ọkụ maka akụkọ na-efegharị n'oge ahụ; ọtụtụ sị na Jnr Pope anwụọla ebe ndị nke ọzọ sị na ọ dị ndụ, mana BBC Igbo chọpụtara nke bụ eziokwu.
Ihe mere m jiri buru ngwaahịa m site n'ala Igbo gawa Legọs - Cubana Chiefpriest

Ebe foto si, Cubana Chiefpriest
Na mkparịtaụka ahụ anyị wepụtara n'ọnwa Juun, afọ 2024, Cubana Chiefpriest kọwara ihe mere o ji hapụ ala Igbo gaa mepee ụlọahịa ya na Legọs steeti.
Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ Cubana Chiefpriest gwara BBC Igbo bụ etu nsogbu n'ọnọdụ nchekwa dị n'obodo Ọlụ na Ọsụ dị n'Imo steeti ji mee ka o bugharịa ụlọahịa ya.
Na mkparịtaụka ahụ, o kwuru na ọnọdụ nchekwa ọjọọ achụọla ndị mmadụ ọsọ n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ma mee ka ha kwụsị ịla ụlọ.
Akụkọ a dịka ọ kpalitere okwu maka ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo.
Ụfọdụ ndị mmadụ wee bido katọwa ya ebe ndị ọzọ aja ya maka ikwu nke bụ eziokwu, n'ihi na a ma na Cubana Chiefpriest na Gọọmenti Imo steeti n'oge o kwuru okwu a, dị na mma.
Akụkọ AnyiDons nke BBC Igbo mere so n'akụkọ ọzọ wuru ewu

Ebe foto si, BBC/Anyidons Instagram
Anyidons mere ncheta afọ iri kemgbe ọ bidoro iti egwu highlife.
Ọ kọwara etu njem egwu highlife ya si bido nakwa ebe ọ nọ ugbu a.
Anyidons gwara anyị ihe mere e ji akpọ ya 'Onye Ịchaka', etu Obi Cubana siri gbanwee ndụ ya nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
AnyịDon bụ onye ndị ntorobịa hụrụ anya nke ukwuu.
Ụmụnwoke hụrụ akụkọ 'Andropause' anya nke ukwuu, mana kedụ ihe kpatara ya?

Ebe foto si, Getty Images
BBC wepụtara akụkọ a n'ọnwa Juun 2024.
Akụkọ ahụ kọwara na andropause bụ ihe na-apụta ihe n'ahụ nwoke ebe ọ ga-eru oge ọ gaghị atụlị nwaanyị ime ọzọ.
Dọkịta Rasheed Abbasi onye bụ dọkịta ahụike ụmụnwoke kọwara na njirimara Andropause gụnyere ike ọgwụgwụ, inwe nnukwu afọ, ihe e ji bụrụ nwoke anaghị akwụ ọtọ, obi nkoropu, ọrịa shuga, obi ịkwusi ịrụ ọrụ, enweghị ike ịtụ nwaanyị ime na ihe ndị ọzọ.
Ọ sị ọrịa na-emekarị mgbe nwoke ruru afọ iri ise (50) bụ oge nwoke na-enwe mbelata na mmepụta testosterone.
Mkparịtaụka Ebuka Obi na BBC nke izizi fegharịrị n'ikuku soshịal midịa nke ukwuu

Obi kwuru na o nweghị onye ọbụla ga-ahụ nwoke n'anya karịa nne ya.
O kwuru sị na nwunye mmadụ agaghị emere ya ihe nne ya ga-emere ya.
O tinyekwara ọnụ n'ihe banyere nwoke maọbụ nwaanyị idina ụdịdị ya ma sị na ọ na-ewute ya nke ukwuu.
Ọ jụrụ sị "Ị hụtụla ebe oke nkịta na-edina ibe ya, maọbụ ebe mkpi na-edina ibe ya? Ihe ndị ahụ bụ arụ," ka o kwuru.
E nwekwara akụkọ ndị ọzọ BBC Igbo mere n'afọ 2024 ndị mmadụ kachasị gụọ, mana ndị a anyị gụpụtara bụ nke a kachasị kesaa ma bụrụ nke ndị mmadụ jiri mere nnukwu okwu.
Ọtụtụ n'ime ha ma masịrị ụmụnwaanyị na ụmụntoroọbịa.
Ụmụnwaanyị kachasị hụ akụkọ ndị a n'anya
Akụkọ gbasara Junior Pope n'afọ 2024 gbalitere n'etiti ụmụnwaanyị na-agụ akụkọ BBC Igbo. Nke sonyere ya nsonso abụrụ akụkọ Mr Ibu.
N'afọ 2024, ụmụnwaanyị gụkarịrị akụkọ ndị a n'ime ọtụtụ akụkọ BBC Igbo dere:
- Akụkọ nwaada Igbo na-eji ihe ịkpa ọchị achọ ego; Ginikachukwu Uwayah, ya bụ akụkọ chịtakarịrị akara ụmụnwaanyị.
- Nke sonyere ya wee bụrụ akụkọ nwaada Nneka Nnanna jiri aka ya kuziere onwe ya asụsụ Korean ma na-eji yua arụ ọrụ nakwa ikuziri ndị mmadụ










